1 Ihe E Mere 13:1-14

13  Devid na ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha, tinyere onye ọ bụla bụ́ onye ndú, wee nwee nnọkọ;+  Devid wee gwa ọgbakọ Izrel dum, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, dịkwa Jehova bụ́ Chineke anyị mma, ka anyị zigara ụmụnne anyị fọdụrụ n’ala Izrel dum ozi,+ zigakwara ndị nchụàjà+ na ndị Livaị ozi+ n’obodo ha dị iche iche+ nakwa n’ala ịta ahịhịa ha, ka ha bịakwute anyị.  Ka anyị bute igbe+ Chineke anyị n’ebe anyị nọ.” N’ihi na ha elekọtaghị ya n’ụbọchị Sọl.+  Ọgbakọ ahụ dum wee kwuo ka e mee otú ahụ, n’ihi na ihe ahụ dị mma n’anya mmadụ niile.+  Devid wee kpọkọta+ Izrel dum malite n’osimiri Ijipt+ ruo n’ebe e si abanye Hemat,+ ka e wee si na Kiriat-jierim+ bute igbe ezi Chineke.+  Devid na Izrel dum wee gbagoo Beala ruo Kiriat-jierim, nke Juda, iji si n’ebe ahụ bugote igbe ezi Chineke, bụ́ Jehova, onye nọ ọdụ n’elu cherọb,+ bụ́ nke a kpọkwasịrị aha ya.  Otú ọ dị, ha ji ụgbọala ọhụrụ+ si n’ụlọ Abinadab buru igbe ezi Chineke, Ọza na Ahayo+ nọkwa na-eduzi ụgbọala ahụ.  Devid na Izrel dum ji ike ha dum, jirikwa abụ+ na une+ na ụbọ akwara+ na obere ịgbà+ na ájà na opi,+ na-enwe aṅụrị+ n’ihu ezi Chineke.  Ha wee bịaruo ebe nzọcha mkpụrụ nke Kaịdọn,+ Ọza wee matịa aka jide Igbe ahụ,+ n’ihi na ọ fọrọ nke nta ka ehi ndị ahụ mee ka ọ daa. 10  Jehova wee weso Ọza iwe dị ọkụ wee gbuo ya n’ihi na ọ matịrị aka jide Igbe ahụ,+ o wee nwụọ n’ebe ahụ n’ihu Chineke.+ 11  Devid wee wee iwe+ maka na Jehova wesoro Ọza oké iwe; e wee kpọwa ebe ahụ Pirez-Ọza ruo taa. 12  Egwu ezi Chineke wee jide Devid n’ụbọchị ahụ,+ o wee sị: “Olee otú m ga-esi bute igbe ezi Chineke n’ebe m bi?”+ 13  Devid ebugaghịkwa Igbe ahụ n’ebe o bi n’Obodo Devid, kama o bugara ya n’ụlọ Obed-idọm+ onye Gat. 14  Igbe ezi Chineke wee dịrị n’ezinụlọ Obed-idọm, n’ụlọ ya,+ ruo ọnwa atọ; Jehova wee na-agọzi+ ezinụlọ Obed-idọm na ihe niile o nwere.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji