2 Ndị Eze 12:1-21

12  N’afọ nke asaa nke ọchịchị Jihu,+ Jehoash+ ghọrọ eze, ọ chịkwara afọ iri anọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Zibia onye Bia-shiba.  Jehoash wee na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova n’ụbọchị niile Jehoyada onye nchụàjà nọ na-ezi ya ihe.+  Ọ bụ naanị na e bibighị ebe ndị dị elu.+ Ndị mmadụ ka nọ na-achụ àjà ma na-esure ihe nsure ọkụ n’ebe ndị dị elu.  Jehoash wee sị ndị nchụàjà:+ “Ego niile bụ́ maka àjà dị nsọ+ nke a na-ewebata n’ụlọ Jehova,+ ego onye ọ bụla kwesịrị ịkwụ,+ ego ruuru mkpụrụ obi ọ bụla ịkwụ,+ ego niile metụrụ onye nke ọ bụla n’obi iweta n’ụlọ Jehova,+  ka onye ọ bụla n’ime ndị nchụàjà nata ya onye ọ maara;+ ka ha rụziekwa ebe ndị gbawara agbawa n’ụlọ ahụ, n’ebe ọ bụla a hụrụ ebe gbawara agbawa.”+  O wee ruo n’afọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị Eze Jehoash, ndị nchụàjà arụzibeghị ebe ndị gbawara agbawa n’ụlọ ahụ.+  Eze Jehoash wee kpọọ Jehoyada+ onye nchụàjà na ndị nchụàjà, sị ha: “Gịnị mere unu adịghị arụzi ebe ndị gbawara agbawa n’ụlọ ahụ? Unu anatazila ndị unu na ha ma ego, kama nyenụ ya maka ebe ndị gbawara agbawa n’ụlọ ahụ.”+  Ndị nchụàjà wee kwere na ha agakwaghị anata ndị mmadụ ego nakwa na ha agaghị arụzi ebe ndị gbawara agbawa n’ụlọ ahụ.  Jehoyada onye nchụàjà wee were otu igbe+ ma kpọpuo okwuchi ya ma dọba ya n’akụkụ ebe ịchụàjà n’aka nri ma mmadụ na-abata n’ụlọ Jehova, n’ebe ahụ ka ndị nchụàjà na ndị nche ọnụ ụzọ+ na-etinye ego niile+ a na-ewebata n’ụlọ Jehova. 10  O wee ruo na ozugbo ha hụrụ na ego dị ukwuu dị n’igbe ahụ, odeakwụkwọ+ eze na nnukwu onye nchụàjà na-abịa, ha na-ekekọta ego a hụrụ n’ụlọ Jehova ma gụọ ya.+ 11  Ha na-enyefe ego ahụ a gụrụ agụ n’aka ndị na-arụ ọrụ+ ahụ bụ́ ndị a họpụtara maka ụlọ Jehova. Ndị ahụ na-eji ya kwụọ ndị na-arụ ọrụ osisi na ndị na-ewu ihe owuwu bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ Jehova ụgwọ, 12  tinyere ndị na-edo nkume na ndị na-awa nkume,+ ha na-ejikwa ya azụ osisi na nkume a wara awa maka ịrụzi ebe ndị gbawara agbawa n’ụlọ Jehova nakwa maka ihe niile e mefuru iji rụzie ụlọ ahụ. 13  Ọ bụ naanị na e jighị ego ahụ a na-eweta n’ụlọ Jehova mee efere ọlaọcha, ihe e ji emenyụ ọkụ,+ ọkwá,+ opi,+ ụdị arịa ọlaedo ọ bụla na arịa ọlaọcha dị n’ụlọ Jehova.+ 14  n’ihi na ọ bụ ndị na-arụ ọrụ ahụ ka ha na-enye ya, ọ bụkwa ya ka ha ji na-arụzi ụlọ Jehova.+ 15  Ha adịghịkwa agwa ndị ikom ahụ ha na-enye ego ka ha nye ndị na-arụ ọrụ+ ahụ ka ha meere ha mpịazi,+ n’ihi na ha ji ikwesị ntụkwasị obi+ na-arụ ọrụ. 16  Ma ego a na-enye maka àjà ikpe ọmụma+ na ego a na-enye maka àjà mmehie, a dịghị ewebata ya n’ụlọ Jehova. O wee bụrụ nke ndị nchụàjà.+ 17  Ọ bụ mgbe ahụ ka Hazel+ eze Siria gbagoro buso Gat agha+ ma weghara ya, e mesịa, Hazel chere ihu+ ịgbago buso Jeruselem agha.+ 18  Jehoash eze Juda wee were onyinye niile dị nsọ,+ bụ́ ndị Jehọshafat na Jehoram na Ehazaya bụ́ ndị nna nna ya, bụ́ ndị eze Juda, doro nsọ na onyinye dị nsọ o nyere nakwa ọlaedo niile dị n’ebe a na-edebe akụ̀ n’ụlọ Jehova na n’ụlọ eze, zigara+ Hazel bụ́ eze Siria. O wee hapụ ibuso Jeruselem agha. 19  Ma ihe ndị ọzọ metụtara Jehoash na ihe niile o mere, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Juda? 20  Otú ọ dị, ndị na-ejere ya ozi+ biliri wee jikọta aka gbaa izu+ wee gbuo Jehoash n’ụlọ+ Milo,*+ n’ụzọ gbadara Sila. 21  Ọ bụ Jozaka nwa Shimeat nakwa Jehọzabad+ nwa Shoma, bụ́ ndị na-ejere ya ozi, gburu ya. Ha wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid; Amazaya+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mkputamkpu ala.”