2 Ndị Eze 21:1-26
21 Manase+ gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri ise na ise na Jeruselem. Aha nne ya bụ Hefziba.
2 O wee mee ihe jọrọ njọ n’anya Jehova,+ dị ka ihe arụ nke mba+ ndị ahụ Jehova chụpụrụ n’ihu ụmụ Izrel si dị.
3 O wee wughachi ebe ndị dị elu Hezekaya nna ya bibiri,+ o wukwaara Bel ebe ịchụàjà ma mee ogwe osisi dị nsọ, dị nnọọ ka Ehab+ eze Izrel mere. O wee malite ịkpọrọ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe+ isiala,+ na-efekwa ha ofufe.+
4 O wukwara ebe ịchụàjà dị iche iche n’ụlọ Jehova,+ bụ́ ụlọ Jehova kwuru banyere ya, sị: “Ọ bụ na Jeruselem ka m ga-eme ka aha m dịrị.”+
5 O wukwaara ìgwè ihe niile dị n’eluigwe ebe ịchụàjà dị iche iche+ n’ogige abụọ ndị dị n’ụlọ Jehova.+
6 O surekwara* nwa ya n’ọkụ.+ O mekwara anwansi,+ chọọ ihe mgbaàmà ọdịnihu, kwekwa ka ndị na-agba afa+ na ndị ọrụ ha bụ ịkọ ọdịnihu+ nọrọ. O mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova nke ukwuu iji kpasuo ya iwe.
7 O debekwara ihe oyiyi a pịrị apị+ nke ogwe osisi dị nsọ o mere n’ụlọ ahụ+ Jehova gwara Devid, gwakwa Sọlọmọn nwa ya banyere ya, sị: “Ọ bụ n’ụlọ a nakwa na Jeruselem, bụ́ ebe m họọrọ n’etiti ebo niile nke Izrel, ka m ga-eme ka aha m dịrị ruo mgbe a na-akaghị aka.+
8 Agaghịkwa m eme ọzọ ka ụkwụ Izrel si n’ala m nyere ndị nna nna ha wagharịa,+ ma ọ bụrụhaala na ha elezie anya mee ihe niile m nyere ha n’iwu,+ bụ́ iwu dum ohu m Mozis nyere ha.”
9 Ma ha egeghị ntị,+ kama Manase nọ na-arafu ha ime ihe ọjọọ+ karịa mba+ ndị ahụ Jehova lara n’iyi n’ihu ụmụ Izrel.
10 Jehova wee na-ekwu okwu site n’ọnụ ndị ohu ya bụ́ ndị amụma,+ sị:
11 “Ebe ọ bụ na Manase+ eze Juda emewo ihe arụ+ ndị a, o mewo ihe ọjọọ karịa ihe niile ndị Amọraịt+ mere, bụ́ ndị biri n’ebe ahụ tupu ya onwe ya, o wee jiri arụsị ya ndị na-asọ oyi ka nsị mee ka ọbụna Juda mehie.+
12 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka ọdachi dakwasị Jeruselem+ na Juda, nke ọ ga-abụ, onye ọ bụla nụrụ ya, ntị ya abụọ ga-azụ wuruwuru.+
13 M ga-esetịkwa n’ahụ́ Jeruselem eriri e ji atụ̀ ihe,+ bụ́ nke e ji tụọ Sameria,+ nakwa ihe e ji atụ̀ ihe iji mata ma ihe ọ dị larịị, bụ́ nke e ji tụọ ụlọ Ehab;+ m ga-ehichakwa+ Jeruselem dị nnọọ ka mmadụ si ehicha ọkwá, hichaa ya ma kpuo ya ihu.+
14 M ga-agbahapụkwa ndị fọdụrụ+ n’ihe nketa m+ ma nyefee ha n’aka ndị iro ha, ha ga-aghọkwara nnọọ ndị iro ha niile ihe mbukọrọ na ihe nkwakọrọ.+
15 n’ihi na ha mere ihe jọrọ njọ n’anya m ma na-akpasu m iwe malite n’ụbọchị ndị nna nna ha si n’Ijipt pụta ruo taa.’”+
16 Manase wụfukwara ọbara na-emeghị ihe ọjọọ+ n’ebe ọ dị nnọọ ukwuu, ruo mgbe o mere ka Jeruselem ju n’ọnụ malite n’otu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, n’agụnyeghị mmehie ya nke o ji mee ka Juda mehie site n’ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+
17 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Manase na ihe niile o mere na mmehie o mere, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Juda?
18 N’ikpeazụ, Manase sooro nna nna ya hà dinaa,+ e wee lie ya n’ubi dị n’ụlọ ya, n’ubi Ọza;+ Emọn nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.
19 Emọn+ gbara afọ iri abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ abụọ+ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Meshọlemet ada Herọz bụ́ onye Jọtba.
20 O wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, dị nnọọ ka Manase nna ya mere.+
21 O wee na-eje ije n’ụzọ niile nna ya jere,+ o wee na-efe arụsị na-asọ oyi ka nsị,+ bụ́ ndị nna ya fere, ọ nọkwa na-akpọrọ ha isiala.
22 O wee si otú ahụ hapụ Jehova+ bụ́ Chineke nna nna ya hà, o jeghịkwa ije n’ụzọ Jehova.+
23 N’ikpeazụ, ndị na-ejere Emọn ozi gbaara ya izu wee gbuo eze+ n’ụlọ ya.
24 Ma ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbaara Eze Emọn izu.+ Ndị ala ahụ wee mee Josaya+ nwa ya eze n’ọnọdụ ya.
25 Ma ihe ndị ọzọ metụtara Emọn, ihe o mere, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Juda?
26 Ha wee lie ya n’ili ya dị n’ubi Ọza;+ Josaya+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mekwara ka nwa ya gabiga n’ọkụ.”