2 Ndị Eze 22:1-20

22  Josaya gbara afọ asatọ+ mgbe ọ malitere ịchị, ọ chịkwara afọ iri atọ na otu na Jeruselem. Aha nne ya bụ Jedaịda ada Adaya bụ́ onye Bọzkat.  O wee mee ihe ziri ezi n’anya Jehova,+ jeekwa ije n’ụzọ dum Devid bụ́ nna nna ya jere,+ ọ hapụghị ya gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.+  O wee ruo n’afọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Eze Josaya na eze ziri Shefan,+ nwa Azalaya nwa Meshọlam bụ́ odeakwụkwọ, ka ọ gaa n’ụlọ Jehova, ọ sịrị ya:  “Gakwuru Hilkaya+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà,+ ka o dokọta ego+ a na-eweta n’ụlọ Jehova,+ nke ndị nche ọnụ ụzọ+ nakọtara ndị mmadụ;  ka ha nyefeekwa ya ndị na-arụ ọrụ+ ahụ n’ụlọ Jehova, bụ́ ndị a họpụtara ahọpụta, ka ha wee nye ya ndị ahụ na-arụ ọrụ ahụ, bụ́ ndị nọ n’ụlọ Jehova, ka ha rụzie ebe ndị gbawara agbawa n’ụlọ ahụ,+  nyekwa ya ndị omenkà na ndị na-ewu ụlọ na ndị na-edo nkume, ka e jirikwa ya zụọ osisi na nkume a wara awa a ga-eji rụzie ụlọ ahụ.+  Naanị na ọ gaghị adị mkpa ka ndị ahụ a na-enye ego ahụ mee mpịazi maka ego ha ji,+ n’ihi na ha ji ikwesị ntụkwasị obi+ na-arụ ọrụ.”  E mesịa, Hilkaya+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà gwara Shefan+ bụ́ odeakwụkwọ,+ sị: “Ahụrụ m akwụkwọ iwu+ a n’ụlọ Jehova.” Hilkaya wee nye Shefan akwụkwọ ahụ, o wee malite ịgụ ya.  Shefan bụ́ odeakwụkwọ wee bịakwute eze ma gwa eze, sị: “Ndị na-ejere gị ozi awụpụtawo ego dị n’ụlọ ahụ, ha na-enye ya ndị na-arụ ọrụ ahụ n’ụlọ Jehova, bụ́ ndị a họpụtara ahọpụta.”+ 10  Shefan bụ́ odeakwụkwọ wee gaa n’ihu ịkọrọ eze, sị: “E nwere akwụkwọ+ Hilkaya onye nchụàjà nyere m.” Shefan wee malite ịgụ ya n’ihu eze. 11  O wee ruo na ngwa ngwa eze nụrụ ihe e kwuru n’akwụkwọ iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya ozugbo.+ 12  Eze wee nye Hilkaya onye nchụàjà na Ahaịkam+ nwa Shefan na Akbọ nwa Mịkaya na Shefan bụ́ odeakwụkwọ nakwa Asaya+ bụ́ onye na-ejere eze ozi iwu, sị: 13  Gaanụ jụọ Jehova ase+ n’aha m nakwa n’aha ndị ala anyị nakwa n’aha Juda dum banyere ihe e kwuru n’akwụkwọ a a hụrụ; n’ihi na ọnụma Jehova+ nke e mere ka o nwuru ọkụ n’ebe anyị nọ dị ukwuu n’ihi na nna nna anyị hà+ egeghị ntị n’ihe e kwuru n’akwụkwọ a site n’ime ihe niile e dere banyere anyị.”+ 14  Hilkaya onye nchụàjà na Ahaịkam na Akbọ na Shefan na Asaya wee gakwuru Họlda onye amụma nwaanyị+ bụ́ nwunye Shalọm nwa Tikva nwa Hahas, onye na-elekọta uwe,+ mgbe o bi na Jeruselem n’ógbè nke abụọ; ha wee gwa ya okwu.+ 15  Nwaanyị ahụ wee sị ha: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru,+ ‘Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwute m, sị: 16  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-eme ka ọdachi+ dakwasị obodo a na ndị bi n’ime ya,+ bụ́ ihe niile e kwuru+ n’akwụkwọ ahụ eze Juda gụrụ;+ 17  n’ihi na ha ahapụwo m wee gaa na-esurere chi ọzọ dị iche iche ihe nsure ọkụ+ ka ha wee jiri ihe niile ha ji aka ha rụọ+ kpasuo m iwe, e mewokwa ka ọnụma m nwuru ọkụ megide ebe a, a gaghịkwa emenyụ ya emenyụ.’”’+ 18  Ma eze Juda bụ́ onye zitere unu ịjụ Jehova ase, unu ga-agwa ya sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru: “Banyere okwu ahụ ị nụrụ,+ 19  ebe ọ bụ na obi+ gị dị nro, i wee weda onwe gị ala+ n’ihi Jehova mgbe ị nụrụ ihe m kwuru m ga-eme obodo a na ndị bi n’ime ya, na ha ga-aghọ ihe ijuanya na ihe nkọcha,+ i wee dọwaa+ uwe gị ma malite ịkwa ákwá n’ihu m, mụ onwe m anụwo ya,” ka Jehova kwuru.+ 20  “Ya mere, lee, m ga-eme ka e lie+ gị dị ka e liri nna nna gị hà, a ga-elikwa gị n’ili gị n’udo,+ anya gị agaghịkwa ahụ ọdachi dum m ga-eme ka ọ dakwasị obodo a.”’” Ha wee gwa eze ihe ha jetara.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji