2 Ihe E Mere 10:1-19

10  Rehoboam+ wee gaa Shikem,+ n’ihi na ọ bụ na Shikem ka ndị Izrel niile bịara ka ha chie ya eze.  O wee ruo na ngwa ngwa Jeroboam+ nwa Nibat nụrụ ya, mgbe ọ ka nọ n’Ijipt,+ (n’ihi na ọ gbara ọsọ n’ihi eze Sọlọmọn,) Jeroboam si n’Ijipt lọta ozugbo.+  Ha wee zie ozi ka ọ bịa, Jeroboam na Izrel dum wee bịa gwa Rehoboam, sị:+  “Nna gị mere ka yok anyị sie ike;+ mee ka ọrụ siri ike nna gị nyere anyị na yok dị arọ+ nke o boro anyị dị mfe, anyị ga-ejekwara gị ozi.”+  O wee sị ha: “Nyenụ m ụbọchị atọ. Mgbe ahụ, bịaghachinụ.” Ha wee laa.  Eze Rehoboam wee gakwuru ndị okenye bụ́ ndị jeere Sọlọmọn nna ya ozi mgbe ọ dị ndụ, ka ha nye ya ndụmọdụ,+ o wee sị ha: “Olee ihe unu na-adụ m ọdụ ka m zaa ndị a?”+  Ha wee sị ya: “Ọ bụrụ na ị ga-emezi ndị a emezi, meekwa ihe dị ha mma ma gwa ha okwu ọma,+ ha ga-abụ ndị ohu gị mgbe niile.”+  Otú ọ dị, ọ hapụrụ ndụmọdụ+ ahụ ndị okenye nyere ya, o wee gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ,+ bụ́ ndị na-ejere ya ozi,+ ka ha nye ya ndụmọdụ.  O wee sị ha: “Olee ihe unu na-adụ m ọdụ+ ka anyị zaa ndị a gwara m, sị, ‘Mee ka yok nna gị boro anyị dị mfe’?”+ 10  Ụmụ okorobịa ahụ ya na ha tokọrọ wee sị ya: “Ihe a ka ị ga-agwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị mere ka yok anyị dị arọ, ma gị onwe gị mee ka ọ dị mfe n’ahụ́ anyị’; ihe a ka ị ga-agwa ha,+ ‘Mkpịsị aka nta m ga-adị okpotokpo karịa úkwù nna m.+ 11  Nna m boro unu yok dị arọ, ma mụ onwe m ga-atụkwasị ihe na yok unu.+ Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma mụ onwe m ga-apịa unu ụtarị akpụkpọ anụ.’”+ 12  Jeroboam na ndị Izrel niile wee bịakwute Rehoboam n’ụbọchị nke atọ, dị nnọọ ka eze kwuru, sị: “Bịaghachinụ n’ụbọchị nke atọ.”+ 13  Eze wee zaa ha n’olu ike.+ Eze Rehoboam wee hapụ ndụmọdụ+ ahụ ndị okenye nyere ya,+ 14  o wee gaa n’ihu ịgwa ha okwu dị ka ndụmọdụ ụmụ okorobịa nyere ya si dị,+ sị: “M ga-eme ka yok unu dịkwuo arọ, mụ onwe m ga-atụkwasị ihe na ya. Nna m pịara unu ụtarị nkịtị, ma mụ onwe m ga-apịa unu ụtarị akpụkpọ anụ.”+ 15  Eze egeghịkwa ndị ahụ ntị; n’ihi na ihe a na-emenụ si n’aka ezi Chineke,+ ka Jehova wee mezuo ihe ọ gwara+ Jeroboam nwa Nibat+ site n’ọnụ Ahaịja+ onye Shaịlo.+ 16  Ebe ọ bụ na eze egeghị Izrel dum ntị, ha zara eze, sị: “Olee òkè anyị nwere na Devid?+ Ọ dịghịkwa ihe nketa anyị nwere na nwa Jesi.+ Onye ọ bụla lakwuru chi ya,+ Izrel! Lekwa ụlọ gị, Devid.”+ Ndị Izrel niile wee lawa n’ụlọikwuu ha. 17  Ma Rehoboam nọ na-achị ụmụ Izrel bi n’obodo ndị dị na Juda.+ 18  Eze Rehoboam wee ziga Hedoram,+ bụ́ onye na-elekọta ndị a kpọọrọ ịrụ ọrụ mmanye, ma ụmụ Izrel ji nkume tụgbuo ya.+ Ma Eze Rehoboam jisiri ike rịgoro n’ụgbọ ịnyịnya gbalaa Jeruselem.+ 19  Ụmụ Izrel wee nọgide na-enupụrụ ụlọ Devid isi+ ruo taa.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji