2 Ihe E Mere 30:1-27

30  Hezekaya wee zie Izrel na Juda dum ozi,+ o degakwaara Ifrem+ na Manase+ akwụkwọ ozi, ka ha bịa n’ụlọ Jehova+ dị na Jeruselem iji meere Jehova bụ́ Chineke Izrel ememme ngabiga.+  Otú ọ dị, eze na ndị o mere ndị isi+ nakwa ndị niile ahụ zukọtaranụ+ na Jeruselem kpebiri ime ememme ngabiga ahụ n’ọnwa nke abụọ;+  n’ihi na ha enweghị ike ime ya n’oge ahụ,+ n’ihi na ọtụtụ ndị nchụàjà+ edobeghị onwe ha nsọ, ndị mmadụ ezukọtabeghịkwa na Jeruselem.  Nke ahụ dịkwa mma n’anya eze nakwa n’anya ọgbakọ ahụ dum.+  Ha wee kpebie ka a kpọsaara+ Izrel dum, malite na Bia-shiba+ ruo Dan,+ ka ha bịa meere Jehova bụ́ Chineke Izrel ememme ngabiga na Jeruselem; n’ihi na ha emebeghị otú ahụ n’ìgwè+ dị ka ihe e dere n’akwụkwọ si dị.+  Ndị ọgba ọsọ+ wee were akwụkwọ ozi ndị ahụ si n’aka eze na ndị o mere ndị isi+ gazuo Izrel na Juda dum, ọbụna dị ka ihe eze nyere n’iwu si dị, na-asị: “Ụmụ Izrel, lọghachikwutenụ+ Jehova bụ́ Chineke+ Ebreham, Aịzik na Izrel, ka o wee lọghachikwuru ndị fọdụrụ+ n’ime unu, bụ́ ndị ndị eze Asiria+ na-akparaghị aka.  Unu adịla ka nna nna unu hà+ na ụmụnne unu, bụ́ ndị mesoro Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà omume ekwesịghị ntụkwasị obi, o wee mee ka ha bụrụ ihe ijuanya,+ dị nnọọ ka unu na-ahụ taa.  Ugbu a, unu ekwesila olu ike+ dị ka nna nna unu hà mere. Doonụ onwe unu n’okpuru Jehova,+ bịakwanụ n’ebe nsọ ya+ nke o doworo nsọ+ ruo mgbe a na-akaghị aka wee fee+ Jehova bụ́ Chineke unu, ka iwe dị ọkụ+ ọ na-eweso unu wee dajụọ.  N’ihi na ọ bụrụ na unu alọghachikwute+ Jehova, ụmụnne unu na ụmụ unu ga-aghọ ndị e kwesịrị imere ebere+ n’anya ndị dọọrọ ha n’agha, ha ga-ahapụkwa ha ka ha lọta n’ala a;+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-eme amara,+ na-emekwa ebere.+ Ọ gaghịkwa ewepụ ihu ya n’ebe unu nọ ma ọ bụrụ na unu alọghachikwute ya.”+ 10  Ndị ọgba ọsọ+ wee na-aga, si n’otu obodo gaa n’obodo ọzọ n’ala Ifrem+ na Manase dum, ruo Zebulọn; ma ha nọ na-akwa ha emo ma na-achị ha ọchị.+ 11  Ọ bụ naanị ndị+ si n’Asha na Manase na Zebulọn wedara onwe ha ala+ wee bịa Jeruselem. 12  Aka ezi Chineke dịnyekwaara ndị Juda iji mee ka ha were otu obi+ mee ihe eze na ndị isi nyere n’iwu+ n’ihe metụtara ozi Jehova.+ 13  Ọtụtụ mmadụ, ya bụ, ìgwè mmadụ dị ukwuu, wee zukọta na Jeruselem+ iji mee ememme+ achịcha na-ekoghị eko n’ọnwa nke abụọ.+ 14  Ha wee bilie wepụ ebe ịchụàjà+ ndị dị na Jeruselem, ha wepụkwara ebe ịchụàjà niile nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ ma tụba ha na ndagwurugwu Kidrọn.+ 15  E mesịa, ha gburu anụ ememme ngabiga+ n’abalị iri na anọ n’ọnwa nke abụọ; ihere bịara ndị nchụàjà na ndị Livaị, ha wee doo onwe ha nsọ+ ma webata anụ àjà nsure ọkụ n’ụlọ Jehova. 16  Ha wee guzoro+ n’ebe ha kwesịrị iguzo dị ka ụkpụrụ na-eduzi ha si dị, dị ka iwu Mozis bụ́ onye nke ezi Chineke si dị, ndị nchụàjà+ nọkwa na-efesa ọbara, bụ́ nke ndị Livaị nọ na-ebunye ha, n’elu ebe ịchụàjà. 17  N’ihi na e nwere ọtụtụ ndị n’ime ndị ahụ zukọtaranụ bụ́ ndị na-edoghị onwe ha nsọ; ọ bụkwa ndị Livaị+ nọ na-ahụ maka igbu anụ ememme ngabiga ahụ+ maka ndị niile na-adịghị ọcha, iji doo ha nsọ nye Jehova. 18  N’ihi na ọtụtụ ndị n’ime ìgwè mmadụ ahụ, ndị ọtụtụ n’ime ha si Ifrem+ na Manase,+ Ịsaka na Zebulọn,+ emeghị onwe ha ka ha dị ọcha,+ ha erighị anụ ememme ngabiga ahụ dị ka ihe e dere n’akwụkwọ si dị;+ ma Hezekaya kpeere ha ekpere,+ sị: “Ka Jehova bụ́ onye ọma+ gbaghara 19  onye ọ bụla nke doziri obi ya+ ịchọ ezi Chineke, bụ́ Jehova, Chineke nna nna ya hà, ọ bụ ezie na o debeghị onwe ya ọcha maka ihe dị nsọ.”+ 20  Jehova wee gee Hezekaya ntị wee gwọọ ha.+ 21  Ụmụ Izrel ndị bịara Jeruselem wee jiri oké ọṅụ+ mee ememme+ achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa; ndị Livaị+ na ndị nchụàjà+ jikwa ngwá egwú ndị na-ada ụda na-enye Jehova otuto kwa ụbọchị, ee, ha na-enye Jehova otuto.+ 22  Hezekaya gwakwara ndị Livaị niile, bụ́ ndị ji ezi uche na-ejere Jehova ozi,+ okwu ruru ha n’obi.+ Ha wee rie oriri ahụ a kara aka ruo ụbọchị asaa,+ na-achụ àjà udo+ ma na-ekwupụtara Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha mmehie ha.+ 23  Ndị niile ahụ zukọtara wee kpebie+ ime ya ruo ụbọchị asaa ọzọ,+ ha wee jiri ọṅụ mee ya ụbọchị asaa. 24  N’ihi na Hezekaya eze Juda nyere+ ndị ahụ zukọtara otu puku ehi na puku atụrụ asaa, ndị isi+ nyekwara ha otu puku ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụàjà+ wee na-edo onwe ha nsọ. 25  Ndị Juda niile bụ́ ndị zukọtaranụ+ na ndị nchụàjà na ndị Livaị+ na ndị niile si n’Izrel bịa+ na ndị mbịarambịa+ si n’ala Izrel bịa+ na ndị bi na Juda wee na-aṅụrị ọṅụ.+ 26  E wee ṅụrịa oké ọṅụ na Jeruselem, n’ihi na e nwetụbeghị nke dị ka nke a na Jeruselem+ malite n’ụbọchị Sọlọmọn+ nwa Devid eze Izrel. 27  N’ikpeazụ, ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, wee bilie gọzie+ ìgwè mmadụ ahụ; e wee nụ olu ha, ekpere ha wee ruo n’ebe obibi ya dị nsọ, bụ́ eluigwe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji