Abụ Ọma 113:1-9
113 Toonụ Jaa!+Nyenụ ya otuto, unu ndị ohu Jehova,+Toonụ aha Jehova.+
2 Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi+Malite ugbu a gaa n’ihu, ruo mgbe ebighị ebi.+
3 Malite n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda ya,+A ga na-eto aha Jehova.+
4 Jehova dị elu karịa mba niile;+Ebube ya dị elu karịa eluigwe.+
5 Ònye dị ka Jehova Chineke anyị,+Bụ́ onye mere ka ebe obibi ya dịrị n’ebe dị elu?+
6 Ọ na-ewetu onwe ya ala iji lee eluigwe na ụwa anya,+
7 Ọ na-esi n’ájá kulite onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya;+Ọ na-esi n’olulu ntụ bulie ogbenye elu,+
8 Iji mee ka o soro ndị a ma ama nọdụ ala,+Bụ́ ndị a ma ama n’etiti ndị Chineke.+
9 Ọ na-eme ka nwaanyị aga biri n’ụlọ,+Dị ka nne nwere obi ụtọ, nke mụrụ ọtụtụ ụmụ.+Toonụ Jaa!+