Abụ Ọma 121:1-8
Abụ Nrịgo.
121 M ga-eleli anya lee ugwu dị iche iche.+Olee ebe enyemaka m ga-esi bịa?+
2 Enyemaka m ga-esi n’aka Jehova bịa,+Bụ́ Onye kere eluigwe na ụwa.+
3 E nweghị ka ọ ga-esi kwe ka ụkwụ gị maa jijiji.+E nweghị ka Onye na-eche gị nche ga-esi roo ụra.+
4 Lee! Onye na-eche Izrel nche agaghị ero ụra,+Ọ gaghịkwa arahụ ụra.+
5 Jehova na-eche gị nche.+Jehova bụ ndò gị+ n’aka nri gị.+
6 Anwụ agaghị na-acha gị n’ehihie,+Ọnwa agaghịkwa na-acha gị n’abalị.+
7 Jehova ga-eche gị nche ka ọdachi ọ bụla ghara ịdakwasị gị.+Ọ ga-eche mkpụrụ obi gị nche.+
8 Jehova ga-eche gị nche mgbe ị na-apụ apụ na mgbe ị na-abata abata,+Malite ugbu a gaa n’ihu, ruo mgbe ebighị ebi.+