Abụ Ọma 124:1-8
Abụ Nrịgo. Abụ ọma Devid.
124 “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị,”+Ka Izrel kwuo ugbu a, sị,+
2 “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị+Mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,+
3 Ha gaara eloda anyị ọbụna ná ndụ,+Mgbe ha na-eweso anyị iwe dị ọkụ.+
4 Mmiri gaara eburu anyị,+Iyi gaara asọfe n’elu mkpụrụ obi anyị.+
5 Mmiri mpako+Gaara asọfe n’elu mkpụrụ obi anyị.
6 Ka Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi, bụ́ onye na-ewereghị anyị+Nye ezé ha ka ọ bụrụ anụ oriri.+
7 Mkpụrụ obi anyị dị ka nnụnụNke si n’ọnyà nke ndị na-esi ọnyà+ fepụ.+Ọnyà agbajiwo,+Anyị onwe anyị agbapụwokwa.+
8 Enyemaka anyị dị n’aha Jehova,+Onye kere eluigwe na ụwa.”+