Abụ Ọma 144:1-15
Abụ ọma Devid.
144 Ka Jehova bụ́ Oké Nkume m bụrụ onye a gọziri agọzi,+Bụ́ onye na-akụziri aka m ịlụ ọgụ,+Na-akụziri mkpịsị aka m ibu agha;
2 Obiọma m nakwa ebe m e wusiri ike,+Ebe m dị elu e wusiri ike na Onye na-emere m ụzọ mgbapụ,+Ọta m+ nakwa Onye m gbabaworo n’ime ya,+Onye na-eweda ndị dị iche iche n’ala n’okpuru m.+
3 Jehova, gịnị ka mmadụ bụ na i ji ya kpọrọ ihe,+Gịnịkwa ka nwa nke mmadụ efu+ bụ na ị na-echeta ya?
4 Mmadụ yiri ume efu e kupụrụ ekupụ;+Ụbọchị ya dị ka onyinyo nke na-agafe agafe.+
5 Jehova, biko, bịada eluigwe gị ka i wee gbadata;+Metụ ugwu aka ka ha wee kwụwa anwụrụ.+
6 Mee ka àmụ̀mà gbuo ka i wee chụsasịa ndị iro;+Gbapụ akụ̀ gị ka i wee tinye ha n’ọgba aghara.+
7 Si n’ebe dị n’elu matịa aka;+Mee ka m nwere onwe m, napụtakwa m n’ọtụtụ mmiri,+N’aka ndị mba ọzọ,+
8 Ndị ọnụ ha kwuworo ihe na-abụghị eziokwu,+Ndị aka nri ha bụ aka nri okwu ụgha.+
9 Chineke, m ga-abụku gị abụ ọhụrụ.+M ga-eji ụbọ nwere akwara iri bụkuo gị abụ olu ụtọ,+
10 Onye na-enye ndị eze nzọpụta,+Onye na-atọhapụ Devid bụ́ ohu ya n’aka mma agha ọjọọ.+
11 Mee ka m nwere onwe m, napụtakwa m n’aka ndị mba ọzọ,+Ndị ọnụ ha kwuworo ihe na-abụghị eziokwu,+Ndị aka nri ha bụkwa aka nri okwu ụgha,+
12 Ndị na-asị: “Ụmụ anyị ndị ikom bụ́ ndị na-eto eto dị ka obere osisi topụtaworo etopụta,+Ụmụ anyị ndị inyom dịkwa ka ogidi isi nkuku ndị a tụrụ ka ha yie ogidi ndị dị n’obí eze,
13 Ebe anyị na-echekwa mkpụrụ juru eju, ụdị mkpụrụ dị iche iche dị na ya,+Ìgwè ewu na atụrụ anyị na-amụba puku kwuru puku, otu na-aghọ puku iri, n’okporo ámá anyị,
14 Ehi anyị dịcha ime, n’enweghị nke ahụ́ ya na-agbawa, n’enweghịkwa nke ime na-apụ,+A dịghịkwa eti mkpu ákwá n’ámá anyị.+
15 Obi ụtọ na-adịrị ndị ọ dịrị nnọọ otú ahụ!”Obi ụtọ na-adịrị ndị Chineke ha bụ Jehova!+