Abụ Ọma 15:1-5
Abụ olu ụtọ Devid.
15 Jehova, ònye ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị?+Ònye ga-ebi n’ugwu nsọ gị?+
2 Ọ bụ onye na-eje ije n’ụzọ na-enweghị ntụpọ,+ onye na-eme ezi omume,+Onye na-ekwukwa eziokwu n’obi ya.+
3 Ọ dịghị eji ire ya ekwutọ mmadụ.+Ọ dịghị eme mmadụ ibe ya ihe ọjọọ,+Ọ dịghịkwa akọcha onye ya na ya na-akpachi anya.+
4 N’anya ya, onye ọ bụla nke na-abaghị n’ihe bụ onye a jụrụ ajụ,+Ma ndị na-atụ egwu Jehova ka ọ na-asọpụrụ.+Ọ bụrụ na ọ ṅụọ iyi nke pụrụ iwetara ya nsogbu, ọ dịghị agbanwe ya.+
5 Ọ dịghị ana ọmụrụ nwa n’ego ọ gbazinyere mmadụ,+Ọ dịghịkwa eri ngarị iji megide onye aka ya dị ọcha.+A gaghị eme ka onye na-eme ihe ndị a maa jijiji ma ọlị.+