Abụ Ọma 24:1-10

Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ. 24  Ọ bụ Jehova nwe ụwa na ihe jupụtara n’ime ya,+Elu ala nakwa ndị bi na ya.+   N’ihi na ọ tọsiwo ntọala ya ike n’elu oké osimiri,+O mewokwa ka o guzosie ike n’elu osimiri.+   Ònye ga-arịgo n’ugwu Jehova,+Ònyekwa ga-agbago n’ebe nsọ ya?+   Ọ bụ onye ọ bụla aka ya dị ọcha, onye obi ya dịkwa ọcha,+Onye na-adịghị eji mkpụrụ obi M* eme ihe efu,+Onye na-adịghịkwa aṅụ iyi ụgha.+   Ọ ga-anata ngọzi n’aka Jehova,+Natakwa ezi omume n’aka Chineke nke nzọpụta ya.+   Nke a bụ ọgbọ nke ndị na-achọ ya,Nke ndị na-achọ ihu ọma gị, Chineke nke Jekọb.+ Sila.   “Welienụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ámá niile,+Meenụ onwe unu ka unu dị elu, unu ọnụ ụzọ ndị dịwara kemgbe ogologo oge,+Ka Eze dị ebube wee bata!”+   “Ònyezi bụ Eze a dị ebube?”+“Ọ bụ Jehova bụ́ onye dị ike ma nwee ume,+Jehova onye bụ́ dike n’agha.”+   “Welienụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ámá niile;+Ee, welienụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ndị dịwara kemgbe ogologo oge,Ka Eze dị ebube wee bata!”+ 10  “Ònyezi bụ Eze a dị ebube?”“Jehova nke ụsụụ ndị agha—ọ bụ ya bụ Eze ahụ dị ebube.”+ Sila.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Nke a na-ekwu banyere Jehova.