Abụ Ọma 52:1-9

Ntụziaka e nyere onye nduzi. Maskil. Abụ ọma Devid, mgbe Doeg onye Idọm bịara kọọrọ Sọl na Devid bịara n’ụlọ Ahimelek.+ 52  Gịnị mere i ji were ihe ọjọọ na-etu ọnụ, gị onye dị ike?+Obiọma* Chineke na-adịru ogologo ụbọchị dum.+   Ire gị na-akpa nkata ihe ọjọọ, ị mụwo ya dị ka agụba,+Ọ na-aghọ aghụghọ.+   Ị hụrụ ihe ọjọọ n’anya karịa ihe ọma,+Ị hụkwara okwu ụgha n’anya karịa ikwu eziokwu.+ Sila.   Ị hụrụ okwu niile na-emebi ihe n’anya,+Gị ire aghụghọ.+   Chineke ga-adọtukwa gị ruo mgbe ebighị ebi;+Ọ ga-akụtu gị ma si n’ụlọikwuu gị dọkapụ gị,+Ọ ghaghịkwa ifopụ gị n’ala ndị dị ndụ.+ Sila.   Ndị ezi omume ga-ahụ ya wee tụọ egwu,+Ha ga-achịkwa ya ọchị.+   Onye a bụ dimkpa nke na-adịghị eme Chineke ebe ya e wusiri ike,+Kama ọ tụkwasịrị obi n’akụ̀ ya dị ukwuu,+Nke na-achọ iji ahụhụ ọ na-akpata mere ihe nchebe.+   Ma m ga na-ama pokopoko n’ụlọ Chineke dị ka osisi oliv;+Atụkwasịrị m obi n’obiọma Chineke ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.+   M ga-eto gị ruo mgbe ebighị ebi, n’ihi na i mewo ihe;+M ga-enwekwa olileanya n’aha gị n’ihu ndị na-eguzosi ike n’ebe ị nọ n’ihi na ọ dị mma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”