Abụ Ọma 75:1-10

Ntụziaka e nyere onye nduzi. “Alala m n’iyi.” Abụ olu ụtọ. Abụ ọma Esaf.+ Abụ. 75  Anyị na-ekele gị, Chineke; anyị na-ekele gị,+Aha gị dị n’ebe dị nso.+Ndị mmadụ ga-akọsa ọrụ gị ndị dị ebube.+   “N’ihi na m mere ihe n’oge a kara aka;+Mụ onwe m ji ịkwụwa aka ọtọ malite ikpe ikpe.+   Ụwa na ndị niile bi n’ime ya nọ na-agbaze,+Ọ bụ m mere ka ogidi ya dị iche iche guzozie.”+ Sila.   Agwara m ndị nzuzu, sị: “Unu abụla ndị nzuzu,”+Agwakwara m ndị ajọ omume, sị: “Unu ebulila mpi elu.+   Unu emela ka mpi unu dị elu.Unu ejila mpako na-ekwu okwu.+   N’ihi na mbuli elu adịghị abịa site n’ebe ọwụwa anyanwụ ma ọ bụ site n’ebe ọdịda anyanwụ,Ma ọ bụ site n’ebe ndịda.   N’ihi na Chineke bụ onyeikpe.+Ọ na-eweda otu onye ala, buliekwa onye nke ọzọ elu.+   N’ihi na e nwere iko dị n’aka Jehova,+Mmanya dị n’ime ya na-agbọ ụfụfụ, a gwara ya agwa.Ọ ga-agbapụtakwa ikè mmanya dị n’iko ahụ;Ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa ga-aṅụ ya, ṅụkpọọ ya.”+   Ma mụ onwe m ga na-akọ ya ruo mgbe ebighị ebi;M ga-abụku Chineke nke Jekọb abụ olu ụtọ.+ 10  “M ga-egbujikwa mpi niile nke ndị ajọ omume.”+A ga-eme ka mpi onye ezi omume dị elu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji