Abụ Ọma 99:1-9

99  Jehova aghọwo eze.+ Ka ndị dị iche iche maa jijiji.+Ọ nọ ọdụ n’elu cherọb.+ Ka ụwa maa jijiji.+   Jehova dị ukwuu na Zayọn,+Ọ dị elu karịa ndị niile dị iche iche.+   Ka ha too aha gị.+Ọ dị ukwuu, bụrụkwa ihe a na-atụ egwu, ọ dịkwa nsọ.+   Ọ bụ eze nke na-eji ike ya egosi na ya hụrụ ikpe ziri ezi n’anya.+Gị onwe gị emewo ka ịkwụwa aka ọtọ guzosie ike.+I mewo ka e nwee ikpe ziri ezi na ezi omume n’ime Jekọb.+   Toonụ Jehova Chineke anyị,+ kpọọkwanụ isiala n’ebe mgbakwasị ụkwụ ya;+Ya onwe ya dị nsọ.+   Mozis na Erọn so ná ndị nchụàjà ya,+Samuel sokwa ná ndị na-akpọku aha ya.+Ha nọ na-akpọku Jehova, ya onwe ya nọkwa na-aza ha.+   Ọ nọ na-agwa ha okwu n’ogidi ígwé ojii.+Ha debere ihe ncheta ya nakwa ụkpụrụ o nyere ha.+   Jehova Chineke anyị, gị onwe gị zara ha.+Ị bụụrụ ha Chineke nke na-agbaghara mmehie,+Nke na-abọkwa ọbọ n’ahụ́ ha maka arụ niile ha mere.+   Toonụ Jehova Chineke anyị,+K p ọ ọ k w a n ụ isiala n’ugwu nsọ ya.+N’ihi na Jehova Chineke anyị dị nsọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji