Diuterọnọmi 1:1-46
1 Ndị a bụ okwu Mozis gwara Izrel dum n’ógbè Jọdan nke dị n’ala ịkpa, na mbara ọzara nke dị n’ihu Sọf, n’agbata Peran+ na Tofel na Leban na Hazirọt+ na Daịzahab,
2 ọ na-ewe ụbọchị iri na otu isi na Horeb garuo Kedesh-bania+ ma e si n’ụzọ Ugwu Sia.
3 O wee ruo n’afọ nke iri anọ,+ n’ọnwa nke iri na otu, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ, na Mozis gwara ụmụ Izrel ihe niile Jehova nyere ya iwu ka ọ gwa ha,
4 mgbe o merisịrị Saịhọn+ eze ndị Amọraịt, onye bi na Heshbọn, na Ọg+ eze Beshan, onye bi n’Ashtarọt, n’Edriaị.
5 N’ógbè Jọdan nke dị n’ala Moab, Mozis malitere ịkọwa iwu+ a, sị:
6 “Jehova bụ́ Chineke anyị gwara anyị okwu na Horeb,+ sị, ‘Oge unu biri n’ógbè a bụ́ ugwu ugwu+ ezuwo.
7 Tụgharịanụ, kwalie banye n’ógbè ndị Amọraịt+ nke bụ́ ugwu ugwu nakwa n’ala niile ha na ha gbara agbata obi n’Araba,+ bụ́ ógbè bụ́ ugwu ugwu+ nakwa Shefila na Negeb+ na ala dị n’ụsọ oké osimiri, bụ́ ala ndị Kenan,+ nakwa Lebanọn,+ ruo n’osimiri ukwu, bụ́ osimiri Yufretis.+
8 Lee, edebewo m ala ahụ n’ihu unu. Banyenụ weghara ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna unu hà, bụ́ Ebreham, Aịzik+ na Jekọb,+ iyi, inye ha na mkpụrụ ga-anọchi ha.’+
9 “M wee gwa unu n’oge ahụ, sị, ‘Naanị m enweghị ike iburu unu.+
10 Jehova bụ́ Chineke unu emewo ka unu mụbaa, lee, taa, unu dị ọtụtụ+ dị ka kpakpando nke eluigwe.
11 Ka Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà mee ka ọnụ ọgụgụ unu+ mụbaa okpukpu otu puku, ka ọ gọziekwa+ unu dị ka o kwere unu ná nkwa.+
12 Olee otú naanị m ga-esi buru ibu arọ unu na ibu unu nakwa esemokwu+ unu?
13 Sinụ n’ebo unu niile chọta ndị ikom maara ihe na ndị nwere uche+ ma nwee ahụmahụ,+ ka m mee ha ndị isi unu.’+
14 Unu wee zaa m, sị, ‘Ihe i kwuru ka anyị mee dị mma.’
15 M wee kpọrọ ndị isi nke ebo unu niile, ndị ikom maara ihe ma nwee ahụmahụ, wee mee ha ndị isi unu, ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha na ndị isi nke ndị agha iri ise ndị agha iri ise na ndị isi nke ndị agha iri ndị agha iri nakwa ndị na-elekọta ebo unu.+
16 “M wee nye ndị ikpe unu iwu n’oge ahụ, sị, ‘Mgbe unu na-anụrụ okwu ikpe n’etiti ụmụnne unu, kpeenụ ikpe n’ezi omume+ n’etiti mmadụ na nwanne ya ma ọ bụ n’etiti mmadụ na onye mbịarambịa+ ya na ya bi.
17 Unu elela mmadụ anya n’ihu mgbe unu na-ekpe ikpe.+ Unu ga-anụrụ ihe onye nta ga-ekwu dịkwa ka unu ga-anụrụ nke onye ukwu.+ Unu atụla ụjọ n’ihi mmadụ,+ n’ihi na ikpe bụ nke Chineke;+ okwu ikpe nke siiri unu oké ike, unu ga-eweta ya n’ihu m, m ga-anụrụkwa ya.’+
18 M wee nye unu iwu n’oge ahụ banyere ihe niile unu ga-eme.
19 “Anyị wee si na Horeb kwalie gabiga nnukwu ala ịkpa+ ahụ dum nke dị egwu, bụ́ nke unu hụrụ, nke dị n’ụzọ e si aga ógbè ndị Amọraịt+ nke bụ́ ugwu ugwu, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke anyị nyere anyị n’iwu; e mesịa, anyị bịarutere Kedesh-bania.+
20 M wee sị unu, ‘Unu abịarutewo n’ógbè ndị Amọraịt nke bụ́ ugwu ugwu, nke Jehova bụ́ Chineke anyị na-enye anyị.+
21 Lee, Jehova bụ́ Chineke gị enyefewo ala ahụ n’aka gị.+ Gbagoo, nweta ya, dị nnọọ ka Jehova bụ́ Chineke nna nna gị hà gwara gị.+ Atụla egwu, atụkwala ụjọ.’+
22 “Otú ọ dị, unu niile bịakwutere m wee sị, ‘Ka anyị zipụ ndị ikom ka ha buru anyị ụzọ gaa ledooro anyị ala ahụ ma kọọrọ anyị ụzọ anyị ga-esi gbagoo nakwa banyere obodo ndị anyị ga-abanye.’+
23 Ihe ahụ wee dị m mma, m wee họrọ ndị ikom iri na abụọ n’ime unu, otu onye maka otu ebo.+
24 Ha wee tụgharịa gbagoo n’ógbè+ ahụ bụ́ ugwu ugwu, ruokwa na ndagwurugwu Eshkọl+ wee ledo ya.
25 Ha wee weta ụfọdụ n’ime mkpụrụ nke ala+ ahụ ma welatara anyị ha, ha kọọrọ anyị, sị, ‘Ala ahụ Jehova bụ́ Chineke anyị na-enye anyị dị mma.’+
26 Ma unu achọghị ịgbago,+ unu malitekwara inupụ isi n’ihe Jehova bụ́ Chineke unu nyere n’iwu.+
27 Unu nọ na-atamu ntamu n’ụlọikwuu unu, sị, ‘Ọ bụ n’ihi na Jehova kpọrọ anyị asị+ mere o ji kpọpụta anyị n’ala Ijipt+ ka o nyefee anyị n’aka ndị Amọraịt, ka ha laa anyị n’iyi.+
28 Olee ebe anyị ga-agbago? Ụmụnne anyị emewo ka obi lọọ anyị mmiri,+ sị: “N’ebe ahụ, anyị hụrụ ndị gbara agba ma too ogologo karịa anyị,+ hụkwa nnukwu obodo ndị e wusiri ike ruo n’eluigwe+ nakwa ụmụ Enak.”’+
29 “M wee sị unu, ‘Unu amala jijiji, unu atụkwala egwu n’ihi ha.+
30 Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-ebutere unu ụzọ. Ọ ga-eburu unu agha+ dị ka ihe niile o meere unu n’Ijipt si dị, bụ́ ndị unu ji anya unu hụ,+
31 nakwa n’ala ịkpa,+ bụ́ ebe ị hụrụ otú Jehova bụ́ Chineke gị si kuru gị+ dị ka nwoke si eku nwa ya, n’ebe niile unu jegharịrị ruo mgbe unu bịarutere ebe a.’+
32 Ma n’agbanyeghị okwu a, unu enweghị okwukwe n’ebe Jehova bụ́ Chineke unu nọ,+
33 bụ́ onye na-ebutere unu ụzọ iji ledooro unu ebe unu ga-ama ụlọikwuu,+ onye ji ọkụ na-ebutere unu ụzọ iji mee ka unu na-ahụ ụzọ unu kwesịrị iso n’abalị, jirikwa ígwé ojii na-ebutere unu ụzọ n’ehihie.+
34 “N’oge ahụ niile, Jehova nụrụ ihe unu kwuru. O wee wee iwe ma ṅụọ iyi,+ sị,
35 ‘Ọ dịghị otu onye n’ime ndị ikom a so n’ajọ ọgbọ a nke ga-ahụ ezi ala ahụ m ṅụrụ iyi inye nna unu hà,+
36 ma e wezụga Keleb nwa Jefọne.+ Ọ ga-ahụ ya, ọ bụkwa ya na ụmụ ya ka m ga-enye ala ahụ ọ zọrọ ụkwụ na ya, n’ihi na o soro Jehova n’ụzọ zuru ezu.+
37 (Jehova wesoro ọbụna mụ onwe m iwe n’ihi unu, sị, ‘Gị onwe gị kwa agaghị aba n’ebe ahụ.+
38 Ọ bụ Jọshụa nwa Nọn, onye guzo n’ihu gị, ga-aba n’ebe ahụ.’+ Ọ bụ ya ka o meworo ka ọ dị ike,+ n’ihi na ọ ga-eme ka Izrel keta ya.)
39 Ma ụmụntakịrị unu, bụ́ ndị unu kwuru banyere ha, sị: “A ga-achịkọrọ ha!”+ ụmụ unu kwa, ndị na-amaghị ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ taa, ọ bụ ha ga-aba n’ebe ahụ, ọ bụkwa ha ka m ga-enye ya, ha ga-enwetakwa ya.
40 Ma unu onwe unu, tụgharịanụ, kwaliekwanụ soro ụzọ gara Oké Osimiri Uhie+ gawa n’ala ịkpa.’
41 “Unu wee zaa m, sị, ‘Anyị emehiewo Jehova.+ Anyị onwe anyị ga-agbago buo agha dị ka ihe niile Jehova bụ́ Chineke anyị nyere anyị n’iwu si dị!’ Onye ọ bụla n’ime unu wee kee ngwá agha ya n’úkwù ma were ya dị ka ihe dị mfe ịgbago n’ugwu ahụ.+
42 Ma Jehova sịrị m, ‘Gwa ha, sị: “Unu agbagola ibu agha, n’ihi na anọghị m n’etiti unu;+ ka ndị iro unu ghara imeri unu.”’+
43 M wee gwa ya unu, ma unu egeghị ntị, kama unu malitere inupụ isi+ n’ihe Jehova nyere n’iwu, nganga wee ju unu isi, unu wee nwaa ịgbago n’ugwu ahụ.+
44 Ndị Amọraịt bụ́ ndị bi n’ugwu ahụ wee pụta ibuso unu agha, ha wee chụwa unu ọsọ,+ dị nnọọ ka aṅụ si eme, wee chụsasịa unu na Sia ruo Họma.+
45 E mesịa, unu lọtara wee malite ịkwa ákwá n’ihu Jehova, ma Jehova egeghị ntị n’olu unu,+ ọ ṅaghịkwa unu ntị.+
46 Unu wee biri na Kedesh ruo ọtụtụ ụbọchị, ruo ọtụtụ ụbọchị unu biri n’ebe ahụ.+