Diuterọnọmi 13:1-18

13  “Ọ bụrụ na onye amụma+ ma ọ bụ ọrọ nrọ+ ebilie n’etiti unu wee meere gị ihe ịrịba ama ma ọ bụ ihe àmà,+  ihe ịrịba ama ahụ ma ọ bụ ihe àmà ahụ ewee mezuo, bụ́ nke ọ gwara gị banyere ya,+ sị, ‘Ka anyị sowe chi ọzọ, bụ́ ndị ị na-amaghị, ka anyị feekwa ha ofufe,’  egela ntị n’okwu onye amụma ahụ ma ọ bụ ọrọ nrọ ahụ,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-ele unu ule+ iji mara ma ùnu ji obi unu dum na mkpụrụ obi unu dum hụ Jehova bụ́ Chineke unu n’anya.+  Jehova bụ́ Chineke unu ka unu ga-eso, ya ka unu ga-atụ egwu, ihe o nyere n’iwu ka unu ga-edebe, olu ya ka unu ga-ege ntị, ya ka unu ga-ejere ozi, ọ bụkwa n’ahụ́ ya ka unu ga-arapara.+  A ga-egbu+ onye amụma+ ahụ ma ọ bụ ọrọ nrọ ahụ, n’ihi na o kwuwo okwu na-eme ka e nupụrụ Jehova bụ́ Chineke unu isi, bụ́ onye kpọpụtara unu n’ala Ijipt ma napụta gị n’ụlọ ndị ohu, iji mee ka ị hapụ ụzọ nke Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị iwu ka i jee ije na ya;+ ị ga-ekpochapụkwa ihe ọjọọ n’etiti unu.+  “Ọ bụrụ na nwanne gị nwoke, nwa nwoke nke nne gị mụrụ, ma ọ bụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị ma ọ bụ nwunye ị hụrụ n’anya ma ọ bụ enyi gị bụ́ onye ị hụrụ n’anya dị ka mkpụrụ obi gị,+ anwaa ịrata gị na nzuzo, sị, ‘Ka anyị gaa fee chi ọzọ,’+ ndị ị na-amaghị, ndị gị onwe gị ma ọ bụ nna nna gị hà na-amaghị,  bụ́ ụfọdụ n’ime chi nke ndị gbara unu gburugburu, ndị nọ gị nso ma ọ bụ ndị nọ gị n’ebe dị anya, malite n’otu nsọtụ nke ala ahụ ruo na nsọtụ ọzọ nke ala ahụ,  ekwerela ya, egekwala ya ntị,+ anya gị emekwarala ya ebere, enwekwarala ya ọmịiko,+ ezobekwala ya;  kama ị ga-egburịrị ya.+ Ọ bụ gị ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume iji gbuo ya, ndị Izrel niile ga-esokwa gị tụọ ya nkume.+ 10  Jiri nkume tụgbuo ya,+ n’ihi na ọ chọrọ ime ka ị hapụ Jehova bụ́ Chineke gị, bụ́ onye kpọpụtara gị n’ala Ijipt, n’ụlọ ndị ohu.+ 11  Izrel dum ga-anụkwa ya wee tụọ egwu, ha agaghịkwa eme ihe ọ bụla yiri ihe ọjọọ nke a ọzọ n’etiti unu.+ 12  “Ọ bụrụ na ị nụ ka a na-ekwu n’otu n’ime obodo gị, nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka i biri na ya, sị, 13  ‘Ndị ikom na-abaghị n’ihe apụtawo n’etiti unu+ ka ha wee duhie ndị bi n’obodo ha,+ na-asị: “Ka anyị gaa fee chi ọzọ,” ndị unu na-amaghị,’ 14  ị ga-achọgharịkwa ma sie imi n’ala, jụọkwa ase nke ọma;+ ọ bụrụkwa na o doo anya na ihe ahụ bụ eziokwu, na e mere ihe arụ a n’etiti unu, 15  ị ga-ejirịrị ihu mma agha gbuo ndị bi n’obodo ahụ.+ Jiri ihu mma agha bibie+ ya na ihe ọ bụla nọ n’ime ya nakwa anụ ụlọ ya. 16  Ị ga-achịkọtakwa ihe niile a kwatara na ya n’etiti ámá ya, ị ga-agbakwa obodo ahụ na ihe niile a kwatara n’ime ya ọkụ dị ka àjà a na-esurecha n’ọkụ nye Jehova bụ́ Chineke gị, ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.+ A gaghị ewughachi ya ma ọlị. 17  Ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ihe a ga-ebibi ebibi nke ị ga-ewere, ka iwe dị ọkụ nke Jehova na-ewe wee dajụọ, ka o wee meere gị ebere,+ gosikwa gị obi ebere ma mee ka ị mụbaa, dị nnọọ ka ọ ṅụụrụ nna nna gị hà n’iyi.+ 18  N’ihi na i kwesịrị ige ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị site n’idebe iwu+ ya niile m na-enye gị taa, ka i wee mee ihe ziri ezi n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji