Diuterọnọmi 17:1-20

17  “Ejila ehi ma ọ bụ atụrụ nke nwere nkwarụ, ya bụ, ihe ọ bụla na-adịghị mma, chụọrọ Jehova bụ́ Chineke gị àjà; n’ihi na ọ bụ ihe arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.+  “Ọ bụrụ na a hụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị nke na-eme ihe ọjọọ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị n’etiti unu iji mebie ọgbụgba ndụ ya,+ n’otu n’ime obodo gị ndị Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị,  o wee gaa fee chi ọzọ ma kpọọrọ ha isiala, ma ọ bụ kpọọrọ anyanwụ ma ọ bụ ọnwa ma ọ bụ ìgwè ihe niile dị n’eluigwe isiala,+ bụ́ ihe m na-enyeghị n’iwu,+  e wee kọọrọ gị ya, i wee nụ ya ma nyochaa ya nke ọma, ma, lee! o doro anya na ọ bụ eziokwu,+ na e mewo ihe arụ a n’Izrel!  ị ga-akpọpụtakwa nwoke ahụ ma ọ bụ nwaanyị ahụ nke mere ihe ọjọọ a n’ọnụ ụzọ ámá gị, ee, nwoke ahụ ma ọ bụ nwaanyị ahụ, ị ga-ejikwa nkume tụgbuo ya.+  N’ọnụ ndị akaebe abụọ ma ọ bụ ndị akaebe atọ+ ka a ga-egbu onye ahụ e kwesịrị igbu. A gaghị egbu ya n’ọnụ otu onye akaebe.+  Ọ bụ ndị akaebe ahụ ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume iji tụgbuo ya, ndị Izrel niile ga-esokwa gị tụọ ya nkume;+ ị ga-ekpochapụkwa ihe ọjọọ n’etiti unu.+  “Ọ bụrụ na okwu ikpe ọ bụla esiere gị oké ike,+ bụ́ nke metụtara mwụfu ọbara,+ nke kpatara ịgba mmadụ akwụkwọ,+ ma ọ bụ nke e mesoro mmadụ ihe ike na ya, okwu metụtara esemokwu,+ n’ime obodo gị, ị ga-ebili gaa n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ,+  ị ga-agakwuru ndị nchụàjà,+ bụ́ ndị Livaị, nakwa onyeikpe+ nke ga na-ekpe ikpe n’oge ahụ, ị ga-ajụkwa ase, ha ga-agwakwa gị ihe ha kpebiri.+ 10  Ị ga-emekwa ihe ha kpebiri, bụ́ nke ha ga-agwa gị n’ebe ahụ Jehova ga-ahọrọ; ị ga-elezikwa anya mee ihe niile ha ga-agwa gị. 11  Dị ka iwu ha ga-eme ka ị mara si dị, dịkwa ka ihe ha kpebiri nke ha ga-agwa gị si dị, otú ahụ ka ị ga-eme.+ Ahapụla ihe ha kpebiri nke ha gwara gị wee gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe.+ 12  Onye ọ bụla nke ga-eme omume mpako wee ghara ige onye nchụàjà ntị, bụ́ onye guzo n’ebe ahụ ijere Jehova bụ́ Chineke gị ozi ma ọ bụ ghara ige onyeikpe ntị,+ onye ahụ ga-anwụ;+ ị ga-ekpochapụkwa ihe ọjọọ n’Izrel.+ 13  Mmadụ niile ga-anụkwa ya wee tụọ egwu,+ ha agaghịkwa eme omume mpako ọzọ. 14  “Mgbe ị ga-emesị bata n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, i wee nweta ya ma biri n’ime ya,+ i wee sị, ‘Ka m meere onwe m eze dị ka mba niile ọzọ gbara m gburugburu’;+ 15  hụ na eze ị ga-emere onwe gị bụ onye Jehova bụ́ Chineke gị ga-ahọrọ.+ Ị ga-esi n’etiti ụmụnne gị meere onwe gị eze. A gaghị ekwe ka i mee onye mba ọzọ nke na-abụghị nwanne gị eze ga-achị gị. 16  Ọ bụ naanị na ọ gaghị eme ka ịnyịnya ya dị ọtụtụ,+ ma ọ bụ mee ka ndị Izrel laghachi n’Ijipt iji mee ka ịnyịnya dị ọtụtụ;+ ebe ọ bụ na Jehova agwawo unu, sị, ‘Ya adịla mgbe unu ga-esi n’ụzọ a laghachi azụ ọzọ.’ 17  Ọ gaghịkwa alụ ọtụtụ ndị inyom, ka obi ya wee ghara ịpụ n’ebe m nọ;+ ọ gaghịkwa eme ka ọlaọcha na ọlaedo ya dị ọtụtụ nke ukwuu.+ 18  Ọ ga-erukwa na mgbe ọ nọkwasịrị n’ocheeze nke alaeze ya, ọ ga-edepụtara onwe ya iwu a n’akwụkwọ site na nke dị n’aka ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị.+ 19  “Ọ ga-adị n’aka ya, ọ ga na-agụ ya n’ụbọchị niile nke ndụ ya,+ ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke ya iji debe ihe niile e kwuru n’iwu a nakwa ụkpụrụ ndị a site n’ime ha;+ 20  ka obi ya wee ghara ịfụli ya elu karịa ụmụnne ya+ nakwa ka ọ ghara ịhapụ ihe e nyere n’iwu gaa n’aka nri ma ọ bụ n’aka ekpe,+ ka ụbọchị ọ ga-achị alaeze ya wee dị ogologo,+ ya na ụmụ ya n’etiti Izrel.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji