Diuterọnọmi 18:1-22
18 “Ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ya bụ, ebo Livaị dum, agaghị enweta òkè ma ọ bụ ihe nketa ọ bụla n’Izrel.+ Àjà Jehova nke a na-esure n’ọkụ, bụ́ ihe nketa ya, ka ha ga na-eri.+
2 N’ihi ya, ọ dịghị ihe nketa ga-abụ nke ya n’etiti ụmụnne ya. Jehova bụ ihe nketa ya,+ dị nnọọ ka ọ gwara ya.
3 “Nke a ga na-abụ ihe ruuru ndị nchụàjà, nke ndị mmadụ ga na-eweta, ya bụ, ndị chụrụ anụ n’àjà, ma ọ̀ bụ ehi ma ọ bụ atụrụ: A ga-enye onye nchụàjà ubu ya na agba ya na afọ ya.
4 Ị ga-enye ya ọka* mbụ gị na mmanya ọhụrụ mbụ gị na mmanụ mbụ gị nakwa ajị anụ mbụ a kpachapụtara n’ìgwè ewu na atụrụ gị.+
5 N’ihi na ọ bụ ya ka Jehova bụ́ Chineke gị họọrọ n’etiti ebo gị niile ka o guzoro na-eje ozi n’aha Jehova, ya na ụmụ ya ndị ikom, mgbe niile.+
6 “Ọ bụrụkwa na onye Livaị apụọ n’otu n’ime obodo gị n’Izrel dum, bụ́ ebe o bitụrụ,+ o wee bịa n’ebe Jehova ga-ahọrọ n’ihi ihe ọ bụla nke na-agụ mkpụrụ obi ya agụụ,+
7 ọ ga-ejekwa ozi n’aha Jehova bụ́ Chineke ya dị ka ụmụnne ya niile, bụ́ ndị Livaị, ndị na-eguzo n’ebe ahụ n’ihu Jehova.+
8 Òkè ọ ga-eri ga-aha ka nke ha,+ ma e wezụga ihe o nwetara ná ngwongwo nna nna ya hà o rere.
9 “Mgbe e mere ka ị banye n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, amụtala ime ihe arụ mba ndị ahụ na-eme.+
10 A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure* nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye na-eme anwansi+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu+ ma ọ bụ dibịa anwansi,+
11 ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase+ ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase.+
12 N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova, ọ bụkwa n’ihi ihe arụ ndị a ka Jehova bụ́ Chineke gị ji na-achụpụ ha n’ihu gị.+
13 Ị gaghị enwe ntụpọ n’ebe Jehova bụ́ Chineke gị nọ.+
14 “N’ihi na mba ndị a ị na-anapụ ala ha na-ege ndị na-eme anwansi+ na ndị na-agba afa ntị; ma gị onwe gị, Jehova bụ́ Chineke gị enyeghị gị ihe ọ bụla yiri nke a.+
15 Jehova bụ́ Chineke gị ga-esi n’etiti ụmụnne gị họpụtara gị onye amụma nke dị ka mụ onwe m—ya ka unu ga-ege ntị+—
16 n’ihi ihe niile ị rịọrọ Jehova bụ́ Chineke gị na Horeb n’ụbọchị unu zukọtara,+ sị, ‘Ka m ghara ịnụ olu Jehova bụ́ Chineke m ọzọ, ka m gharakwa ịhụ oké ọkụ a ọzọ, ka m wee ghara ịnwụ.’+
17 Ya mere, Jehova sịrị m, ‘Ihe ha kwuru dị mma.+
18 M ga-esi n’etiti ụmụnne ha họpụtara ha onye amụma nke dị ka gị onwe gị;+ m ga-etinyekwa okwu m n’ọnụ ya,+ ọ ga-agwakwa ha ihe niile m ga-enye ya n’iwu.+
19 Ọ ga-erukwa na onye na-egeghị ntị n’okwu m ndị ọ ga-ekwu n’aha m, mụ onwe m ga-emekwa ka ọ zaa ajụjụ maka ya.+
20 “‘Otú ọ dị, onye amụma nke ji mpako were aha m kwuo ihe m na-enyeghị ya iwu ka o kwuo,+ ma ọ bụ nke kwuru okwu n’aha chi ọzọ,+ onye amụma ahụ ga-anwụ.+
21 Ọ bụrụkwa na i kwuo n’obi gị, sị: “Olee otú anyị ga-esi mara okwu nke ọ na-abụghị Jehova kwuru?”+
22 mgbe onye amụma ahụ ji aha Jehova kwuo okwu, ma okwu ahụ emeghị, o mezughịkwa, nke ahụ bụ okwu ọ na-abụghị Jehova kwuru. Onye amụma ahụ ji mpako kwuo ya.+ Atụla ya ụjọ.’+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “ime ka ọ gabiga n’ọkụ.”