Diuterọnọmi 23:1-25
23 “Onye ọ bụla a pịrị amụ+ site n’ịkụpịa mkpụrụ amụ ya,+ ma ọ bụ onye e bepụrụ ihe o ji bụrụ nwoke, agaghị abata n’ọgbakọ Jehova.
2 “Nwa ọ bụla a kwatara n’iko+ agaghị abata n’ọgbakọ Jehova. Nwa ya ọ bụla, ọbụna ruo n’ọgbọ nke iri, agaghị abata n’ọgbakọ Jehova.
3 “Onye Amọn ma ọ bụ onye Moab ọ bụla agaghị abata n’ọgbakọ Jehova.+ Nwa ya ọ bụla, ọbụna ruo n’ọgbọ nke iri, agaghị abata n’ọgbakọ Jehova ruo mgbe a na-akaghị aka,
4 n’ihi na ha ejighị achịcha na mmiri bịa nyere unu aka+ n’ụzọ mgbe unu si n’Ijipt na-apụta,+ nakwa n’ihi na ha goro Belam nwa Biọ, onye Pitọ nke Mesopotemia, ka o megide gị wee kọchaa gị.+
5 Jehova bụ́ Chineke gị achọghịkwa ige Belam ntị;+ kama Jehova bụ́ Chineke gị mere ka nkọcha ahụ ghọọrọ gị ngọzi,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị hụrụ gị n’anya.+
6 Emela ihe ga-ewetara ha udo na ọganihu ụbọchị gị niile ruo mgbe a na-akaghị aka.+
7 “Akpọla onye Idọm asị, n’ihi na ọ bụ nwanne gị.+
“Akpọla onye Ijipt asị, n’ihi na ị ghọrọ onye mbịarambịa n’obodo ya.+
8 Ụmụ a ga-amụrụ ha bụ́ ọgbọ nke atọ nwere ike ịbata n’ọgbakọ Jehova.
9 “Ọ bụrụ na ị gaa maa ụlọikwuu iji buso ndị iro gị agha, zere ihe ọjọọ ọ bụla.+
10 Ọ bụrụ na e nwee nwoke na-adịghị ọcha n’etiti unu n’ihi mmerụ a na-enwe n’abalị,+ ọ ga-apụkwa n’ebe unu mara ụlọikwuu. Ọ gaghị abata n’ebe unu mara ụlọikwuu.+
11 Ọ ga-erukwa na n’oge mgbede, ọ ga-eji mmiri saa ahụ́, mgbe anyanwụ dara, ọ ga-abata n’ebe unu mara ụlọikwuu.+
12 Ị ga-enwe ebe ị ga na-eje mposi ná mpụga ebe ị mara ụlọikwuu, ị ga-apụkwa gaa ebe ahụ.
13 Ị ga-eji mbazụ, ya na ihe agha gị, ọ ga-erukwa na mgbe ị ga-etukwuru ala n’ebe mpụga ahụ, ị ga-eji ya gwuo ala ma tụgharịa kpochie nsị gị.+
14 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị na-ejegharị n’ebe ị mara ụlọikwuu ịnapụta gị+ na inyefe ndị iro gị n’aka gị;+ ebe ị mara ụlọikwuu ga-adịkwa nsọ,+ ka o wee ghara ịhụ ihe ọ bụla na-ekwesịghị ekwesị n’ahụ́ gị wee kwụsị iso gị.+
15 “Enyefela ohu n’aka nna ya ukwu mgbe ọ gbapụrụ n’aka nna ya ukwu wee gbakwute gị.+
16 Ọ ga-ebi n’etiti unu n’ebe ọ bụla ọ ga-ahọrọ n’otu n’ime obodo gị,+ n’ebe ọ bụla ọ chọrọ. Emegbula ya.+
17 “Ọ dịghị nwaanyị Izrel ọ bụla ga-abụ akwụna ụlọ arụsị,+ a gaghịkwa enwe onye ọ bụla n’ime ndị ikom Izrel ga-abụ akwụna ụlọ arụsị.+
18 Ewebatala ego a kwụrụ+ nwaanyị akwụna ma ọ bụ ego e retara ná nkịta+ n’ime ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị iji mezuo nkwa ọ bụla, n’ihi na ha bụ ihe arụ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị, ọbụna ha abụọ.
19 “Emela ka nwanne gị kwụọ ọmụrụ nwa,+ ọmụrụ nwa ego, ọmụrụ nwa nri,+ ọmụrụ nwa ihe ọ bụla mmadụ pụrụ ịnara ọmụrụ nwa na ya.
20 I nwere ike ịnara onye mba ọzọ+ ọmụrụ nwa, ma anala nwanne gị ọmụrụ nwa;+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe ọ bụla ị na-eme n’ala ahụ ị na-abanye inweta.+
21 “Ọ bụrụ na i kwe Jehova+ bụ́ Chineke gị nkwa, egbula oge imezu ihe i kwere ná nkwa,+ n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị ga-achọrịrị ka i mezuo ya, ọ ga-aghọkwara gị mmehie.+
22 Ma ọ bụrụ na ọ dịghị nkwa i kwere, ọ gaghị aghọrọ gị mmehie.+
23 Ị ga-emezu ihe egbugbere ọnụ gị kwuru,+ ị ga-emekwa dị nnọọ ka i kwere Jehova bụ́ Chineke gị ná nkwa dị ka onyinye afọ ofufo nke i ji ọnụ gị kwuo.+
24 “Ọ bụrụ na ị banye n’ubi vaịn mmadụ ibe gị, rachaa naanị mkpụrụ vaịn nke ga-eju mkpụrụ obi gị afọ, kama etinyela nke ọ bụla n’ime akpa gị.+
25 “Ọ bụrụ na ị banye n’ọka* kwụ ọtọ nke mmadụ ibe gị, jiri aka ghọrọ naanị oko ọka ndị chara acha, kama emetụla mma owuwe ihe ubi n’ọka kwụ ọtọ nke mmadụ ibe gị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.