Diuterọnọmi 24:1-22

24  “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, o wee bụrụ nwunye ya, ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ihe ya amasịkwaghị di ya n’ihi na ọ chọpụtawo ihe na-ekwesịghị ekwesị n’ebe nwaanyị ahụ nọ,+ nwoke ahụ ga-edekwara ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm+ ma were ya nye ya n’aka, wee chụpụ ya n’ụlọ ya.+  Ọ ga-esikwa n’ụlọ ya pụọ gaa ghọọ nwunye nwoke ọzọ.+  Ọ bụrụ na nwoke nke abụọ a akpọọkwa ya asị wee deere ya akwụkwọ ịgba alụkwaghịm ma were ya nye ya n’aka, chụpụkwa ya n’ụlọ ya, ma ọ bụ, ọ bụrụ na nwoke nke abụọ a nke lụrụ ya anwụọ,  a gaghị ekwe ka nwoke mbụ ahụ nke lụrụ ya, bụ́ onye chụpụrụ ya, kpọrọghachi ya ka ọ bụrụ nwunye ya mgbe e merụsịworo ya;+ n’ihi na nke ahụ bụ ihe arụ n’anya Jehova, emekwala ka ala nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka ọ bụrụ ihe nketa gị mehie.  “Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị ọhụrụ,+ ọ gaghị eso ndị agha gaa agha, ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ a ga-amanye ya ime. Ọ ga-anọ n’ụlọ ya ma bụrụ onye a gụpụrụ ịrụ ọrụ ruo otu afọ, ọ ga-emekwa ka nwunye ọ lụrụ ṅụrịa ọṅụ.+  “Ọ dịghị onye ga-eburu nkume igwe nri ma ọ bụ aka nkume igwe nri dị ka ihe ibé,+ n’ihi na ọ bụ mkpụrụ obi ka ọ na-eburu dị ka ihe ibé.  “Ọ bụrụ na a hụ mmadụ ka ọ na-atọrọ+ mkpụrụ obi otu n’ime ụmụnne ya n’etiti ụmụ Izrel, ọ bụrụkwa na o mesowo ya ihe n’aka ike wee ree ya,+ onye ahụ nke tọọrọ mmadụ ga-anwụ. Ị ga-ekpochapụkwa ihe ọjọọ n’etiti unu.+  “Kpachara anya maka ihe otiti ekpenta+ ka i wee lezie anya nke ọma mee ihe niile ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ga-agwa gị.+ Dị nnọọ ka m nyere ha n’iwu, otú ahụ ka unu ga-elezi anya+ mee.  Ị ga na-echeta ihe Jehova bụ́ Chineke gị mere Miriam n’ụzọ, mgbe unu si n’Ijipt na-apụta.+ 10  “Ọ bụrụ na ị gbazinye mmadụ ibe gị ụdị ihe ọ bụla,+ abanyela n’ụlọ ya ịnara ya ihe o ji gbaa ibé.+ 11  Ị ga-eguzo n’èzí, onye ahụ ị gbazinyere ihe ga-ewetara gị ihe ibé ahụ n’èzí. 12  Ọ bụrụkwa na onye ahụ nọ ná nsogbu, ejila ihe ibé ya laba ụra.+ 13  Hụ na i weghachiiri ya ihe ibé ya ozugbo anyanwụ dara,+ ọ ga-eyi uwe ya laba ụra,+ ọ ga-agọzikwa+ gị; ọ ga-abụkwara gị ezi omume n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.+ 14  “Erigbula onye ọrụ e goro ego nke nọ ná nsogbu, nke dakwara ogbenye, ma ọ bụ otu n’ime ụmụnne gị ma ọ bụ otu n’ime ndị mbịarambịa, bụ́ ndị nọ n’ala gị, n’ime obodo gị.+ 15  N’otu ụbọchị ahụ ka ị ga-enye ya ụgwọ ọrụ ya,+ ị ga-ewere ya nye ya tupu anyanwụ adaa, n’ihi na ọ nọ ná nsogbu, ọ bụkwa ụgwọ ọrụ ya ka mkpụrụ obi ya chekwubere; ka o wee ghara itiku Jehova n’ihi gị,+ ọ ga-aghọkwara gị mmehie.+ 16  “A gaghị egbu ndị bụ́ nna n’ihi ụmụ ha, a gaghịkwa egbu ụmụ n’ihi nna ha.+ A ga-egbu onye nke ọ bụla n’ihi mmehie nke ya.+ 17  “Agbagọla ikpe nke onye mbịarambịa+ ma ọ bụ nke nwa na-enweghị nna,+ achịrịla uwe nwaanyị di ya nwụrụ dị ka ihe ibé.+ 18  Ị ga-echetakwa na ị ghọrọ ohu n’Ijipt, Jehova bụ́ Chineke gị wee napụta gị n’ebe ahụ.+ Ọ bụ ya mere m ji enye gị iwu ka i mee ihe a. 19  “Ọ bụrụ na i wee ihe ubi n’ubi gị, i wee chefuo otu ùkwù ọka* n’ubi,+ agaghachila ibute ya. Ọ ga-adịrị onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ;+ ka Jehova bụ́ Chineke gị wee gọzie gị n’ihe niile aka gị na-eme.+ 20  “Ọ bụrụ na ị kụtusịa mkpụrụ dị n’osisi oliv gị, agaghachila ịkụtu ya ọzọ. Ọ ga-adịrị onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ.+ 21  “Ọ bụrụ na ị chịkọta mkpụrụ vain dị n’ubi vaịn gị, agaghachila ịchịkọta ndị fọrọ afọ. Ha ga-adịrị onye mbịarambịa, nwa na-enweghị nna nakwa nwaanyị di ya nwụrụ. 22  Ị ga-echetakwa na ị ghọrọ ohu n’ala Ijipt.+ Ọ bụ ya mere m ji enye gị iwu ka i mee ihe a.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.