Diuterọnọmi 33:1-29
33 Nke a bụ ngọzi+ nke Mozis bụ́ onye nke ezi Chineke+ gọziri ụmụ Izrel tupu ya anwụọ.
2 O wee sị:“Jehova si na Saịnaị bịa,+O sikwa na Sia nwukwasị ha dị ka ìhè.+O si n’ógbè Peran nke bụ́ ugwu ugwu nwuo dị ka ìhè,+Ìgwè ndị nsọ sokwa ya,+Ndị dike ha nọkwa ya n’aka nri.+
3 Ọ hụkwara ndị ya n’anya;+Ndị nsọ ha niile nọ gị n’aka.+Ha onwe ha nọ ọdụ n’ụkwụ gị;+Ha malitere ịnụ ụfọdụ n’ime okwu gị.+
4 (Mozis nyere anyị iwu anyị ga-edebe,+Nke bụ́ ihe nketa nke ọgbakọ Jekọb.)+
5 O wee ghọọ eze na Jeshurọn,+Mgbe ndị isi nke ndị ahụ gbakọtara,+Bụ́ ebo niile nke Izrel.+
6 Ka Ruben dị ndụ ma ghara ịnwụ,+Ka ndị ya gharakwa ịfọdụ ole na ole.”+
7 Nke a bụ ngọzi ọ gọziri Juda,+ ka ọ gara n’ihu ịsị:“Jehova, biko, nụrụ olu Juda,+Kpọrọ ya gakwuru ndị ya.Ogwe aka ya alụworo ihe ya ọgụ;Bụrụ onye enyemaka nke na-anapụta ya n’aka ndị na-emegide ya.”+
8 O kwukwara banyere Livaị, sị:+“Tọmịm gị na Yurim+ gị dịịrị onye na-eguzosi ike n’ebe ị nọ,+Onye i lere ule na Masa.+Ị malitere ịgbaso ya mgba n’akụkụ mmiri Meriba,+
9 Onye sịrị banyere nna ya na nne ya, ‘Ahụbeghị m ha.’Ọ mataghị ọbụna ụmụnne ya.+Ọ maghịkwa ụmụ ya.N’ihi na ha debere okwu gị,+Ha nọkwa na-edebe ọgbụgba ndụ gị.+
10 Ka ha kụziere Jekọb mkpebi ikpe gị,+Kụziekwara Izrel iwu gị.+Ka ha suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ka ọ banye n’oghere imi gị,+Chụọkwa onyinye a na-esurecha n’ọkụ n’àjà n’ebe ịchụàjà gị.+
11 Jehova, biko, gọzie ike ya,+Nweekwa obi ụtọ n’ihe aka ya na-eme,+Kụjie ndị na-ebili imegide ya úkwù,+Nakwa ndị kpọrọ ya oké asị, ka ha ghara ibili ọtọ.”+
12 O kwuru banyere Benjamin, sị:+“Ka onye Jehova hụrụ n’anya+ biri n’akụkụ ya n’obi iru ala,+Ka ya onwe ya na-echebe ya ogologo ụbọchị niile,+Ọ ga-ebikwa n’agbata ubu ya abụọ.”+
13 O kwukwara banyere Josef, sị:+“Ka ala ya na-abụ nke Jehova ji ihe ọma dị iche iche nke eluigwe gọzie,+Bụ́ igirigi,+Na ogbu mmiri nke dị n’ime ala,+
14 Na ihe ọma dị iche iche, bụ́ ihe anyanwụ na-eme ka e nweta,+Na ihe ọma dị iche iche, bụ́ mkpụrụ na-amị n’ọnwa n’ọnwa,+
15 Na ihe kasị mma ndị si n’ugwu ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ,+Na ihe ọma nke ugwu nta ndị na-adịru mgbe a na-akaghị aka.
16 Na ihe ọma dị iche iche nke ụwa na ihe jupụtara n’ime ya,+Tinyere amara nke Onye ahụ bi n’osisi ogwu.+Ka ha dị n’isi Josef+Nakwa n’opu isi nke onye e si n’etiti ụmụnne ya họrọ.+
17 Ịma mma ya dị ka nke oké ehi e bu ụzọ mụọ,Mpi ya bụkwa mpi atụ́.+Ọ ga-eji ha na-asọ ndị dị iche iche,+Sọrọ ha niile ruo na nsọtụ ụwa,Ha bụkwa iri puku kwuru iri puku nke Ifrem,+Ha bụkwa puku kwuru puku nke Manase.”
18 O kwukwara banyere Zebulọn, sị:+“Zebulọn, ṅụrịa ọṅụ n’ọpụpụ gị,+Ịsaka, ṅụrịakwa ọṅụ n’ụlọikwuu gị.+
19 Ha ga-akpọ ndị dị iche iche ka ha bịa n’ugwu.N’ebe ahụ ka ha ga-achụ àjà ezi omume.+N’ihi na ha ga-amịrị akụ̀ dị ukwuu dị n’oké osimiri dị iche iche,+Nakwa ihe zoro ezo a kwakọbara n’ájá.”
20 O kwukwara banyere Gad, sị:+“Onye a gọziri agọzi ka onye na-eme ka ókèala Gad saa mbara bụ.Ọ ga-ebi dị ka ọdụm,+Ọ ga-adọwakwa ogwe aka, ee, dọwaa opu isi.+
21 Ọ ga-ahọtakwara onwe ya òkè nke mbụ,+N’ihi na n’ebe ahụ ka e debere òkè nke onye na-enye iwu.+Ndị isi nke ndị Izrel ga-ezukọta.Ezi omume Jehova ka ọ ga-eme,Meekwa ihe o kpere n’ikpe n’ebe Izrel nọ.”
22 O kwukwara banyere Dan, sị:+“Dan bụ nwa ọdụm.+Ọ ga-esi na Beshan mapụta.”+
23 O kwukwara banyere Naftalaị, sị:+“Amara ejuwo Naftalaị afọ,O jupụtakwara ná ngọzi Jehova.Nweta ebe ọdịda anyanwụ na ebe ndịda.”
24 O kwukwara banyere Asha, sị:+“Onye e ji ụmụ gọzie ka Asha bụ.+Ka ọ ghọọ onye ihe ya masịrị ụmụnne ya,+Onye na-azọnye ụkwụ ya na mmanụ.+
25 Ígwè na ọla kọpa bụ ihe i ji akpọchi ọnụ ụzọ ámá gị,+Dị ka ụbọchị i nwere hà, otú ahụ ka ị na-atụsara ahụ́ aga ije.
26 Ọ dịghị onye dị ka ezi Chineke+ nke Jeshurọn,+Onye nọkwasịrị n’eluigwe dị ka ịnyịnya iji nyere gị aka,+Nakwa n’ígwé ojii n’ịdị ukwuu ya.+
27 Chineke nke dị adị site n’oge ochie bụ ebe nzuzo,+Ogwe aka nke na-adịru mgbe ebighị ebi dịkwa n’okpuru.+Ọ ga-achụpụkwa onye iro n’ihu gị,+Ọ ga-asịkwa, ‘Laa ha n’iyi!’+
28 Izrel ga-ebikwa n’obi iru ala,+Isi iyi Jekọb ga-anọrọ onwe ya,+N’ala nke ọka* na mmanya ọhụrụ.+Ee, eluigwe ya ga-eme ka igirigi daa.+
29 Obi ụtọ na-adịrị gị, Izrel!+Ònye dị ka gị,+Bụ́ ndị Jehova na-azọpụta,+Onye bụ́ ọta nke na-enyere gị aka,+Onye bụkwa mma agha gị nke dị ebube?+Ya mere, ndị iro gị ga-atụ egwu n’ihu gị,+Gị onwe gị ga-azọda ebe ndị dị elu ha.”+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.