Diuterọnọmi 34:1-12

34  Mozis wee si na mbara ọzara Moab gbagoo n’Ugwu Nibo,+ n’elu Pisga,+ nke chere ihu na Jeriko.+ Jehova wee gosi ya ala ahụ dum, Gilied ruo Dan,+  na Naftalaị dum nakwa ala Ifrem na Manase nakwa ala Juda dum ruo n’oké osimiri nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ,+  nakwa ala Negeb na Ógbè Jọdan,+ bụ́ ndagwurugwu* Jeriko, obodo nkwụ,+ ruo Zoa.+  Jehova wee sị ya: “Nke a bụ ala ahụ m ṅụụrụ Ebreham, Aịzik na Jekọb iyi inye ha, sị, ‘Mkpụrụ gị ka m ga-enye ya.’+ Emewo m ka i jiri anya gị hụ ya, n’ihi na ị gaghị agafe wee ruo ebe ahụ.”+  E mesịa, Mozis bụ́ ohu Jehova+ nwụrụ n’ebe ahụ n’ala Moab dị ka Jehova nyere n’iwu.+  O wee lie ya na ndagwurugwu dị n’ala Moab n’ihu Bet-piọ,+ ọ dịghịkwa onye maara ili ya ruo taa.+  Mozis gbara otu narị afọ na iri abụọ mgbe ọ nwụrụ.+ Anya ya adịghị ahụ inyoghi inyoghi,+ ume ka dịkwa ya n’ahụ́.  Ụmụ Izrel wee kwaara Mozis ákwá ụbọchị iri atọ na mbara ọzara Moab.+ E mesịa, ụbọchị niile ha ji kwaara Mozis ákwá ma ruoro ya uju gwụchara.  Jọshụa nwa Nọn jupụtara na mmụọ amamihe,+ n’ihi na Mozis bikwasịrị ya aka n’isi;+ ụmụ Izrel wee malite ige ya ntị, ha wee malite ime dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.+ 10  Ma e nwetụbeghị onye amụma biliri n’Izrel nke dị ka Mozis,+ onye Jehova maara ihu na ihu,+ 11  n’ihe banyere ihe ịrịba ama na ọrụ ebube niile Jehova dunyere ya ka ọ rụọ n’ala Ijipt, n’ahụ́ Fero nakwa n’ahụ́ ndị niile na-ejere ya ozi nakwa n’ala ya dum,+ 12  nakwa n’ihe banyere aka dum dị ike nakwa ọrụ dum dị ike Mozis rụrụ n’ihu Izrel dum.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”