Diuterọnọmi 7:1-26
7 “Mgbe Jehova bụ́ Chineke gị ga-emesị kpọbata gị n’ala ahụ ị na-abanye inweta,+ ọ ga-ekpochapụ mba ndị nwere ụba mmadụ n’ihu gị,+ bụ́ ndị Het+ na ndị Gegash+ na ndị Amọraịt+ na ndị Kenan+ na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt+ na ndị Jibọs,+ mba asaa ndị nwere ụba mmadụ ma dị ike karịa gị.+
2 Jehova bụ́ Chineke gị ga-enyefe ha n’aka gị, ị ga-emerikwa ha.+ Hụ na i bibiri ha.+ Gị na ha agbala ndụ, emekwarala ha amara ọ bụla.+
3 Gị na ha agọkwala ọgọ. Akpọrọla nwa gị nwaanyị kpọnye nwa ya nwoke, alụtarala nwa gị nwoke nwa ya nwaanyị.+
4 N’ihi na ọ ga-eme ka nwa gị nwoke kwụsị iso m, ha ga-efekwa chi ọzọ dị iche iche;+ Jehova ga-ewesokwa unu iwe dị ọkụ, ọ ga-alakwa gị n’iyi ọsọ ọsọ.+
5 “N’aka nke ọzọ, nke a bụ ihe unu ga-eme ha: Unu ga-akwatusị ebe ịchụàjà ha,+ unu ga-akụtusịkwa ogidi nsọ ha,+ unu ga-akwatusịkwa+ ogwe osisi ha dị nsọ,+ unu ga-akpọkwa ihe oyiyi ha a pịrị apị ọkụ.+
6 N’ihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Jehova bụ́ Chineke unu.+ Ọ bụ unu ka Jehova bụ́ Chineke unu họọrọ ịbụ ndị ya, bụ́ ihe onwunwe pụrụ iche, n’etiti ndị niile nọ n’elu ala.+
7 “Ọ bụghị maka na unu kasị ndị niile nwee ụba mmadụ mere Jehova ji hụ unu n’anya nke ukwuu wee họrọ unu,+ n’ihi na ọ bụ unu kasị nta ná ndị niile.+
8 Kama ọ bụ n’ihi na Jehova hụrụ unu n’anya,+ nakwa na ọ na-edebe iyi ọ ṅụụrụ nna nna unu hà,+ mere Jehova ji jiri aka dị ike kpọpụta unu,+ ka o wee napụta unu n’ụlọ ndị ohu,+ n’aka Fero eze Ijipt.
9 Ị makwaara nke ọma na Jehova bụ́ Chineke gị bụ ezi Chineke,+ Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye na-edebere ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe ihe o nyere n’iwu ọgbụgba ndụ+ ya ma na-egosi ha obiọma* ruo otu puku ọgbọ,+
10 ma na-akwụ onye ahụ n’onwe ya nke kpọrọ ya asị ụgwọ site n’ibibi ya.+ Ọ gaghị ala azụ ime onye kpọrọ ya asị ihe; ọ ga-akwụ onye ahụ n’onwe ya ụgwọ.
11 Debekwanụ iwu na ụkpụrụ na mkpebi ikpe ndị m na-enye unu taa site n’ime ha.+
12 “Ọ ga-erukwa na, n’ihi na unu na-ege ntị ná mkpebi ikpe ndị a, na-edebekwa ha ma na-eme ha,+ Jehova bụ́ Chineke gị ga-edebere gị ọgbụgba ndụ+ na obiọma, bụ́ ndị ọ ṅụụrụ nna nna gị hà n’iyi.+
13 Ọ ga-ahụ gị n’anya ma gọzie+ gị, meekwa ka ị mụbaa,+ ọ ga-agọzikwa mkpụrụ nke afọ+ gị na mkpụrụ nke ala+ gị, ọka* gị na mmanya ọhụrụ gị na mmanụ gị, obere ụmụ ehi gị na ụmụ ìgwè ewu na atụrụ gị,+ n’ala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna gị hà iyi inye gị.+
14 Ị ga-aghọ onye a kasị gọzie agọzi n’etiti ndị niile.+ Ọ dịghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị nọ n’ime gị nke na-agaghị amụta nwa, ọ dịghịkwa anụ ụlọ gị nke na-agaghị amụta nwa.+
15 Jehova ga-ewepụrụ gị ọrịa niile; ọ gaghị eme ka ị rịa ọrịa ọjọọ niile nke Ijipt bụ́ ndị ị maara,+ ma ọ ga-eme ka ndị niile kpọrọ gị asị rịa ha.
16 Ị ga-ekpochapụkwa ndị niile Jehova bụ́ Chineke gị na-enyefe gị.+ Anya gị emerela ha ebere;+ efekwala chi ha dị iche iche ofufe,+ n’ihi na nke ahụ ga-abụrụ gị ọnyà.+
17 “Ọ bụrụ na i kwuo n’obi gị, sị, ‘Mba ndị a nwere nnọọ ụba mmadụ karịa m. Olee otú m ga-esi nwee ike ịchụpụ ha?’+
18 atụla ha egwu.+ Hụ na i chetara ihe Jehova bụ́ Chineke gị mere Fero na Ijipt dum,+
19 oké ihe nnwapụta ndị anya gị hụrụ,+ na ihe ịrịba ama na ọrụ ebube+ na aka dị ike+ na ogwe aka a gbatịrị agbatị+ Jehova bụ́ Chineke gị ji kpọpụta gị.+ Otú ahụ ka Jehova bụ́ Chineke gị ga-eme ndị niile ị na-atụ egwu.+
20 Jehova bụ́ Chineke gị ga-emekwa ka ha nwee nkụda mmụọ,+ ruo mgbe ndị fọdụrụ+ na ndị na-ezopụ n’ihu gị lara n’iyi.
21 Amala jijiji n’ihi ha, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị nọ n’etiti unu,+ ọ bụ Chineke dị ukwuu ma dị egwu.+
22 “Jehova bụ́ Chineke gị ga-ejikwa nke nta nke nta kwapụ mba ndị a n’ihu gị.+ A gaghị ekwe ka i kpochapụ ha ọsọ ọsọ, ka anụ ọhịa wee ghara ịmụba wee wakpo gị.
23 Jehova bụ́ Chineke gị ga-enyefekwa ha n’aka gị ma chụsasịa ha, ha ewee nọrọ n’ọgba aghara, ruo mgbe a lara ha n’iyi.+
24 Ọ ga-enyefekwa eze ha n’aka gị, ị ga-ekpochapụ aha ha n’okpuru eluigwe.+ Ọ dịghị onye ga-eguzosi ike n’ihu gị,+ ruo mgbe i kpochapụrụ ha.
25 Ị ga-akpọ ihe oyiyi a pịrị apị nke chi ha ọkụ.+ Ka agụụ ọlaọcha na ọlaedo dị na ha ghara ịgụ gị,+ ewerekwala ya, ka ọ ghara ịmata gị n’ọnyà;+ n’ihi na ọ bụ ihe arụ+ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.
26 Ewebatala ihe arụ n’ụlọ gị, i wee ghọọ ihe a ga-ebibi ebibi dị ka ya. Ị ga-asọ ya oyi nke ukwuu ma kpọ ya ajọ asị,+ n’ihi na ọ bụ ihe a ga-ebibi ebibi.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”
^ Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.