Diuterọnọmi 8:1-20
8 “Lezie anya idebe+ iwu niile m na-enye gị taa, ka unu wee dịrị ndụ+ ma mụbaa, banyekwa nweta ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi inye ha.+
2 Cheta ụzọ niile Jehova bụ́ Chineke gị mere ka i jegharịa n’ala ịkpa n’ime afọ iri anọ ndị a,+ iji mee ka ị dị umeala,+ iji lee gị ule+ ka ọ mara ihe dị gị n’obi,+ iji mara ma ị̀ ga-edebe ihe o nyere n’iwu ma ọ bụ na ị gaghị edebe.
3 O wee zụọ gị ka ị dị umeala ma mee ka agụụ+ gụọ gị wee nye gị mana,+ nke gị onwe gị ma ọ bụ nna gị hà na-amaghị; iji mee ka ị mara na ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta ga-eme ka mmadụ dị ndụ.+
4 Ákwà i gbokwasịrị n’ahụ́ akaghị nká, ụkwụ gị azaghịkwa aza n’ime afọ iri anọ ndị a.+
5 Ị makwaara nke ọma n’obi gị na dị nnọọ ka mmadụ si agbazi nwa ya nwoke, otú ahụ ka Jehova bụ́ Chineke gị nọ na-agbazi gị.+
6 “Debe ihe Jehova bụ́ Chineke gị nyere n’iwu site n’ije ije n’ụzọ+ ya nakwa site n’ịtụ egwu ya.+
7 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị na-akpọbata gị n’ezi ala,+ bụ́ ala jupụtara na ndagwurugwu* ndị mmiri dị, isi iyi na ogbu mmiri ndị na-asọpụta n’ala dị larịị+ nakwa n’ógbè bụ́ ugwu ugwu,
8 ala ọka wit na ọka bali na mkpụrụ vaịn na mkpụrụ fig na mkpụrụ pọmigranet,+ ala mmanụ oliv na mmanụ aṅụ,+
9 ala nke ị ga-eri nri n’anọghị n’ụkọ, ala nke ọ na-enweghị ihe ga-akọ gị na ya, nke nkume ya bụ ígwè, nke ị ga na-egwupụtakwa ọla kọpa n’ugwu ya.
10 “Mgbe i riri ihe wee rijuo afọ,+ ị ga-agọzi+ Jehova bụ́ Chineke gị n’ihi ezi ala nke o nyere gị.+
11 Lezie anya ka ị ghara ichefu+ Jehova bụ́ Chineke gị, i wee ghara idebe ihe o nyere n’iwu na mkpebi ikpe ya na ụkpụrụ ya ndị m na-enye gị taa;+
12 ka i wee ghara iri ihe ma rijuo nnọọ afọ, i wee wuo ụlọ ọma ma biri n’ime ha,+
13 ìgwè ehi gị na ìgwè ewu na atụrụ gị ewee mụbaa, i wee nwee ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo, ihe niile i nwere ewee dị ọtụtụ;
14 obi gị ewee fụlie gị elu,+ i wee chefuo Jehova bụ́ Chineke gị, onye kpọpụtara gị n’ala Ijipt, n’ụlọ ndị ohu;+
15 onye mere ka i jiri ụkwụ gafee nnukwu ala ịkpa nke dị egwu,+ ebe e nwere agwọ ọjọọ+ nakwa akpị, ebe bụkwa ala kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị; onye mere ka mmiri si n’oké nkume siri ike gbapụtara gị;+
16 onye nyere gị mana+ ka i rie n’ala ịkpa, bụ́ nke nna gị hà na-amaghị, iji mee ka ị dị umeala+ nakwa iji lee gị ule ka o wee meere gị ihe ọma n’ikpeazụ;+
17 i wee sị n’obi gị, ‘Ọ bụ ike m na ọkpụkpụ aka m kpataara m akụ̀ a.’+
18 Ị ga-echeta Jehova bụ́ Chineke gị, n’ihi na ọ bụ ya na-enye gị ike i ji akpata akụ̀;+ ka o wee debe ọgbụgba ndụ ya nke ọ ṅụụrụ nna nna gị hà n’iyi, dị ka ọ dị taa.+
19 “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na ị nwaa anwa chefuo Jehova bụ́ Chineke gị, i wee soro chi ọzọ ma fee ha ofufe, kpọọkwara ha isiala, ana m agbara unu àmà taa na unu ga-alarịrị n’iyi.+
20 Dị ka mba ndị Jehova na-ebibi n’ihu unu, otú ahụ ka unu ga-ala n’iyi, n’ihi na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mbara ala nke dị na ndagwurugwu.”