Emọs 3:1-15

3  “Nụrụnụ ihe a Jehova kwuru banyere unu,+ unu ụmụ Izrel, banyere ezinụlọ dum m si n’ala Ijipt kpọpụta,+ sị,  ‘Ọ bụ naanị unu ka m maara+ n’ime ezinụlọ niile dị n’elu ala.+ Ọ bụ ya mere m ga-eji mee ka unu zaa ajụjụ maka njehie unu niile.+  “‘Mmadụ abụọ hà ga-agakọ ije ma ọ bụrụ na ha eyighị agba wee zukọta?+  Ọdụm ọ̀ ga-ebigbọ n’oké ọhịa ma ọ bụrụ na o nweghị anụ o gbutere?+ Ọdụm tojuru etoju ọ̀ ga-eme ka olu ya daa ụda n’ebe o zoro ma ọ bụrụ na ọ nwụdeghị ihe ọ bụla?  Nnụnụ ọ̀ ga-ama n’ọnyà n’elu ala ma ọ bụrụ na ọ dịghị ọnyà e siiri ya?+ Ọnyà ọ̀ ga-akụchi ma ọ bụrụ na ọ mataghị ihe ọ bụla?  Ọ bụrụ na a fụọ opi n’obodo, ọ̀ bụ na ndị mmadụ adịghị ama jijiji?+ Ọ bụrụ na e nwee ọdachi n’obodo, ọ́ bụghị Jehova mere ihe?  N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ kpugheere ndị ohu ya, bụ́ ndị amụma, ihe nzuzo ya.+  Ọdụm ebigbọwo!+ Olee onye na-agaghị atụ egwu? Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ekwuwo okwu! Olee onye na-agaghị ebu amụma?’+  “‘Kwusaanụ ya n’ụlọ elu niile dị n’Ashdọd nakwa n’ụlọ elu niile dị n’ala Ijipt,+ sị: “Zukọtanụ megide ugwu niile nke Sameria,+ hụkwanụ ọgba aghara jupụtara n’ime ya na nrigbu a na-erigbu ndị mmadụ n’ime ya.+ 10  Ha amaghị otú e si eme ihe ziri ezi,”+ ka Jehova kwuru, “bụ́ ndị na-eme ka ụlọ elu ha jupụta n’ime ihe ike+ na ibụkọrọ ihe ndị mmadụ.”’ 11  “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘E nwere onye iro gburugburu ala ahụ.+ Ọ ga-emekwa ka ike gwụ gị. A ga-ebukọrọkwa ihe ndị dị n’ụlọ elu gị niile.’+ 12  “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ na-anapụta ụkwụ anụ abụọ ma ọ bụ otu ibe ntị n’ọnụ ọdụm,+ otú ahụ ka a ga-anapụta ụmụ Izrel, ya bụ, ndị nọ ọdụ n’ime Sameria n’elu oche mara mma+ nakwa n’ihe ndina+ nke Damaskọs.’ 13  “‘Nụrụnụ, gbaakwanụ akaebe+ n’ụlọ Jekọb,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha, kwuru. 14  ‘N’ihi na n’ụbọchị m ga-eme ka Izrel zaa ajụjụ+ maka inupụrụ ya isi, m ga-emekwa ka ebe ịchụàjà Betel zaa ajụjụ.+ A ga-egbujipụ mpi ebe ịchụàjà, ọ ga-adakwa n’ala.+ 15  M ga-akwatu ụlọ a na-anọ n’oge oyi+ nakwa ụlọ a na-anọ n’oge okpomọkụ.’+ “‘Ụlọ ndị e ji ọdụ́ rụọ ga-alakwa n’iyi,+ a ga-ebibikwa ọtụtụ ụlọ,’+ ka Jehova kwuru.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji