Maịka 5:1-15

5  “Ugbu a, ị na-ebekasị onwe gị ahụ́,+ gị obodo a wakporo awakpo; ọ nọchibidowo anyị.+ Ha ga-akụ onyeikpe nke Izrel mkpara na ntì.+  “Ma gị onwe gị, Betlehem Efrata,+ obodo kachasị nta n’obodo ndị dị na Juda,+ ọ bụ n’ime gị+ ka onye ga-aghọ onye ọchịchị n’Izrel ga-esi pụta wee bịakwute m,+ onye malitere n’oge ochie, n’oge a na-amaghị ama gara aga.+  “Ya mere, ọ ga-agbahapụ ha+ ruo mgbe nwaanyị na-amụ nwa mụpụtara nwa.+ Ndị fọdụrụ n’ime ụmụnne ya ga-alọghachikwute ụmụ Izrel.  “Ọ ga-ebili ma jiri ike Jehova zụọ atụrụ,+ jirikwa ịdị ukwuu nke aha Jehova bụ́ Chineke ya zụọ ha.+ Ha ga-ebiri n’ebe ahụ,+ n’ihi na ọ ga-abụ onye ukwu ruo na nsọtụ niile nke ụwa.+  Onye a ga-abụ udo.+ Ma mgbe onye Asiria batara n’ala anyị, mgbe ọ zọdara ụlọ elu anyị,+ anyị ga-eme ka ndị ọzụzụ atụrụ asaa, ee, ndị isi asatọ n’etiti ụmụ mmadụ, bilie imegide ya.  Ha ga-ejikwa mma agha zụọ ala Asiria dị ka atụrụ,+ zụọkwa ala Nimrọd+ n’ebe niile e si abanye ya. Ọ ga-anapụtakwa anyị n’aka onye Asiria ahụ,+ mgbe ọ batara n’ala anyị, mgbe ọ zọkwara ụkwụ n’ókèala anyị.  “Ndị fọdụrụ n’ụlọ Jekọb+ ga-adị ka igirigi nke si n’ebe Jehova nọ+ n’etiti ọtụtụ ndị, dị ka mmiri na-ezosi ike n’elu ahịhịa,+ bụ́ nke na-adịghị adabere n’ebe mmadụ nọ, nke na-adịghịkwa echere ụmụ mmadụ.+  Ndị fọdụrụ n’ụlọ Jekọb ga-adị n’etiti mba dị iche iche, n’etiti ọtụtụ ndị, dị ka ọdụm nke nọ n’etiti anụ ọhịa, ha ga-adịkwa ka nwa ọdụm tojuru etoju nke nọ n’etiti ìgwè atụrụ, nke ọ na-abụ ọ na-agafe, ya ana-azọpịa ma na-adọri anụ;+ e nweghịkwa onye nnapụta ọ bụla.  Aka gị ga-adị elu karịa ndị iro gị,+ a ga-ebipụkwa ndị iro gị niile.”+ 10  “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ,” ka Jehova kwuru, “na m ga-ebipụ ịnyịnya gị, bibiekwa ụgbọ ịnyịnya gị.+ 11  M ga-ebipụkwa obodo ndị dị n’ala gị, kwatuokwa ebe gị niile e wusiri ike.+ 12  M ga-ekpochapụ ịgba afa n’ime gị, ị gaghị enwekwa onye ọ bụla nke na-eme anwansi.+ 13  M ga-ebipụkwa ihe oyiyi a pịrị apị na ogidi n’ime gị, ị gakwaghị akpọrọ ọrụ aka gị isiala.+ 14  M ga-efopụ ogwe osisi gị ndị dị nsọ+ n’ime gị, laakwa obodo gị niile n’iyi. 15  M ga-eji iwe na ọnụma bọọ ọbọ n’ahụ́ mba ndị na-erubeghị isi.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji