Ndị Filipaị 2:1-30

2  Ya mere, ọ bụrụ na e nwere agbamume ọ bụla n’ime Kraịst,+ ọ bụrụ na e nwere ngụgụ obi ọ bụla nke ịhụnanya, ọ bụrụ na e nwere mmụọ ọ bụla nke ichebara ibe unu echiche,+ ọ bụrụ na e nwere obi ọmịiko+ na obi ebere ọ bụla,  meenụ ka ọṅụ m zuo ezu site n’inwe otu obi+ nakwa inwe otu ịhụnanya, bụrụ ndị e jikọrọ ná mkpụrụ obi, na-eburu otu echiche ahụ n’uche,+  ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu+ ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi,+ kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu,+  na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu,+ kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.+  Nweenụ ụdị echiche a n’ime onwe unu bụ́ nke Kraịst Jizọs nwekwara,+  onye dịrị n’ụdị Chineke,+ ma o cheghị echiche ịnara ọkwá n’ike, ya bụ, ka ọ hara ka Chineke.+  Ee e, kama o mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu,+ wee dịrị n’oyiyi mmadụ.+  Mgbe ọ hụrụ onwe ya n’ụdị mmadụ,+ o wedara onwe ya ala wee rube isi ruo ọnwụ,+ ee, ọnwụ n’osisi ịta ahụhụ.+  N’ihi nke a, Chineke buliri ya elu ka ọ nọrọ n’ọkwá ka elu,+ o jikwa obiọma nye ya aha dị elu karịa aha ọ bụla ọzọ,+ 10  ka ikpere ọ bụla wee gbuo n’ala n’aha Jizọs, ma nke ndị nọ n’eluigwe ma nke ndị nọ n’elu ụwa ma nke ndị nọ n’okpuru ala,+ 11  ka ire ọ bụla wee kwupụtakwa+ na Jizọs Kraịst bụ Onyenwe anyị+ iji wetara Chineke bụ́ Nna otuto.+ 12  N’ihi ya, ndị m hụrụ n’anya, otú ahụ unu si na-erube isi mgbe niile,+ ọ bụghị naanị mgbe m nọ ya, kama ugbu a m na-anọghị ya, na-erubenụ isi karị, jirinụ egwu+ na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta; 13  n’ihi na ọ bụ Chineke na-arụ ọrụ n’ime unu,+ n’ihi ihe dị ya ụtọ, ka unu wee na-enwe ọchịchọ ma na-eme ihe.+ 14  Na-emenụ ihe niile n’atamughị ntamu,+ n’arụghịkwa ụka,+ 15  ka unu wee bụrụ ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta+ na ndị aka ha dị ọcha, ụmụ+ Chineke ndị na-enweghị mmerụ n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ,+ nke hịgọkwara ahịgọ, bụ́ ndị unu na-enwu n’etiti ha dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa,+ 16  na-ejidesi okwu nke ndụ ike,+ ka m wee nwee ihe ga-eme ka m nwee aṅụrị n’ụbọchị Kraịst,+ na agbaghị m ọsọ n’efu ma ọ bụ rụsie ọrụ ike n’efu.+ 17  Otú o sina dị, ọ bụrụgodị na a na-awụsa m dị ka àjà ihe ọṅụṅụ+ n’elu àjà a na-achụ+ n’ihe metụtara ozi a na-ejere ọha mmadụ, nke okwukwe kpaliri unu ime,+ enwere m obi ụtọ, esokwa m unu niile na-aṅụrị ọṅụ.+ 18  Ma n’otu ụzọ ahụ, unu onwe unu, na-enwekwanụ ọṅụ, sorokwanụ m na-aṅụrị ọṅụ.+ 19  Enwere m olileanya n’ime Onyenwe anyị Jizọs izitere unu Timoti n’oge na-adịghị anya, ka m wee bụrụ mkpụrụ obi nwere obi ụtọ+ mgbe m ga-amata ihe banyere unu. 20  N’ihi na enweghị m onye ọzọ nke nwere ụdị obi o nwere,+ bụ́ onye ihe banyere unu ga-emetụ n’obi n’ezie. 21  N’ihi na ndị ọzọ niile na-achọ ọdịmma nke onwe ha,+ ọ bụghị nke Kraịst Jizọs. 22  Ma unu maara ihe àmà o nyere banyere onwe ya, na dị ka nwata+ ya na nna ya nọ, o so m bụrụ ohu n’ime ka ozi ọma na-aga n’ihu. 23  Ya mere, ọ bụ onye a ka m nwere olileanya izitere unu ozugbo m hụrụ otú ihe si dịrị m. 24  N’ezie, enwere m obi ike n’ime Onyenwe anyị na mụ onwe m ga-abịa n’oge na-adịghị anya.+ 25  Otú ọ dị, echere m na ọ dị mkpa izitere unu Epafrọdaịtọs,+ nwanna m na onye ọrụ ibe m+ na onye agha ibe m,+ ọ bụkwa onye na-ejere unu ozi na onye na-ejere m ozi maka igboro m mkpa m, 26  n’ihi na ọ na-agụsi ya agụụ ike ịhụ unu niile, ọ dakwara mbà n’obi n’ihi na unu nụrụ na ọ dara ọrịa. 27  Ee, n’ezie, ọ dara ọrịa nke na ọ fọrọ nke nta ka ọ nwụọ; ma Chineke meere ya ebere,+ n’eziokwu, ọ bụghị naanị ya, kama o mekwaara mụ onwe m, ka m wee ghara ịnọ n’iru uju ruwe uju ọzọ. 28  Ya mere, ana m ezite ya nnọọ ngwa ngwa, ka unu wee ṅụrịa ọṅụ ọzọ mgbe unu ga-ahụ ya, mụ onwe m ewee ghara iru uju. 29  Ya mere, jirinụ ọṅụ niile nabata ya dị ka unu si anabata+ ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị; na-akwanyerenụ ndị dị otú ahụ ùgwù,+ 30  n’ihi na ọ fọrọ ntakịrị ka ọ nwụọ n’ihi ọrụ Onyenwe anyị, o tinyekwara mkpụrụ obi ya n’ihe ihe ize ndụ,+ ka o wee jeere m ozi unu gaara ejere m ma a sị na unu nọ n’ebe a.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji