Ndị Filipaị 4:1-23

4  N’ihi ya, ụmụnna m m hụrụ n’anya, ndị agụụ ha na-agụsi m ike, ọṅụ m na okpueze m,+ guzosienụ ike+ otú a n’ime Onyenwe anyị, ndị m hụrụ n’anya.  Ana m agba Yuodia na Sintiki ume ka ha nwee otu obi+ n’ime Onyenwe anyị.  Ee, ana m arịọkwa gị, ezigbo onye so m nyara yok,+ ka ị na-enyere ụmụ nwaanyị ndị a aka, bụ́ ndị mụ na ha gbakọrọ mbọ+ ọnụ n’ozi ọma, ha na Klement na ndị ọrụ ibe m ndị ọzọ,+ ndị aha ha+ dị n’akwụkwọ nke ndụ.+  Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ime Onyenwe anyị.+ Aga m asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ!+  Meenụ ka mmadụ niile mara na unu nwere ezi uche.+ Onyenwe anyị nọ nso.+  Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla,+ kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike+ na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ;+  udo+ nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi+ unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.  N’ikpeazụ, ụmụnna m, ihe ọ bụla nke bụ́ eziokwu, ihe ọ bụla nke dị mkpa, ihe ọ bụla nke ziri ezi, ihe ọ bụla nke dị ọcha,+ ihe ọ bụla nke na-akpali ịhụnanya, ihe ọ bụla nke a na-ekwu okwu ọma banyere ya, omume ọma ọ bụla dịnụ na ihe ọ bụla dịnụ nke kwesịrị otuto, na-echebaranụ ihe ndị a echiche.+  Ihe ndị unu mụtara n’aka m, nke unu nabatara, nke unu nụkwara ma hụ n’ebe m nọ, na-emenụ ihe ndị a;+ Chineke nke udo+ ga-anọnyekwara unu. 10  Ana m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ime Onyenwe anyị na unu mesịrị ugbu a malite iche echiche ọzọ banyere m.+ Unu nọ na-eche echiche banyere m, ma unu enwetaghị ohere igosi ya. 11  Ọ bụghị na m na-ekwu banyere ịnọ n’ụkọ, n’ihi na amụtawo m inwe afọ ojuju+ n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya. 12  Amaara m otú e si ebi ndụ mgbe ihe dị ụkọ,+ amaara m otú e si ebi ndụ mgbe ihe dị n’ụba. N’ihe niile nakwa n’ọnọdụ niile, amụtawo m ma otú e si eriju afọ ma otú e si anọ agụụ, ma otú e si enwe ihe n’ụba ma otú e si anọ n’ụkọ.+ 13  N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.+ 14  Otú o sina dị, unu mere nke ọma n’ihi na unu nyeere m aka+ ná mkpagbu m.+ 15  N’eziokwu, unu ndị Filipaị makwaara na mgbe m malitere izisara unu ozi ọma, mgbe m hapụrụ Masedonia, ọ dịghị ọgbakọ ọ bụla mụ na ya kerịtara òkè n’inye ihe na ịnara ihe, ma e wezụga naanị unu;+ 16  n’ihi na, ọbụna mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m ihe ugboro ugboro iji gboo mkpa m. 17  Ọ bụghị na m na-achọsi onyinye ahụ ike,+ kama ihe m na-achọsi ike bụ mkpụrụ+ nke na-eme ka e denyekwuoro unu uru n’ihe ndekọ unu. 18  Otú ọ dị, enwere m ihe niile zuuru m, nweekwa ihe n’ụba. Afọ juru m, ebe ọ bụ na mụ anatawo Epafrọdaịtọs+ ihe unu zitere, nke bụ́ ihe na-esi ìsì ụtọ,+ àjà a na-anara nke ọma,+ nke na-atọ Chineke ụtọ. 19  N’ihi ya, Chineke+ m ga-esi n’aka Kraịst Jizọs nyezuo unu ihe niile na-akpa unu+ dị ka akụ̀+ ya dị ebube si dị. 20  Ka otuto dịrị Chineke bụ́ Nna anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.+ Amen. 21  Keleerenụ+ m onye nsọ ọ bụla ya na Kraịst Jizọs dị n’otu.+ Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekele unu. 22  Ndị nsọ niile, ma karịsịa, ndị ezinụlọ Siza, na-ekele unu.+ 23  Ka obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ dịnyere mmụọ unu na-egosi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji