Ndị Hibru 4:1-16

4  Ya mere, ebe nkwa nke ịbanye n’izu ike+ ya ka fọdụrụ, ka anyị tụọ egwu, ma eleghị anya, otu onye n’ime unu pụrụ iyi onye na-erukwaghị eru ịnata ya.+  N’ihi na e zisaara anyị ozi ọma,+ ọbụna dị ka e zisaara ha;+ ma okwu ahụ a nụrụ abaraghị ha uru,+ n’ihi na ha enweghị ụdị okwukwe+ ahụ ndị nụrụ ya nwere.+  N’ihi na anyị onwe anyị bụ́ ndị nwere okwukwe na-abanye n’izu ike ahụ, dị nnọọ ka o kwuru, sị: “Ya mere, aṅụrụ m iyi+ n’iwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye+ n’izu ike m,’”+ ọ bụ ezie na ọrụ ya gwụsịrị+ malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.+  N’ihi na o kwuru n’otu ebe banyere ụbọchị nke asaa, sị: “Chineke zuru ike n’ụbọchị nke asaa n’ọrụ ya niile,”+  o kwukwara n’ebe a, sị: “Ha agaghị abanye n’izu ike m.”+  Ya mere, ebe a ka nwere ụfọdụ ga-abanye na ya, ndị ahụ e bu ụzọ zisaara ozi ọma+ ahụ abanyeghị na ya n’ihi nnupụisi,+  ọ kara otu ụbọchị akara ọzọ site n’ikwu mgbe ogologo oge dị anya gasịrị n’abụ ọma Devid, sị, “Taa”; dị nnọọ ka e kwuworo, sị: “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya,+ unu akpọchila obi unu.”+  N’ihi na ọ bụrụ na Jọshụa+ dubara ha n’ebe izu ike, Chineke agaraghị emesị kwuo+ banyere ụbọchị ọzọ.  Ya mere, a ka nwere ezumike nke ụbọchị izu ike maka ndị Chineke.+ 10  N’ihi na onye banyere n’izu ike nke Chineke+ ezuruwokwa ike n’ọrụ nke ya,+ dị nnọọ ka Chineke zuru na nke ya. 11  Ya mere, ka anyị gbalịsie ike ịbanye n’izu ike ahụ, ka onye ọ bụla ghara ịdaba n’ụdị nnupụisi ahụ.+ 12  N’ihi na okwu+ Chineke dị ndụ+ ma na-akpa ike,+ dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ+ ọ bụla, ọ na-amabakwa ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi+ na mmụọ,+ ma nkwonkwo ma ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ihe mmadụ bu n’obi.+ 13  Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’anya ya,+ ma ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.+ 14  Ya mere, ebe anyị nwere nnukwu onyeisi nchụàjà nke banyere n’eluigwe,+ ya bụ, Jizọs Ọkpara Chineke,+ ka anyị jidesie nkwusa anyị na-ekwusa banyere ya ike.+ 15  N’ihi na nnukwu onye nchụàjà anyị nwere abụghị onye na-apụghị imere anyị ebere+ n’adịghị ike anyị, kama ọ bụ onye a nwalere n’ụzọ niile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie.+ 16  Ya mere, ka anyị jiri nkwuwa okwu+ bịaruo+ ocheeze nke obiọma na-erughịrị mmadụ nso, ka e wee meere anyị ebere, nwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ n’oge kwesịrị ekwesị mgbe enyemaka dị anyị mkpa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji