Ndị Hibru 7:1-28

7  N’ihi na Melkizedek nke a, eze Selem, bụ́ onye nchụàjà nke Chineke Onye Kasị Elu,+ onye zutere Ebreham ka o si n’igbu ndị eze na-alọta wee gọzie ya,+  onye Ebreham kenyekwara otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile.+ Onye a bu ụzọ bụrụ “Eze nke Ezi Omume,” ma a sụgharịa ya, bụrụkwa eze Selem,+ ya bụ, “Eze Udo.”  Ebe ọ bụ onye na-enweghị nna, onye na-enweghị nne, onye na-enweghị usoro ọmụmụ, bụrụkwa onye na-enweghị ụbọchị ọ malitere+ ma ọ bụ oge ndụ ya gwụrụ, ma ebe e mere ka ọ dị ka Ọkpara Chineke,+ ọ bụ onye nchụàjà mgbe niile.+  Lezienụ otú nwoke a si dị ukwuu, onye Ebreham, bụ́ onyeisi ezinụlọ, nyere otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe ndị kasị mma a kwatara n’agha.+  N’eziokwu, e nyere ụmụ nwoke ndị bụ́ ụmụ Livaị,+ ndị na-anata ọrụ ịbụ ndị nchụàjà iwu ka ha na-anata ndị Izrel,+ ya bụ, ụmụnne ha, otu ụzọ n’ụzọ iri+ dị ka Iwu ahụ si dị, ọ bụrụgodị na ndị a sitere n’úkwù Ebreham;+  ma nwoke ahụ nke na-esiteghị n’usoro ọmụmụ+ ha naara Ebreham otu ụzọ n’ụzọ iri+ ma gọzie onye ahụ e kwere ihe ndị ahụ ná nkwa.+  Ma ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na onye ka ukwuu+ gọziri onye nke nta.  N’otu aka, ọ bụ ụmụ mmadụ ndị na-anwụ anwụ na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri,+ ma n’aka nke ọzọ, ọ bụ onye a na-agba àmà na ọ dị ndụ.+  Ọ bụrụ na m pụrụ iji okwu a mee ihe, ọbụna Livaị bụ́ onye na-anata otu ụzọ n’ụzọ iri si n’aka Ebreham kwụọ otu ụzọ n’ụzọ iri, 10  n’ihi na ọ ka nọ n’úkwù+ nna nna ya mgbe Melkizedek zutere ya.+ 11  Ọ bụrụ n’ezie na izu okè+ sitere n’ọrụ nchụàjà+ nke ụmụ Livaị na-arụ, (n’ihi na o so n’Iwu+ ahụ e nyere ndị Izrel) ọ̀ ka ga-adị mkpa+ ka onye nchụàjà ọzọ bilite, bụ́ onye e kwuru na ọ dị ka Melkizedek,+ ọ bụghị dị ka Erọn? 12  N’ihi na ebe a na-agbanwe ọrụ nchụàjà,+ ọ dị mkpa na a ga-agbanwekwa iwu ahụ.+ 13  N’ihi na nwoke ahụ a na-ekwu ihe ndị a banyere ya si n’ebo ọzọ,+ bụ́ ebe onye ọ bụla na-esibeghị jee ozi n’ebe ịchụàjà.+ 14  N’ihi na ọ pụtara nnọọ ìhè na Onyenwe anyị sitere na Juda,+ bụ́ ebo nke Mozis na-ekwughị ihe ọ bụla banyere ya n’ihe metụtara ndị nchụàjà. 15  Ọ ka dokwara anya nke ọma karị na n’ụzọ yiri Melkizedek,+ e nwere onye nchụàjà ọzọ nke na-ebilite,+ 16  bụ́ onye ghọworo nke ahụ, ọ bụghị dị ka ihe e nyere n’iwu nke dabeere n’anụ ahụ́+ si dị, kama dị ka ike nke ndụ a na-apụghị ibibi ebibi+ si dị, 17  n’ihi na a gbara àmà banyere ya, sị: “Ị bụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek+ ruo mgbe ebighị ebi.” 18  Ya mere, a na-akagbu iwu ahụ nke bu ụzọ n’ihi adịghị ike ya+ nakwa adịghị irè ya.+ 19  N’ihi na Iwu ahụ emeghị ka ihe ọ bụla zuo okè,+ kama mwebata e webatakwuru olileanya ka mma+ mere ka ihe zuo okè, bụ́ nke anyị si na ya na-abịaru Chineke nso.+ 20  Otú ahụ a na-emeghị ya n’aṅụghị iyi, 21  (n’ihi na e nwere ndị a na-ejighị ịṅụ iyi mee ka ha ghọọ ndị nchụàjà, ma e nwere otu onye nke e ji ịṅụ iyi mee ka ọ ghọọ onye nchụàjà site n’aka Onye ahụ nke kwuru banyere ya, sị: “Jehova aṅụwo iyi+ (ọ gaghịkwa akwa ụta), ‘Ị bụ onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi,’”)+ 22  otú ahụkwa, Jizọs aghọwo onye e nyere dị ka ihe ibé maka ọgbụgba ndụ ka mma.+ 23  Ọtụtụ ndị ghọkwara ndị nchụàjà, onye pụọ ibe ya anọchie,+ n’ihi na ọnwụ gbochiri ha+ ịnọgide na-abụ ya, 24  ma ebe ọ bụ na ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,+ ọ na-abụ onye nchụàjà n’enweghị ndị na-anọchi ya. 25  N’ihi ya, o nwekwara ike ịzọpụta ndị ahụ n’ụzọ zuru ezu bụ́ ndị na-abịaru Chineke nso site na ya, n’ihi na ọ na-adị ndụ mgbe niile ịrịọrọ ha arịrịọ.+ 26  N’ihi na ụdị nnukwu onye nchụàjà a kwesịrị anyị,+ onye na-eguzosi ike n’ihe,+ onye na-adịghị aghụghọ,+ onye a na-emerụghị emerụ,+ onye e kewapụrụ n’ebe ndị mmehie nọ,+ o wee dị elu karịa eluigwe.+ 27  Ọ dịghị ya mkpa, dị ka ọ dị nnukwu ndị nchụàjà ahụ, ịdị na-achụ àjà kwa ụbọchị,+ nke mbụ maka mmehie nke ya,+ mgbe ahụzi maka mmehie nke ndị ya:+ (n’ihi na nke a ka o mere naanị otu ugboro+ mgbe ọ chụrụ onwe ya n’àjà;)+ 28  n’ihi na Iwu ahụ na-ahọpụta ndị ikom nwere adịghị ike+ ka ha bụrụ nnukwu ndị nchụàjà,+ ma ihe ahụ e ji ịṅụ iyi kwuo+ mgbe Iwu ahụ gasịrị họpụtara otu Ọkpara, bụ́ onye a na-eme ka o zuo okè+ ruo mgbe ebighị ebi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji