Ndị Rom 1:1-32
1 Abụ m Pọl, ohu+ Jizọs Kraịst, na onye a kpọrọ+ ịbụ onyeozi,+ onye e doro iche ikwusa ozi ọma nke Chineke,+
2 nke o kwere ná nkwa n’ime Akwụkwọ Nsọ tupu oge ya eruo site n’ọnụ ndị amụma ya,+
3 banyere Ọkpara ya, onye si ná mkpụrụ Devid+ pụta dị ka anụ ahụ́ si dị,+
4 ma bụrụ onye e si n’ike Chineke+ kpọọ Ọkpara Chineke+ dị ka mmụọ+ nke ịdị nsọ si dị, site n’ime ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie+—ee, Jizọs Kraịst Onyenwe anyị,
5 onye anyị si n’aka ya nata obiọma na-erughịrị mmadụ+ na ọrụ ịbụ ndịozi,+ ka ndị mba ọzọ+ niile wee jiri okwukwe rube isi n’ihi aha ya,
6 ndị e si n’etiti ha kpọọkwa unu ka unu bụrụ ndị nke Jizọs Kraịst.
7 Ana m edetara unu akwụkwọ, unu niile ndị nọ na Rom bụ́ ndị Chineke hụrụ n’anya, ndị a kpọrọ+ ịbụ ndị nsọ:+
Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo+ nke si n’aka Chineke bụ́ Nna anyị nakwa n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dịrị unu.+
8 Nke mbụ, ana m enye Chineke m ekele+ site n’aka Jizọs Kraịst banyere unu niile, n’ihi na a na-ekwu banyere okwukwe unu+ n’ụwa dum.
9 N’ihi na Chineke, onye m ji mmụọ m na-ejere ozi dị nsọ site n’izisa ozi ọma banyere Ọkpara ya, bụ onye akaebe+ m banyere otú m si echeta unu mgbe niile n’ekpere m n’akwụsịghị akwụsị,+
10 na-arịọ na ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume ka m nwee ike mechaa bịakwute unu, ma ọ bụrụ uche Chineke.+
11 N’ihi na ọ na-agụsi m agụụ ike ịhụ unu,+ ka m wee nyetụ unu onyinye ime mmụọ,+ ka e wee mee ka unu guzosie ike;
12 ma ọ bụ, kama nke ahụ, ka anyị wee gbarịta ibe anyị ume,+ onye ọ bụla site n’okwukwe nke ibe ya,+ ma nke unu ma nke m.
13 Ma achọrọ m ka unu mara, ụmụnna m,+ na achọrọ m ịbịakwute unu+ ọtụtụ mgbe, ma ruo ugbu a, e gbochiri m ịbịa, ka m wee nwetakwa mkpụrụ+ n’etiti unu, ọbụna dị ka m nwetara n’etiti ndị mba ọzọ ndị ọzọ.
14 Eji m ndị niile ụgwọ, ma ndị Grik ma Ndị Ala Ọzọ, ma ndị maara ihe+ ma ndị na-amaghị ihe:
15 ya mere, ọ na-agụsi m agụụ ike izisakwara unu ozi ọma+ n’ebe ahụ na Rom.+
16 N’ihi na ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m;+ n’eziokwu, ọ bụ ike Chineke+ maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe,+ ibu ụzọ zọpụta ndị Juu,+ tinyere ndị Grik;+
17 n’ihi na ọ bụ na ya ka a na-ekpughe ezi omume nke Chineke+ n’ihi okwukwe+ mmadụ nwere, nke na-eme ka o nwekwuo okwukwe, dị nnọọ ka e dere, sị: “Ma onye ezi omume ga-esi n’okwukwe dị ndụ.”+
18 N’ihi na e si n’eluigwe na-ekpughe ọnụma Chineke+ megide asọpụrụghị Chineke na ajọ omume+ niile nke ndị na-ekpuchi eziokwu+ ahụ n’ụzọ na-ezighị ezi,+
19 n’ihi na ihe a pụrụ ịmara banyere Chineke pụtara ìhè n’etiti ha,+ n’ihi na Chineke mere ka ọ pụtara ha ìhè.+
20 N’ihi na àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya+ ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu,+ n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke,+ ya bụ, ike ebighị ebi ya+ na ịbụ Chineke ya,+ nke mere na ha enweghị ihe ngọpụ;+
21 n’ihi na, ọ bụ ezie na ha maara Chineke, ha enyeghị ya otuto dị ka Chineke, ha ekeleghịkwa ya,+ kama ha ghọrọ ndị na-enweghị nghọta,+ obi ha nke na-amaghị ihe gbakwara ọchịchịrị.+
22 Ọ bụ ezie na ha na-ekwusi ike na ha maara ihe, ha ghọrọ ndị nzuzu+
23 wee gbanwee ebube+ nke Chineke onye na-apụghị ire ure ka ọ bụrụ ihe yiri onyinyo+ nke mmadụ pụrụ ire ure na nke nnụnụ na anụ ndị nwere ụkwụ anọ na ihe ndị na-akpụ akpụ.+
24 Ya mere, Chineke nyefere ha n’aka adịghị ọcha+ dị ka ọchịchọ obi ha si dị, ka ha wee mee ka ahụ́+ ha ghara inwe nsọpụrụ n’etiti onwe ha,+
25 ya bụ, ndị ahụ ji eziokwu+ nke Chineke gbanwere okwu ụgha,+ na-efe ihe e kere eke, na-ejekwara ya ozi dị nsọ kama ijere Onye ahụ nke kere ihe, bụ́ onye a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi. Amen.
26 Ọ bụ ya mere Chineke ji nyefee ha n’aka agụụ mmekọahụ+ na-eme ihere, n’ihi na ụmụ nwaanyị ha hapụrụ mmekọahụ nwoke na nwaanyị wee na-enwe mmekọahụ nwaanyị na nwaanyị;+
27 otú ahụkwa ka ọbụna ụmụ nwoke hapụrụ mmekọahụ nwoke na nwaanyị,+ ahụ́ wee na-ere ha ọkụ ka ha na ibe ha na-enwe mmekọahụ, ụmụ nwoke na ụmụ nwoke,+ na-eme ihe rụrụ arụ,+ na-enwetakwa n’ime onwe ha ụgwọ ọrụ zuru ezu,+ nke kwesịrị njehie ha.+
28 Ebe ọ bụ na ha achọghị ịmara Chineke dị ka ezi ihe ọmụma si dị,+ Chineke nyefere ha n’aka uche a jụrụ ajụ,+ ka ha wee na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị,+
29 ha jupụtara n’omume na-ezighị ezi niile,+ ajọ omume niile,+ anyaukwu niile,+ ihe ọjọọ niile,+ jupụtakwa n’anyaụfụ,+ igbu ọchụ,+ esemokwu,+ aghụghọ,+ ụfụ obi,+ bụrụ ndị na-akọsa asịrị,+
30 ndị na-ekwu okwu azụ,+ ndị kpọrọ Chineke asị, ndị na-akparị mmadụ,+ ndị mpako,+ ndị na-anya isi,+ ndị na-echepụta ihe ọjọọ,+ ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi,+
31 ndị na-enweghị nghọta,+ ndị na-emebi nkwekọrịta,+ ndị na-enweghị obi mmadụ,+ ndị na-adịghị eme ebere.+
32 Ọ bụ ezie na ndị a maara iwu ezi omume nke Chineke nke ọma,+ na ndị na-eme ihe ndị dị otú a kwesịrị ọnwụ,+ ọ bụghị naanị na ha na-eme ha, kamakwa ha na-ekwenyere+ ndị na-eme ha.