Ndị Rom 10:1-21

10  Ụmụnna m, ezi ọchịchọ obi m na arịrịọ m na-arịọsi Chineke ike maka ha bụ, n’ezie, ka a zọpụta ha.+  N’ihi na ana m agbara ha akaebe na ha na-anụ ọkụ n’obi+ n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị;+  n’ihi na, ebe ha na-amaghị ezi omume Chineke,+ kama na-achọ ime ka ezi omume nke ha guzosie ike,+ ha edoghị onwe ha n’okpuru ezi omume Chineke.+  N’ihi na Kraịst bụ njedebe Iwu ahụ,+ ka onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya wee nwee ezi omume.+  N’ihi na Mozis dere na onye mere ezi omume nke dị n’Iwu ahụ ga-esi na ya dị ndụ.+  Ma Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ezi omume nke okwukwe na-arụpụta, sị: “Ekwula n’obi gị,+ sị, ‘Ònye ga-arịgo n’eluigwe?’+ ya bụ, ịga kpọdata Kraịst;+  ma ọ bụ, ‘Ònye ga-arịda n’abis?’+ ya bụ, ka o si ná ndị nwụrụ anwụ kpọgote Kraịst.”+  Ma gịnị ka ọ na-ekwu? “Okwu ahụ dị gị nso, n’ọnụ gị nakwa n’obi gị”;+ ya bụ, “okwu”+ okwukwe, nke anyị na-ekwusa.+  N’ihi na ọ bụrụ na ị ga-eji ‘ọnụ gị’ kwusaa ‘okwu ahụ’ n’ihu ọha,+ na Jizọs bụ Onyenwe anyị,+ ma na-enwe okwukwe n’obi gị na Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya,+ a ga-azọpụta gị.+ 10  N’ihi na mmadụ na-eji obi+ enwe okwukwe maka ezi omume, ma ọnụ ka mmadụ na-eji eme nkwupụta+ ihu ọha maka nzọpụta. 11  N’ihi na Akwụkwọ Nsọ kwuru, sị: “Ọ dịghị onye nwere+ okwukwe na ya nke a ga-emechu ihu.”+ 12  N’ihi na ọ dịghị ihe dị iche n’etiti onye Juu na onye Grik,+ n’ihi na e nwere otu Onyenwe mmadụ niile, onye na-enye ndị niile na-akpọku ya ihe n’ụba.+ 13  N’ihi na “onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.”+ 14  Otú ọ dị, olee otú ha ga-esi kpọkuo onye ha na-enwebeghị okwukwe n’ebe ọ nọ?+ Oleekwa otú ha ga-esi nwee okwukwe n’ebe onye ha na-anụbeghị banyere ya nọ? Oleekwa otú ha ga-esi anụ ma ọ́ dịghị onye ga-ekwusara ha?+ 15  Oleekwa otú ha ga-esi kwusaa ma ọ bụrụ na e zigaghị ha?+ Dị nnọọ ka e dere, sị: “Lee ka ụkwụ nke ndị na-ezisa ozi ọma nke ihe dị mma si maa mma nke ukwuu!”+ 16  Ka o sina dị, ọ bụghị ha niile rubere isi n’ozi ọma ahụ.+ N’ihi na Aịzaya sịrị: “Jehova, ònye nwere okwukwe n’ihe a nụrụ site n’ọnụ anyị?”+ 17  Ya mere, a na-esi n’ihe a nụrụ enwe okwukwe.+ Ma ihe a nụrụ si n’okwu banyere Kraịst.+ 18  Ka o sina dị, ana m ajụ, sị, Ọ̀ bụ na ha anụghị? N’eziokwu, “ụda ha gazuru ụwa dum,+ okwu ha rukwara na nsọtụ niile nke elu ụwa+ mmadụ bi.” 19  Ka o sina dị, ana m ajụ, sị, Ọ̀ bụ na Izrel amaghị?+ Mozis bu ụzọ sị: “M ga-eji ihe na-abụghị mba kpalie unu ikwo ekworo; m ga-eji mba nzuzu kpasuo unu iwe dị ọkụ.”+ 20  Ma Aịzaya ji nnọọ anyaike kwuo, sị: “Ndị na-adịghị achọ m chọtara m;+ m pụtara ìhè nye ndị na-adịghị ajụ ajụjụ m.”+ 21  Ma o kwuru banyere Izrel, sị: “Ogologo ụbọchị dum, agbasapụworo m ndị na-enupụ isi+ na ndị na-asa okwu aka m.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji