Ndị Rom 11:1-36
11 Ya mere, ana m ajụ, sị, Chineke ọ̀ jụrụ ndị ya?+ Tụfịakwa! N’ihi na mụ onwe m bụ onye Izrel,+ esi m ná mkpụrụ Ebreham, sikwa n’ebo Benjamin.+
2 Chineke ajụghị ndị ya, bụ́ ndị o bu ụzọ mata.+ Leenụ, ọ̀ bụ na unu amaghị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere Ịlaịja, mgbe ọ na-arịọ Chineke arịrịọ ka o mee Izrel ihe?+
3 “Jehova, ha egbuwo ndị amụma gị, ha akwatuwo ebe ịchụàjà gị, ọ fọdụrụ naanị m, ha na-achọkwa mkpụrụ obi m.”+
4 Ma gịnị ka Chineke gwara ya?+ “Emewo m ka puku ndị ikom asaa fọdụ, ya bụ, ndị ikom na-egbubereghị Bel ikpere n’ala.”+
5 Ya mere, n’ụzọ dị otú a, n’oge a kara aka, ndị fọdụrụ+ apụtawokwa dị ka nhọrọ+ e mere n’ihi obiọma na-erughịrị mmadụ si dị.
6 Ma ọ bụrụ na ọ bụ site n’obiọma na-erughịrị mmadụ,+ ọ bụkwaghị n’ihi ọrụ;+ ma ọ́ bụghị otú ahụ, obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ abụkwaghị obiọma na-erughịrị mmadụ.+
7 Ọ̀ bụ ka gịnị mee? Ihe ahụ Izrel na-achọsi ike ka ọ na-enwetaghị,+ ma ndị a họọrọ+ nwetara ya. Ndị ọzọ ghọrọ ndị ihe na-adịkwaghị emetụ n’obi;+
8 dị nnọọ ka e dere, sị: “Chineke enyewo ha mmụọ nke oké ụra,+ nyekwa ha anya ka ha wee ghara ịhụ ụzọ, nyekwa ha ntị ka ha wee ghara ịnụ ihe, ruo taa.”+
9 Devid kwukwara, sị: “Ka tebụl ha ghọọrọ ha ọnyà na igbudu na ihe ịsụ ngọngọ na ụgwọ ihe ọjọọ ha mere;+
10 ka anya ha gbaa ọchịchịrị ka ha wee ghara ịhụ ụzọ, ka azụ ha hurukwa ehuru mgbe niile.”+
11 Ya mere ana m ajụ, sị, Hà sụrụ ngọngọ wee daa+ kpamkpam? Tụfịakwa! Kama site n’ụkwụ ha zọhiere,+ a na-azọpụta ndị mba ọzọ,+ ka e wee kpalie ha ikwo ekworo.+
12 Ma ọ bụrụ na ụkwụ ha zọhiere ghọọrọ ụwa akụ̀, mbelata ha belatara aghọọkwara ndị mba ọzọ akụ̀,+ lee ka ọnụ ọgụgụ ha zuru ezu+ ga-esi bụrụ akụ̀ karị!
13 Ana m agwa unu bụ́ ndị mba ọzọ okwu. Ebe m bụ n’ezie onyeozi+ nke ndị mba ọzọ,+ ana m eme ka ije ozi m+ nwee ùgwù,+
14 ma ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ọ bụla m pụrụ isi kpalie ndị mụ na ha si n’otu anụ ahụ́ ikwo ekworo ma zọpụta+ ụfọdụ n’etiti ha.+
15 N’ihi na ọ bụrụ na ịchụpụ+ ha ga-eme ka ụwa na Chineke dị ná mma,+ gịnị ka ịnabata ha ga-abụ ma ọ́ bụghị isi ná ndị nwụrụ anwụ wee dị ndụ?
16 Ọ bụrụkwa na ihe e weere dị ka mkpụrụ mbụ+ dị nsọ, ntụ ọka ya a gwakọtara agwakọta dịkwa nsọ; ọ bụrụkwa na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ,+ alaka ya dịkwa nsọ.
17 Otú ọ dị, ọ bụrụ na a nyakapụrụ alaka ụfọdụ, ma nyado gị onwe gị n’etiti alaka ndị fọdụrụ,+ ọ bụ ezie na ị bụ oliv ọhịa, i wee ghọọ onye na-eketa òkè n’ọtụtụ ihe ọma+ dị na mgbọrọgwụ oliv ahụ,+
18 anyarala alaka ndị ahụ isi. Ma ọ bụrụ na ị na-anyara ha isi,+ ọ bụghị gị bu mgbọrọgwụ ahụ,+ kama ọ bụ mgbọrọgwụ ahụ bu gị.+
19 Ma, ị ga-asị: “A nyakapụrụ alaka+ dị iche iche ka e wee nyado m.”+
20 Ọ dị mma! A nyakapụrụ ha n’ihi na ha enweghị okwukwe,+ ma ọ bụ okwukwe mere i ji guzoro.+ Kwụsị inwe echiche dị elu,+ kama na-atụ egwu.+
21 N’ihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka ndị ahụ osisi ahụ bu pụta ụwa ebere, ọ gaghị emere gị ebere.+
22 Ya mere, lee obiọma Chineke+ na otú o si emesi mmadụ ike.+ Ọ na-emesi ndị dara ada ike,+ ma obiọma Chineke dị n’ebe ị nọ,+ ma ọ bụrụ na ị nọgide n’obiọma ya; ma ọ́ bụghị otú ahụ, a ga-egbupụkwa gị.+
23 Ọ bụrụ na ha anọgideghị n’enweghị okwukwe ha, a ga-anyadokwa ha;+ n’ihi na Chineke nwere ike ịnyado ha ọzọ.
24 N’ihi na ọ bụrụ na e gbupụrụ gị n’osisi oliv bụ́ nke ọhịa site n’okike ma nyado gị+ n’ụzọ megidere okike n’osisi oliv nke ubi, lee ka ndị a sitere n’okike ga-esi bụrụ ndị a nyadoro karị n’osisi oliv nke ha!+
25 N’ihi na achọghị m ka unu ghara ịma banyere ihe nzuzo a dị nsọ,+ ụmụnna m, ka unu wee ghara ịbụ ndị nwere uche n’anya onwe ha: na ụfọdụ ndị Izrel ghọrọ ndị ihe na-adịkwaghị emetụ n’obi+ ruo mgbe ọnụ ọgụgụ zuru ezu+ nke ndị mba ọzọ batara,+
26 otú a ka a ga-esikwa zọpụta Izrel+ dum. Dị nnọọ ka e dere, sị: “Onye nnapụta ga-esi na Zayọn pụta+ wee mee ka ụmụ Jekọb kwụsị ime omume asọpụrụghị Chineke.+
27 Nke a bụkwa ọgbụgba ndụ mụ na ha ga-agba,+ mgbe m ga-ewepụ mmehie ha.”+
28 N’eziokwu, n’ihe banyere ozi ọma ahụ, ha bụ ndị iro n’ihi unu,+ ma n’ihe banyere nhọrọ nke Chineke na-ahọrọ, ha bụ ndị a hụrụ n’anya n’ihi ndị nna nna ha.+
29 N’ihi na onyinye Chineke na-enye na òkù ọ kpọrọ abụghị ihe ọ ga-akwara ụta.+
30 N’ihi na dị nnọọ ka unu bụbu ndị na-enupụrụ Chineke isi,+ ma e meere unu ebere+ ugbu a n’ihi nnupụisi ha,+
31 otú ahụkwa, ndị a bụ ndị nnupụisi ugbu a, nke mere e ji meere unu ebere,+ ka ha onwe ha wee bụrụ ndị a ga-emekwara ebere ugbu a.
32 N’ihi na Chineke emechibidowo ha niile n’ime nnupụisi,+ ka o wee meere ha niile ebere.+
33 Lee otú ngọzi+ na amamihe+ na ihe ọmụma+ nke Chineke si dị omimi! Lee otú a na-apụghị ịchọpụtacha ikpe ya,+ na otú a na-apụghị ịchọpụtacha ụzọ ya!
34 N’ihi na “ònye maara uche Jehova,+ ma ọ bụ, ònye bụ onye ndụmọdụ ya?”+
35 Ma ọ bụ, “Ònye bu ụzọ nye ya ihe, nke na a ghaghị ịkwụ ya ụgwọ ya?”+
36 N’ihi na ihe niile si n’ebe ọ nọ, sitekwa n’aka ya, dịrịkwa n’ihi ya.+ Ka otuto dịrị ya ruo mgbe ebighị ebi.+ Amen.