Ekliziastis 10:1-20

10  Ọ bụ ijiji nwụrụ anwụ na-eme ka mmanụ otite e siri nke ọma+ siwe ísì ọjọọ, mee ka o mebie. Otú ahụ ka ntakịrị nzuzu na-eme onye a na-asọpụrụ n’ihi amamihe na ùgwù ya.+  Obi onye maara ihe dị ya n’aka nri,+ ma obi onye nzuzu dị ya n’aka ekpe.+  Onye nzuzu enweghị uche n’ụzọ ọ bụla ọ na-eje ije,+ ọ na-agwakwa mmadụ niile na ya dị nzuzu.+  Ọ bụrụ na mmụọ onye na-achị achị adị ọkụ imegide gị, esila n’ebe ị nọ pụọ,+ n’ihi na ịnọ jụụ na-eme ka mmehie nke dị oké njọ belata.+  E nwere ihe ọdachi m hụworo n’okpuru anyanwụ, dị ka mgbe onye na-achị achị+ mehiere ihe:+  E debewo nzuzu n’ọtụtụ ebe dị elu,+ ma ndị ọgaranya na-ebi nnọọ n’ọnọdụ dị ala.  Ahụwo m ka ndị ohu na-agba ịnyịnya ma ndị isi ejiri ụkwụ na-aga dị ka ndị ohu.+  Onye na-egwu olulu ga-adaba kpọmkwem n’ime ya;+ onye na-akwatukwa mgbidi e ji nkume wuo, agwọ ga-ata ya.+  Onye na-awa nkume ga-eji ya merụọ onwe ya ahụ́. Onye na-awa nkụ ga-akpachara anya.+ 10  Ọ bụrụ na ngwá ọrụ e ji ígwè kpụọ anyụọ nkọ ma mmadụ amụghị ya amụ,+ onye ahụ ga na-etinyezi ike ya. Ya mere, itinye amamihe n’ọrụ iji nwee ihe ịga nke ọma bara uru.+ 11  Ọ bụrụ na agwọ ataa mmadụ tupu a raa ya ụrà,+ ọ dịghịzi uru dị n’ịbụ ọkà n’iji ire ara ụrà. 12  Okwu ọnụ onye maara ihe na-eweta ihu ọma,+ ma egbugbere ọnụ onye nzuzu na-eloda ya.+ 13  Okwu mbụ na-esi ya n’ọnụ apụta bụ nzuzu,+ okwu ikpeazụ na-esi ya n’ọnụ apụta bụ ajọ ara ọgbụgba. 14  Onye nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu.+ Mmadụ adịghị ama ihe gaje ime; ònyekwa pụrụ ịkọrọ ya ihe ga-eme mgbe ọ na-anọkwaghị?+ 15  Ọrụ ndị nzuzu na-arụsi ike na-agwụ ha ike,+ n’ihi na ọ dịghị onye n’ime ha maara ụzọ e si aga n’obodo.+ 16  Ala, olee otú ọ ga-adịrị gị mgbe eze gị bụ nwatakịrị,+ ndị isi gị anọrọkwa na-eri ihe ọbụna n’ụtụtụ? 17  Ala, obi ụtọ na-adịrị gị mgbe eze gị bụ nwa ndị a ma ama, ndị isi gị ana-erikwa ihe n’oge kwesịrị ekwesị ka ha wee dị ike, ọ bụghị ka ha ṅụbiga mmanya ókè.+ 18  Oké umengwụ na-eme ka ogidi ụlọ gbajie, ịfanye aka n’ụkwụ na-emekwa ka ụlọ na-ehi mmiri.+ 19  Ihe oriri na-eme ka ndị ọrụ na-achị ọchị, mmanya na-emekwa ka ndụ bụrụ ihe obi ụtọ;+ ma ego na-egbo mkpa niile.+ 20  Akọchala eze+ ọbụna n’ime ụlọ ihi ụra gị, akọchakwala onye ọ bụla bara ọgaranya+ n’ime ime ụlọ gị bụ́ ebe ị na-edina; n’ihi na anụ ufe nke eluigwe ga-eme ka ọ nụ ya, ihe nwere nku ga-akọkwa ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji