Ilu 11:1-31

11  Ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke gbara mkpị e ji aghọgbu mmadụ bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma nkume ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke zuru ezu bụ ihe na-atọ ya ụtọ.  Mpako ọ̀ bịawo? Mgbe ahụ, mmechuihu ga-abịa;+ ma ndị dị obi umeala nwere amamihe.+  Ọ bụ iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ziri ezi na-edu ha,+ ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị na-aghọ aghụghọ ga-ebibi ha.+  Ihe dị oké ọnụ ahịa agaghị aba uru n’ụbọchị oké iwe,+ ma, ọ bụ ezi omume ga-anapụta mmadụ n’ọnwụ.+  Ọ bụ ezi omume nke onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta ga-eme ka ụzọ ya kwụrụ ọtọ,+ ma onye ajọ omume ga-ada n’ihi ajọ omume ya.+  Ọ bụ ezi omume nke ndị ziri ezi ga-anapụta ha,+ ma ihe na-agụsi ndị na-aghọ aghụghọ ike ka a ga-eji jide ha.+  Mgbe onye ajọ omume nwụrụ, olileanya ya na-ala n’iyi;+ ọbụna atụmanya nke dabeere n’ịdị ike alawokwa n’iyi.+  Ọ bụ onye ezi omume ka a na-anapụta ọbụna n’ahụhụ,+ onye ajọ omume na-abatakwa n’ọnọdụ ya.+  Onye si n’ezi ofufe dapụ na-eji ọnụ ya ala mmadụ ibe ya n’iyi,+ ma ihe ọmụma ka a na-eji anapụta ndị ezi omume.+ 10  Obodo na-enwe obi ụtọ n’ihi ịdị mma nke ndị ezi omume,+ ma a na-eti mkpu ọṅụ mgbe ndị ajọ omume lara n’iyi.+ 11  A na-ebuli obodo elu n’ihi ngọzi nke ndị ziri ezi,+ ma a na-etida ya n’ihi ọnụ ndị ajọ omume.+ 12  Onye na-enweghị uche eledawo mmadụ ibe ya anya,+ ma, ọ bụ onye nghọta ya dị ukwuu na-agbachi nkịtị.+ 13  Onye na-ejegharị dị ka onye nkwutọ+ na-ekpughe okwu nzuzo,+ ma onye kwesịrị ntụkwasị obi na mmụọ ya na-ezochi okwu.+ 14  Mgbe a na-enweghị ezi ntụziaka, ndị mmadụ na-ada;+ ma ọtụtụ ndị ndụmọdụ na-eme ka e nwee nzọpụta.+ 15  Ihe agaghị agaziri mmadụ ma ọlị n’ihi na ọ nawo onye ọ na-amaghị n’ibé,+ ma onye kpọrọ ikwe n’aka iji nwee nkwekọrịta asị adịghị enwe nsogbu. 16  Ọ bụ ezi nwaanyị na-enweta nsọpụrụ;+ ma ndị na-achị n’aka ike na-enweta akụnụba. 17  Onye obiọma* na-emeso mkpụrụ obi ya mmeso ọma,+ ma onye obi tara mmiri na-ewetara anụ ahụ́ ya nsogbu.+ 18  Onye ajọ omume na-enweta ụgwọ ọrụ ụgha,+ ma onye na-akụ ezi omume dị ka mkpụrụ na-enweta ụgwọ ọrụ ziri ezi.+ 19  Onye na-akwadosi ezi omume ike ga-enweta ndụ,+ ma onye na-achụso ihe ọjọọ ga-ewetara onwe ya ọnwụ.+ 20  Ndị gbagọrọ agbagọ n’obi bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta n’ụzọ ha na-eme ka o nwee obi ụtọ.+ 21  Ọ bụrụgodị na aka na aka ejikọta, ajọ mmadụ agaghị agbanahụ ntaramahụhụ;+ ma ụmụ ndị ezi omume ga-alanahụ.+ 22  Dị ka ọla imi e ji ọlaedo mee nke dị n’imi ézì, otú ahụ ka nwaanyị mara mma nke na-ajụ inwe ezi uche dị.+ 23  Ihe na-agụ ndị ezi omume dị nnọọ mma;+ olileanya ndị ajọ omume bụ oké iwe.+ 24  E nwere onye na-ekesasị ihe ma ka na-aba ụba;+ e nwekwara onye dị aka ntagide, ma ọ na-akpata naanị ịnọ n’ụkọ.+ 25  Mkpụrụ obi nke na-emesapụ aka ka a ga-eme ka ọ maa abụba,+ onye na-emekwa ka ndị ọzọ ṅụjuo mmiri afọ ka a ga-emekwa ka ọ ṅụjuo mmiri afọ.+ 26  Onye na-ajụ iwepụta ọka*—ọha mmadụ ga-abụ ya ọnụ, ma ngọzi na-adịrị isi onye na-ekwe ka a zụrụ ya.+ 27  Onye na-achọ ihe ọma ga na-achọ amara;+ ma onye na-achọ ihe ọjọọ, ọ ga-abịakwasị ya.+ 28  Onye tụkwasịrị obi n’akụnụba ya—ya onwe ya ga-ada;+ ma ndị ezi omume ga na-ama pokopoko dị ka akwụkwọ ndụ.+ 29  Onye ọ bụla nke na-ekotere ụlọ ya nsogbu,+ ọ ga-ejide ifufe;+ onye nzuzu ga-abụkwa onye na-ejere onye nwere obi amamihe ozi. 30  Mkpụrụ onye ezi omume bụ osisi nke ndụ,+ onye na-erite mkpụrụ obi n’uru maara ihe.+ 31  Lee! Onye ezi omume—n’ụwa ka a ga-akwụ ya ụgwọ,+ ma ya fọdụzie onye ajọ omume na onye mmehie!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ilu 11:17  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”
Ilu 11:26  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.