Ilu 13:1-25

13  Nwa na-abụ onye maara ihe n’ebe e nwere ịdọ aka ná ntị nke nna,+ ma, ọ bụ onye na-akwa emo bụ onye na-adịghị anụ ịba mba.+  Mmadụ ga-eri ihe dị mma nke si n’okwu ọnụ ya,+ ma mkpụrụ obi nke ndị na-aghọ aghụghọ bụ ime ihe ike.+  Onye na-eche ọnụ ya nche na-echebe mkpụrụ obi ya.+ Onye na-agbape ọnụ ekwu okwu—mbibi ga-abụ nke ya.+  Ihe na-agụ onye umengwụ, ma ọ dịghị ihe mkpụrụ obi ya nwere.+ Ma, a ga-eme ka mkpụrụ obi onye dị uchu maa abụba.+  Onye ezi omume kpọrọ okwu ụgha asị,+ ma ndị ajọ omume na-emechu mmadụ ihu, na-emenyekwa onwe ha ihere.+  Ezi omume na-echebe onye na-adịghị eme ihe ọjọọ n’ụzọ ya,+ ma, ọ bụ ajọ omume na-ebibi onye mmehie.+  E nwere onye na-eme ka à ga-asị na ọ bara ọgaranya ma ọ dịghị ihe o nwere ma ọlị;+ e nwere onye na-eme ka à ga-asị na ọ dara ogbenye ma o nwere ọtụtụ ihe dị oké ọnụ ahịa.  Ihe mgbapụta maka mkpụrụ obi mmadụ bụ akụ̀ ya,+ ma onye dara ogbenye adịghị anụ ịba mba.+  Ìhè ndị ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ;+ ma oriọna ndị ajọ omume ga-anyụ.+ 10  Site n’ịdị mpako, naanị ihe mmadụ na-akpata bụ ọgụ,+ ma ndị na-agba izu na-enwe amamihe.+ 11  Ihe dị oké ọnụ ahịa e nwetara n’ihe na-enweghị isi na-adịwanye ole na ole,+ ma, ọ bụ onye ji aka achịkọta ihe na-eme ka ihe mụbaa.+ 12  Ihe a na-atụ anya ya nke e yigharịrị oge ya na-eme ka obi daa ọrịa,+ ma ihe a na-achọsi ike bụ osisi nke ndụ mgbe ọ bịara.+ 13  Onye ledara iwu anya,+ a ga-ejichi ihe o ji gbaa ibé; ma onye na-atụ egwu ihe e nyere n’iwu ka a ga-akwụ ụgwọ.+ 14  Iwu onye maara ihe bụ isi iyi nke ndụ,+ iji mee ka mmadụ zere ọnyà ọnwụ.+ 15  Ezi nghọta na-eweta ihu ọma,+ ma ụzọ ndị na-aghọ aghụghọ adịghị larịị.+ 16  Onye ọ bụla nke maara ihe ga-eji ihe ọmụma mee ihe,+ ma onye nzuzu ga-agbasa nzuzu ya ebe niile.+ 17  Onye ozi nke bụ́ onye ajọ omume ga-adaba n’ihe ọjọọ,+ ma onye ozi nke kwesịrị ntụkwasị obi na-agwọ ọrịa.+ 18  Onye na-eleghara ịdọ aka ná ntị anya na-ada ogbenye, na-enwekwa mmechuihu,+ ma, ọ bụ onye na-anabata ịba mba ka a na-enye otuto.+ 19  Ihe na-agụ mkpụrụ obi agụụ na-atọ ya ụtọ mgbe o nwetara ya;+ ma ịhapụ ihe ọjọọ bụ ihe arụ n’anya ndị nzuzu.+ 20  Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe,+ ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.+ 21  Ọ bụ ndị mmehie ka ọdachi na-achụgharị,+ ma, ọ bụ ndị ezi omume ka a na-eji ihe ọma akwụ ụgwọ.+ 22  Ezi mmadụ ga-ahapụrụ ụmụ ụmụ ya ihe nketa, ma akụ̀ onye mmehie bụ ihe a kpadooro onye ezi omume.+ 23  Ala nke ndị ogbenye kọrọ ihe na-emepụta nri nke ukwuu,+ ma e nwere onye a na-ekpochapụ n’ihi na ikpe ziri ezi adịghị.+ 24  Onye na-adịghị apịa nwa ya ụtarị kpọrọ ya asị,+ ma onye hụrụ ya n’anya na-ahụ na a dọrọ ya aka ná ntị.+ 25  Onye ezi omume na-eri ihe ruo mgbe afọ juru mkpụrụ obi ya,+ ma afọ ndị ajọ omume ga-atọgbọrọ chakoo.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji