Ilu 15:1-33
15 Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa,+ ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.+
2 Ire ndị maara ihe na-eji ihe ọmụma eme ihe ọma,+ ma ọnụ ndị nzuzu na-ekwu ọtụtụ okwu nzuzu.+
3 Anya Jehova dị n’ebe niile,+ na-elegide ndị ọjọọ na ndị ọma.+
4 Ire dị jụụ bụ osisi nke ndụ,+ ma ọ bụrụ na ọ gbagọrọ agbagọ, ọ na-eweta nkụda mmụọ.+
5 Onye ọ bụla nke dị nzuzu na-elelị ịdọ aka ná ntị nna ya,+ ma onye ọ bụla nke ji ịba mba kpọrọ ihe maara ihe.+
6 Ụlọ onye ezi omume jupụtara n’akụ̀,+ ma ihe onye ajọ omume rụpụtara na-ebute nsogbu.+
7 Egbugbere ọnụ ndị maara ihe na-ekesa ihe ọmụma,+ ma obi ndị nzuzu adịghị otú ahụ.+
8 Àjà ndị ajọ omume bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma ekpere ndị ziri ezi bụ ihe na-atọ ya ụtọ.+
9 Ụzọ onye ajọ omume bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma onye na-achụso ezi omume ka ọ hụrụ n’anya.+
10 Ịdọ aka ná ntị bụ ihe ọjọọ n’anya onye na-ahapụ ụzọ;+ onye ọ bụla nke kpọrọ ịba mba asị ga-anwụ.+
11 Shiol na ebe mbibi+ dị n’ihu Jehova,+ ma ya fọdụzie obi ụmụ mmadụ!+
12 Onye na-akwa emo adịghị ahụ onye na-abara ya mba n’anya.+ Ọ gaghị agakwuru ndị maara ihe.+
13 Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ihu dị mma,+ ma a na-enwe ịda mbà na mmụọ n’ihi ihe na-ewute obi.+
14 Ọ bụ obi nke na-aghọta ihe na-achọ ihe ọmụma,+ ma, ọ bụ ọnụ ndị iberiibe na-achụso nzuzu.+
15 Ụbọchị niile nke onye nọ n’ahụhụ jọrọ njọ;+ ma onye obi dị mma na-eri oriri mgbe niile.+
16 Ntakịrị ihe e nwere n’egwu Jehova dị mma+ karịa ihe dị ukwuu e nwere n’ebe ọgba aghara dị.+
17 Nri e ji naanị akwụkwọ nri sie dị mma n’ebe e nwere ịhụnanya+ karịa ehi mara abụba n’ebe e nwere ịkpọasị.+
18 Onye na-ewe oké iwe na-akpasu esemokwu,+ ma onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-eme ka esemokwu dajụọ.+
19 Ụzọ onye umengwụ dị ka ogige e ji osisi ogwu gbaa,+ ma ụzọ ndị ziri ezi bụ ụzọ a wụrụ ájá.+
20 Ọ bụ nwa maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa,+ ma onye nzuzu na-eleda nne ya anya.+
21 Nzuzu bụụrụ onye na-enweghị uche ịṅụrị ọṅụ,+ ma onye nwere nghọta na-eje ije n’ụzọ kwụ ọtọ.+
22 Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu,+ ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.+
23 Mmadụ na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe ọnụ ya zara,+ leekwa nnọọ ka okwu e kwuru n’oge ya si dị mma!+
24 Ụzọ nke ndụ dị n’ebe dị elu n’anya onye ji nghọta eme ihe,+ ka o wee ghara ịbanye na Shiol nke dị n’okpuru.+
25 Ụlọ nke ndị na-ebuli onwe ha elu ka Jehova ga-etida,+ ma ọ ga-eme ka ókè nke ala nwaanyị di ya nwụrụ dịgide.+
26 Atụmatụ onye ọjọọ bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma okwu ọma dị ọcha.+
27 Onye na-eri uru na-ezighị ezi na-ewetara ụlọ ya nsogbu,+ ma onye kpọrọ iri ngo asị ga-adịrị ndụ.+
28 Obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu,+ ma ọnụ ndị ajọ omume na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ.+
29 Jehova nọ ndị ajọ omume n’ebe dị anya,+ ma ekpere ndị ezi omume ka ọ na-anụ.+
30 Ìhè nke anya+ na-eme ka obi ṅụrịa;+ akụkọ+ dị mma na-eme ka ọkpụkpụ maa abụba.+
31 Ntị nke na-anụ ịba mba+ nke ndụ na-anọ kpọmkwem n’etiti ndị maara ihe.+
32 Onye ọ bụla nke na-ezere ịdọ aka ná ntị+ na-ajụ mkpụrụ obi nke ya, ma onye na-aṅa ntị n’ịba mba na-enweta ezi uche.+
33 Ịtụ egwu Jehova bụ ịdọ aka ná ntị nke na-enye amamihe,+ ịdị umeala n’obi na-ebute otuto ụzọ.+