Ilu 31:1-31
31 Nke a bụ okwu Lemuel bụ́ eze, okwu gbara ọkpụrụkpụ+ nke nne ya gwara ya iji gbazie ya:+
2 Gịnị ka m na-ekwu, nwa m, gịnị, nwa nke afọ m,+ ọ̀ bụkwa gịnị, nwa m mụtara n’ihi nkwa m kwere?+
3 Enyela ndị inyom ike gị,+ emekwala ka ụzọ gị gaa n’ihe na-eme ka e kpochapụ ndị eze.+
4 Ndị eze ekwesịghị ịṅụ mmanya, Lemuel, ndị eze ekwesịghị ịṅụ mmanya, ndị isi ekwesịghịkwa ịsị: “Olee ebe ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu dị?”+
5 ka mmadụ ghara ịṅụ mmanya wee chefuo ihe iwu kwuru, gbagọọkwa okwu ikpe nke onye ọ bụla n’ime ndị nọ n’ahụhụ.+
6 Nyenụ onye na-aga ịla n’iyi mmanya na-egbu egbu,+ nyekwanụ ndị ihe na-ewute ná mkpụrụ obi mmanya.+
7 Ka mmadụ ṅụọ mmanya wee chefuo ogbenye ọ dara, ka mmadụ gharakwa icheta nsogbu ya ọzọ.
8 Meghee ọnụ kwuchitere onye ogbi ọnụ ya,+ n’okwu ikpe nke ndị niile na-aga ịnwụ anwụ.+
9 Meghee ọnụ gị, kpee ikpe ziri ezi ma kpechite ọnụ onye nọ n’ahụhụ na ogbenye.+
א [Alef]
10 Ezigbo nwunye, ònye pụrụ ịchọta ya?+ Ọnụ ahịa ya dị nnọọ ukwuu karịa nke nkume kọral.
ב [Bet]
11 Onye nwe ya tụkwasịrị ya obi, ọ dịghịkwa uru kọrọ ya.+
ג [Gimel]
12 O jiriwo ihe ọma kwụọ di ya ụgwọ, ọ bụghị ihe ọjọọ, n’ụbọchị niile nke ndụ ya.+
ד [Dalet]
13 Ọ chọwo ajị anụ na ákwà linin, ọ na-arụkwa ọrụ ọ bụla aka ya nwere mmasị ịrụ.+
ה [Hee]
14 Ọ dị ka ụgbọ mmiri nke onye ahịa.+ Ọ na-esi n’ebe dị anya ebubata ihe oriri ya.
ו [Wọọ]
15 Ọ na-ebilikwa mgbe chi na-abọchabeghị,+ ọ na-enye ezinụlọ ya ihe oriri, na-ekenyekwa ụmụ agbọghọ ya òkè ha.+
ז [Zayin]
16 Ọ gawo leruo ala anya wee zụta ya; o siwo n’ihe aka ya rụpụtara kụọ ubi vaịn.+
ח [Het]
17 O jiriwo ume kee n’úkwù ya, ọ na-emekwa ka ogwe aka ya dị ike.+
ט [Tet]
18 Ọ hụwo na ahịa ọ na-azụ dị mma; oriọna ya adịghị anyụ n’abalị.+
י [Yod]
19 O setịpụwo aka ya were osisi e ji akpa ákwà, aka ya ejidewo mkpịsị e ji akpa ákwà.+
כ [Kaf]
20 Ọ gbasapụworo onye nọ n’ahụhụ ọbụ aka ya, o setịwokwara ogbenye aka ya.+
ל [Lamed]
21 Ọ dịghị atụ egwu na ọ dị ihe oyi ga-eme ezinụlọ ya, n’ihi na ezinụlọ ya dum yi uwe abụọ abụọ.+
מ [Mem]
22 O meworo onwe ya ákwà ihe ndina.+ E ji ákwà linin na ákwà e sijiri odo odo dụọ uwe ya.+
נ [Nun]
23 Onye nwe ya+ bụ onye a ma ama n’ọnụ ụzọ ámá,+ mgbe ya na ndị okenye obodo nọ ọdụ.
ס [Samek]
24 Ọ kwawo uwe ime+ dị iche iche wee ree ha, o nyewokwa ndị ahịa ájị̀.
ע [Ayin]
25 Ike na ịma mma bụ uwe ya,+ ọ na-achịkwa ụbọchị dị n’ihu ọchị.+
פ [Pee]
26 O meghewo ọnụ ya n’amamihe,+ iwu obiọma* dịkwa n’ire ya.+
צ [Sadee]
27 Ọ na-eleru anya n’ihe ndị na-eme n’ezinụlọ ya, ọ naghịkwa eri nri umengwụ.+
ק [Kof]
28 Ụmụ ya ebiliwo kpọọ ya onye obi ụtọ;+ onye nwe ya na-ebili, na-ajakwa ya mma.+
ר [Resh]
29 E nwere ọtụtụ ụmụ nwaanyị+ gosiworo na ha bụ ezigbo ụmụ nwaanyị, ma gị onwe gị karịrị ha niile.+
ש [Shin]
30 Ịma mma pụrụ ịbụ ụgha,+ mma elu ahụ́ pụkwara ịbụ ihe efu;+ ma nwaanyị nke na-atụ egwu Jehova na-enwetara onwe ya otuto.+
ת [Tọọ]
31 Nyenụ ya ihe aka ya rụpụtara,+ ka ọrụ ya jaakwa ya mma ọbụna n’ọnụ ụzọ ámá.+