Ilu 7:1-27
7 Nwa m, debe okwu m+ ma chekwaa ihe m nyere n’iwu n’obi gị.+
2 Debe ihe m nyere n’iwu ka i wee dịrị ndụ,+ debekwa iwu m dị ka nwa anya gị.+
3 Kee ha ná mkpịsị aka gị,+ deekwa ha ná mbadamba nkume nke obi gị.+
4 Gwa amamihe,+ sị: “Ị bụ nwanne m nwaanyị”; kpọọkwa nghọta “Onye ikwu m,”
5 iji chebe gị ka ị ghara ịdaba n’aka nwaanyị na-akwa iko,*+ n’aka nwaanyị na-eme omume rụrụ arụ,* bụ́ onye mere ka okwu ya bụrụ okwu ire ụtọ.+
6 N’ihi na m si na windo na mpio ụlọ m ledata anya,
7 ka m wee hụ ndị na-amaghị ihe.+ Achọrọ m ịmata nwa okorobịa nke na-enweghị uche n’etiti ndị ikom,+
8 ka ọ na-agafe n’okporo ámá n’akụkụ ụlọ nwaanyị ahụ, ọ bụkwa n’ụzọ ụlọ ya ka ọ na-aga,+
9 mgbe chi jiwere, ná mgbede,+ mgbe abalị na ọchịchịrị na-eru nso.
10 Ma, lee! otu nwaanyị bịara izute ya, o yi uwe nwaanyị akwụna,+ aghụghọ dịkwa ya n’obi.
11 Ọ na-eme mkpọtụ, bụrụkwa onye isi ike.+ Ụkwụ adịghị anọ ya n’ụlọ.+
12 Ugbu a, ọ nọ n’èzí, ugbu a, ọ nọ n’ámá,+ ọ bụkwa n’akụkụ ngalaba ụzọ ọ bụla ka ọ na-echechi mmadụ.+
13 Ọ bagidewo ya wee susuo ya ọnụ.+ Ihere apụwo ya n’ihu, o wee malite ịsị ya:
14 “M nwere àjà udo m na-aghaghị ịchụ.+ Taa ka m mezuru ihe m kwere ná nkwa.+
15 Ọ bụ ya mere m ji pụta izute gị, ka m chọọ ihu gị, ka m wee chọta gị.
16 Ejiriwo m ákwà sachie ihe ndina m, ya na ihe ndị tụrụ àgwà, bụ́ ákwà linin Ijipt.+
17 Efesawo m ihe na-esi ísì ụtọ bụ́ mea, alo na sinamọn n’ihe ndina m.
18 Bịa ka anyị ṅụjuo ịhụnanya afọ ruo ụtụtụ; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site n’igosi ịhụnanya.
19 N’ihi na di m anọghị n’ụlọ; ọ gawo njem n’ebe dị anya.+
20 O bu akpa ego gaa. N’ụbọchị ọnwa ga-agbazu ka ọ ga-alọta n’ụlọ ya.”
21 O jiriwo ọtụtụ okwu ya nke na-eru n’obi duhie ya.+ O ji okwu ire ụtọ nke egbugbere ọnụ ya rata ya.+
22 Na mberede, o sooro ya na-aga,+ dị ka oké ehi nke na-aga n’ebe a ga-egbu ya, dịkwa ka à ga-asị na e kere ya agbụ iji dọọ ya aka ná ntị a na-adọ onye nzuzu,
23 ruo mgbe akụ́ ga-agbapu imeju ya,+ dị nnọọ ka nnụnụ si eji ọsọ efeba n’ọnyà,+ ọ maghịkwa na o metụtara mkpụrụ obi ya.+
24 Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị, ṅaakwanụ ntị n’ihe ọnụ m na-ekwu.+
25 Ka obi gị ghara ịtụgharị gaa n’ụzọ ya. Akpafula wee banye n’okporo ụzọ ya.+
26 N’ihi na o mewo ka ọtụtụ ndị nwụọ,+ ndị niile ọ na-egbu dịkwa ọtụtụ.+
27 Ụlọ ya bụ ụzọ e si aga Shiol;+ ụzọ ahụ gbadara ruo n’ime ime ọnụ ụlọ ọnwụ.+