Jems 1:1-27

1  Jems,+ ohu+ Chineke na ohu Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, na-edetara ebo iri na abụọ+ ahụ bi n’ebe dị iche iche+ akwụkwọ: Ana m ekele unu!  Gụọnụ ya n’ihe ọṅụ, ụmụnna m, mgbe unu zutere ọnwụnwa dị iche iche,+  ebe unu maara na okwukwe unu nke a nwalere anwale otú a na-arụpụta ntachi obi.+  Ma ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee zuo ezu,+ gbasiekwa ike n’ụzọ niile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.+  Ya mere, ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ,+ ka ọ na-arịọ Chineke,+ n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe, n’akọchaghịkwa ha;+ ọ ga-enye onye ahụ amamihe.+  Ma, ya jiri okwukwe na-arịọ,+ n’enweghị obi abụọ ma ọlị,+ n’ihi na onye nwere obi abụọ dị ka ebili mmiri nke oké osimiri nke ifufe na-akwagharị,+ na-enugharịkwa.  N’eziokwu, ka onye ahụ ghara iche na ya ga-anata ihe ọ bụla n’aka Jehova;+  ọ bụ onye nwere uche abụọ,+ onye na-adịghị akwụsi ike+ n’ụzọ ya niile.  Ma, ka nwanna ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-enwe aṅụrị n’ihi elu e buliri ya,+ 10  ka onye bara ọgaranya+ nweekwa aṅụrị n’ihi ala e wedara ya, n’ihi na ọ ga-ala n’iyi dị ka okooko osisi.+ 11  N’ihi na anyanwụ na-awa wee nwe oké okpomọkụ, meekwa ka ahịhịa ndụ kpọnwụọ, okooko ya na-adapụkwa, mma ọ mara n’ile anya alaakwa n’iyi. Otú ahụkwa ka onye bara ọgaranya ga-akpọnwụ n’ụzọ ndụ ya.+ 12  Obi ụtọ na-adịrị onye na-atachi obi n’ọnwụnwa,+ n’ihi na mgbe a nwapụtara ya, ọ ga-anata okpueze bụ́ ndụ,+ nke Jehova kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya.+ 13  N’oge ọnwụnwa,+ ka onye ọ bụla ghara ịsị: “Ọ bụ Chineke na-anwa m.” N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla. 14  Kama a na-anwa onye ọ bụla mgbe ọchịchọ nke aka ya rapụtara ya wee rafuo ya.+ 15  Mgbe ọchịchọ ahụ tụụrụ ime, ọ na-amụpụta mmehie;+ mgbe e mechara mmehie, ọ na-amụpụta ọnwụ.+ 16  Unu ekwela ka e duhie unu,+ ụmụnna m m hụrụ n’anya. 17  Ezi onyinye+ ọ bụla na onyinye ọ bụla zuru okè si n’elu bịa,+ n’ihi na ọ na-esi n’aka Nna nke ìhè eluigwe abịa,+ ọ dịghị agbanwe agbanwe, ọ dịghị ka onyinyo nke na-atụgharị atụgharị.+ 18  N’ihi uche ya,+ o ji okwu nke eziokwu mụọ anyị,+ ka anyị wee bụrụ ụdị mkpụrụ mbụ+ nke ihe ndị o kere eke. 19  Maranụ nke a, ụmụnna m m hụrụ n’anya. Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa,+ onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa;+ 20  n’ihi na iwe mmadụ adịghị arụpụta ezi omume Chineke.+ 21  N’ihi ya, wepụnụ iru unyi niile na ihe ahụ na-abaghị uru, nke bụ́ ihe ọjọọ,+ jirikwanụ nwayọọ nabata okwu Chineke nke a kụrụ n’ime unu dị ka mkpụrụ,+ nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụ obi unu.+ 22  Ma, bụrụnụ ndị na-eme okwu Chineke,+ unu abụla ndị na-anụ naanị ọnụnụ, ndị ji echiche ụgha na-aghọgbu onwe ha.+ 23  N’ihi na ọ bụrụ na onye ọ bụla bụ onye na-anụ okwu Chineke, ma ọ bụghị onye na-eme ya,+ onye a dị ka onye na-ekiri ihu ya n’enyo. 24  N’ihi na ọ na-ekiri onwe ya, ọ na-apụkwa ma chefuo ụdị mmadụ ọ bụ ozugbo. 25  Ma onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè+ nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ+ n’ime ya eme, n’ihi na ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama ọ bụ onye na-arụ ọrụ ahụ.+ 26  Ọ bụrụ na onye ọ bụla chere na ya na-efe Chineke+ n’ụzọ ziri ezi ma ọ dịghị achịkwa ire ya,+ kama na-aghọgbu obi ya,+ ụdị ofufe onye a na-efe bụ ihe efu.+ 27  Ụdị ofufe nke dị ọcha,+ nke a na-emerụghịkwa emerụ+ n’ụzọ Chineke bụ́ Nna anyị si ele ihe anya bụ: ilekọta ụmụ mgbei+ na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ+ ná mkpagbu ha,+ na mmadụ idebe onwe ya ka ọ ghara inwe ntụpọ+ site n’ụwa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji