Jenesis 15:1-21
15 Mgbe ihe ndị a gasịrị, okwu Jehova ruru Ebram ntị n’ọhụụ,+ sị: “Atụla egwu,+ Ebram. Abụụrụ m gị ọta.+ Ụgwọ ọrụ gị ga-adị nnọọ ukwuu.”+
2 Ebram wee sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, gịnị ka ị ga-enye m, ebe ọ bụ na amụtaghị m nwa, onye ga-eketa ụlọ m bụ Elịiza, onye Damaskọs?”+
3 Ebram kwukwara, sị: “Lee! Ọ dịghị mkpụrụ i nyere m,+ lee! ọ bụkwa nwa+ ụlọ m ga-anọchi m dị ka onye nketa.”
4 Ma, lee! Jehova gwara ya okwu ndị a, sị: “Nwoke a agaghị anọchi gị dị ka onye nketa, kama ọ bụ onye ga-esi n’ahụ́ gị pụta ga-anọchi gị dị ka onye nketa.”+
5 O wee kpọpụta ya n’èzí wee sị: “Biko, lelie anya n’eluigwe gụọ kpakpando ndị a ọnụ, ma ọ bụrụ na i nwere ike ịgụta ha.”+ O wee gaa n’ihu ịsị ya: “Otú a ka mkpụrụ gị ga-adị.”+
6 O wee nwee okwukwe n’ebe Jehova nọ;+ o wee gụọrọ ya nke ahụ dị ka ezi omume.+
7 Ọ gwakwara ya, sị: “Abụ m Jehova, onye kpọpụtara gị n’obodo Ọọ nke ndị Kaldia ka m wee nye gị ala a ka ọ ghọọ nke gị.”+
8 O wee sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, gịnị ka m ga-eji mara na m ga-ewere ya ka ọ ghọọ nke m?”+
9 O wee sị ya: “Wetara m nwa ehi gbara afọ atọ na nne ewu gbara afọ atọ na ebule gbara afọ atọ na nduru na nwa kpalakwukwu.”+
10 O wee weta ihe ndị a ma bọwaa ha abụọ abụọ wee debe akụkụ ha nke ọ bụla ka ha chee ibe ha ihu, ma ọ bọghị nnụnụ ndị ahụ abọ.+
11 Nnụnụ ndị na-eri anụ wee malite ibekwasị n’ozu+ anụ ndị ahụ, ma Ebram nọ na-achụpụ ha.
12 Mgbe nwa oge gasịrị, anyanwụ chọwara ịda, oké ụra wee buru Ebram,+ ma, lee! oké ọchịchịrị na-emenye ụjọ kpuchiri ya.
13 O wee malite ịsị Ebram: “Ka o doo gị anya na mkpụrụ gị ga-abụ ndị mbịarambịa n’ala na-abụghị nke ha,+ ha ga-agbakwara ha ohu, ndị a ga-emekpakwa ha ahụ́ ruo narị afọ anọ.+
14 Ma m ga-ekpe mba ha ga-agbara ohu ikpe,+ e mesịakwa, ha ga-eburu ọtụtụ akụ̀ pụọ.+
15 Ma gị onwe gị, ị ga-agakwuru nna nna gị hà n’udo; a ga-elikwa gị mgbe i meworo ezigbo agadi.+
16 Ma n’ọgbọ nke anọ, ha ga-alọghachi n’ebe a,+ n’ihi na njehie ndị Amọraịt ezubeghị.”+
17 Ugbu a, anyanwụ adawala, oké ọchịchịrị wee gbaa, ma, lee! oké ọkụ na-akwụ anwụrụ na ọwa ọkụ na-enwu enwu gafere n’agbata anụ ndị ahụ.+
18 N’ụbọchị ahụ, Jehova na Ebram gbara ndụ,+ o wee sị: “Ọ bụ mkpụrụ gị ka m ga-enye ala a,+ malite n’osimiri Ijipt ruo n’osimiri ukwu, bụ́ osimiri Yufretis:+
19 ndị Kenaịt+ na ndị Kenizaịt na ndị Kadmọnaịt
20 na ndị Het na ndị Perizaịt+ na ndị Refeyim
21 na ndị Amọraịt na ndị Kenan na ndị Gegash nakwa ndị Jibọs.”