Jenesis 17:1-27
17 Mgbe Ebram gbara afọ iri itoolu na itoolu, Jehova pụtara ìhè n’ihu Ebram wee sị ya:+ “Abụ m Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Jee ije n’ihu m, bụrụkwa onye na-enweghị ntụpọ.+
2 M ga-eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị n’etiti mụ na gị,+ ka m wee mee ka ị mụbaa nnọọ nke ukwuu.”+
3 Ebram wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala,+ Chineke wee gaa n’ihu ịgwa ya, sị:
4 “Ma mụ onwe m, lee! mụ na gị gbara ndụ,+ ị ga-aghọkwa nna nke ìgwè mba dị iche iche.+
5 A gaghịkwa akpọ aha gị Ebram ọzọ, aha gị ga-abụzi Ebreham, n’ihi na m ga-eme ka ị ghọọ nna nke ìgwè mba dị iche iche.
6 M ga-eme ka ị mụọ ọmụmụ nke ukwuu, meekwa ka ị ghọọ mba dị iche iche, ndị eze ga-esikwa n’ahụ́ gị pụta.+
7 “M ga-edebe ọgbụgba ndụ m nke dị n’etiti mụ na gị+ na mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị n’ọgbọ ha niile ka ọ bụrụ ọgbụgba ndụ ruo mgbe a na-akaghị aka,+ ka m wee gosi na m bụ Chineke gị nakwa Chineke nke mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị.+
8 M ga-enyekwa gị na mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị ala dị iche iche i biri dị ka ọbịa,+ bụ́ ala Kenan dum, ka ọ bụrụ ihe onwunwe gị ruo mgbe a na-akaghị aka; m ga-egosikwa na m bụ Chineke ha.”+
9 Chineke wee gwa Ebreham ọzọ, sị: “Ma gị onwe gị, ị ga-edebe ọgbụgba ndụ m, gị na mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị n’ọgbọ ha niile.+
10 Nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke unu ga-edebe, nke ga-adị n’etiti mụ na unu, ọbụna mkpụrụ gị nke ga-anọchi gị:+ A ga-ebi nwoke ọ bụla n’ime unu úgwù.+
11 Unu ga-ebipụkwa apị́ nke dị n’ahụ́ unu, ọ ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọgbụgba ndụ ahụ dị n’etiti mụ na unu.+
12 A ga-ebi nwoke ọ bụla n’ime unu nke ruru ụbọchị asatọ úgwù,+ n’ọgbọ unu niile, onye ọ bụla a mụrụ n’ụlọ gị nakwa onye ọ bụla e ji ego zụta n’aka onye mba ọzọ ọ bụla nke na-esighị ná mkpụrụ gị.
13 A ghaghị ibi nwoke ọ bụla a mụrụ n’ụlọ gị nakwa nwoke ọ bụla e ji ego gị zụta úgwù;+ ọgbụgba ndụ m nke dị n’anụ ahụ́ unu ga-abụ ọgbụgba ndụ nke ga-adịru mgbe a na-akaghị aka.+
14 Nwoke ọ bụla a na-ebighị úgwù, nke a na-ebipụghị apị́ nke ahụ́ ya, a ga-ebipụ ọbụna mkpụrụ obi ahụ n’etiti ndị ya.+ O mebiwo ọgbụgba ndụ m.”
15 Chineke wee gaa n’ihu ịsị Ebreham: “Ma Seraị nwunye gị, akpọzila ya Seraị, n’ihi na aha ya bụzi Sera.+
16 M ga-agọzi ya, m ga-emekwa ka ọ mụọrọ gị nwa nwoke;+ m ga-agọzi ya, ọ ga-aghọkwa mba dị iche iche;+ ọ bụ n’ahụ́ ya ka ndị eze na-achị ndị dị iche iche ga-esikwa pụta.”+
17 Ebreham wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, malite ịchị ọchị ma sị n’obi ya:+ “Nwoke gbara otu narị afọ ọ̀ ga-amụ nwa, Sera kwa, ee, nwaanyị gbara afọ iri itoolu ọ̀ ga-amụ nwa?”+
18 E mesịa, Ebreham gwara ezi Chineke, sị: “A sị nnọọ na Ishmel ga-adị ndụ n’ihu gị!”+
19 Chineke wee sị: “N’ezie, Sera nwunye gị ga-amụrụ gị nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Aịzik.+ Mụ na ya ga-agba ndụ, nke ga-abụrụ mkpụrụ ya nke ga-anọchi ya ọgbụgba ndụ nke ga-adịru mgbe a na-akaghị aka.+
20 Ma anụwo m ihe i kwuru banyere Ishmel. Lee! M ga-agọzi ya, m ga-emekwa ka ọ mụọ ọmụmụ, meekwa ka ọ mụbaa nnọọ nke ukwuu.+ Ọ ga-amụta ndị isi iri na abụọ, m ga-emekwa ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.+
21 Otú ọ dị, mụ na Aịzik,+ bụ́ onye Sera ga-amụrụ gị n’ụdị oge a n’afọ ọzọ,+ ga-agba ndụ.”
22 Chineke na Ebreham wee kwurịtasịa okwu, o wee si n’ebe ọ nọ gbagoo.
23 Ebreham wee kpọrọ Ishmel nwa ya na ndị ikom niile a mụrụ n’ụlọ ya na onye ọ bụla o ji ego ya zụta, nwoke ọ bụla nke so n’ime ndị ikom bi n’ụlọ Ebreham, o wee bipụ apị́ nke dị n’ahụ́ ha kpọmkwem n’ụbọchị a, dị nnọọ ka Chineke gwara ya.+
24 Ebreham gbara afọ iri itoolu na itoolu mgbe o bipụrụ apị́ nke dị n’ahụ́ ya.+
25 Ishmel nwa ya dị afọ iri na atọ mgbe e bipụrụ apị́ nke ahụ́ ya.+
26 Ọ bụ n’ụbọchị a kpọmkwem ka e biri Ebreham úgwù, tinyekwara Ishmel nwa ya.+
27 E wee bie ya na ndị ikom niile bi n’ụlọ ya úgwù, onye ọ bụla a mụrụ n’ụlọ ya nakwa onye ọ bụla o ji ego zụta n’aka onye mba ọzọ.+