Jenesis 20:1-18

20  Ebreham wee si n’ebe ahụ+ kwaga n’ala Negeb wee biri n’agbata Kedesh+ na Shọọ,+ biri dị ka ọbịa na Gira.+  Ebreham wee kwuo ọzọ banyere Sera nwunye ya, sị: “Ọ bụ nwanne m nwaanyị.”+ Abimelek bụ́ eze Gira wee zipụ ozi kpọrọ Sera.+  E mesịa, Chineke bịakwutere Abimelek ná nrọ n’abalị wee sị ya: “Lee, ọ fọrọ nke nta ka ị nwụọ n’ihi nwaanyị ahụ ị kpọọrọ,+ n’ihi na ọ bụ nwunye onye ọzọ.”  Otú ọ dị, Abimelek agabeghị ya nso.+ Ya mere ọ sịrị: “Jehova, ị̀ ga-egbu mba nke na-eme ezi omume?+  Ọ̀ bụ na ọ sịghị m, ‘Ọ bụ nwanne m nwaanyị’? ya onwe ya kwa—ọ̀ bụ na ọ sịghị m, ‘Ọ bụ nwanne m nwoke’? Ọ bụ n’obi ọcha m nakwa n’ịkwụwa aka m ọtọ ka m mere ihe a.”+  Ezi Chineke wee sị ya ná nrọ: “Mụ onwe m amarawokwa na ọ bụ n’obi ọcha gị ka i mere ihe a,+ mụ onwe m nọkwa na-egbochi gị imehie m.+ Ọ bụ ya mere na ekweghị m ka i metụ ya aka.+  Ma ugbu a, kpọghachi nwunye nwoke ahụ, n’ihi na nwoke ahụ bụ onye amụma,+ ọ ga-arịọsikwara gị arịrịọ ike.+ Dịrịkwa ndụ. Ma ọ bụrụ na ị kpọghachighị ya, mara na ị ga-anwụrịrị, gị na ndị gị niile.”+  Abimelek wee bilie n’isi ụtụtụ, kpọọ ndị niile na-ejere ya ozi wee kọọ ihe a niile ná ntị ha. Ha wee tụọ egwu nke ukwuu.  Abimelek wee kpọọ Ebreham ma sị ya: “Gịnị bụ ihe a i mere anyị, gịnị bụ ihe ọjọọ m mere gị, nke mere i ji mee ka mmehie dị ukwuu bịakwasị mụ na alaeze m?+ Ihe a na-ekwesịghị ime eme ka i mere m.”+ 10  Abimelek wee gaa n’ihu ịsị Ebreham: “Gịnị ka i bu n’obi mee ihe a?”+ 11  Ebreham wee sị: “Ọ bụ n’ihi na m kwuru n’obi m, sị, ‘N’ezie, a dịghị atụ egwu Chineke n’ebe a,+ ha ga-egbu m n’ihi nwunye m.’+ 12  E wezụga nke ahụ, ọ bụ nwanne m nwaanyị n’ezie, ada nna m, naanị na ọ bụghị nne m mụrụ ya; o wee ghọọ nwunye m.+ 13  O wee ruo na mgbe Chineke mere ka m si n’ụlọ nna m na-ejegharị,+ asịrị m ya, ‘Nke a bụ obiọma*+ ị ga-egosi m: N’ebe ọ bụla anyị ga-aga ị ga-asị banyere m: “Ọ bụ nwanne m nwoke.”’”+ 14  E mesịa, Abimelek kpụụrụ atụrụ na ehi, kpọrọkwa ndị ikom na-eje ozi na ndị inyom na-eje ozi nye Ebreham ma kpọghachiri ya Sera nwunye ya.+ 15  Abimelek sịkwara: “Lee, ala m dịịrị gị. Biri n’ebe dị mma n’anya gị.”+ 16  O wee sị Sera: “Lee, m na-enye nwanne gị nwoke otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha.+ Ọ ga-abụrụ gị ihe àmà+ n’anya ndị niile gị na ha nọ, nakwa n’ihu onye ọ bụla, na i nweghị nkọcha.” 17  Ebreham wee malite ịrịọsi ezi Chineke arịrịọ ike;+ Chineke wee gwọọ Abimelek na nwunye ya na ndị ohu ya ndị inyom, ha wee malite ịmụ ụmụ. 18  N’ihi na Jehova mechisiri akpa nwa ọ bụla nke ndị ụlọ Abimelek ike n’ihi Sera, nwunye Ebreham.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”