Jenesis 22:1-24

22  O wee ruo mgbe ihe ndị a gasịrị na ezi Chineke lere Ebreham ule.+ O wee kpọọ ya, sị: “Ebreham!” o wee zaa, sị: “Lee m!”+  O wee sị ya: “Biko, kpọrọ nwa gị nwoke, nwa ị mụrụ naanị ya, onye ị hụrụ n’anya nke ukwuu,+ bụ́ Aịzik,+ gaa n’ala Moraya,+ nọrọkwa n’ebe ahụ chụọ ya dị ka àjà nsure ọkụ n’otu n’ime ugwu m ga-akpọrọ gị aha.”  Ebreham wee bilie n’isi ụtụtụ dokwasị ihe e ji anọkwasị n’ịnyịnya ibu ya wee kpọrọ mmadụ abụọ n’ime ndị na-ejere ya ozi, tinyere Aịzik nwa ya;+ ọ wakwara nkụ ọ ga-eji chụọ àjà nsure ọkụ ahụ. O wee bilie gawa n’ebe ahụ ezi Chineke kpọọrọ ya aha.  Ọ bụ n’ụbọchị nke atọ bụ mgbe mbụ Ebreham leliri anya wee nọrọ n’ebe dị anya hụ ebe ahụ.  Ebreham wee sị ndị na-ejere ya ozi:+ “Nọrọnụ n’ebe a, unu na ịnyịnya ibu a, ma mụ na nwa okoro a ga-aga n’ebe ahụ fee ofufe+ ma lọghachikwute unu.”  E mesịa, Ebreham buuru nkụ ọ ga-eji chụọ àjà nsure ọkụ ahụ bo ya Aịzik nwa ya+ ma were ọkụ na mma e ji egbu anụ, ha abụọ wee soro na-aga.+  Aịzik wee malite ịsị Ebreham nna ya: “Nna m!”+ O wee sị: “Lee m, nwa m!”+ O wee gaa n’ihu ịsị: “Lee ọkụ na nkụ, oleekwanụ atụrụ a ga-eji chụọ àjà nsure ọkụ?”+  Ebreham wee sị: “Nwa m, Chineke ga-ewetara onwe ya atụrụ a ga-eji chụọ àjà nsure ọkụ.”+ Ha abụọ wee soro na-aga.  N’ikpeazụ, ha rutere n’ebe ahụ ezi Chineke kpọọrọ ya aha, Ebreham wee wuo ebe ịchụàjà+ n’ebe ahụ ma doo nkụ ahụ n’usoro, keekwa Aịzik ụkwụ na aka tụkwasị ya n’elu ebe ịchụàjà ahụ, n’elu nkụ ahụ.+ 10  Mgbe ahụ, Ebreham matịrị aka were mma ahụ e ji egbu anụ ka o gbuo nwa ya.+ 11  Ma mmụọ ozi Jehova malitere ịkpọ ya òkù site n’eluigwe, sị:+ “Ebreham, Ebreham!” o wee zaa, sị: “Lee m!” 12  O wee gaa n’ihu ịsị: “Esetịla aka gị mee nwa okoro ahụ ihe, emekwala ya ihe ọ bụla ma ọlị,+ n’ihi na ugbu a ka m matara na ị na-atụ egwu Chineke n’ihi na ị jụghị inye m nwa gị nke ị mụrụ naanị ya.”+ 13  Ebreham wee lelie anya, ma, lee, n’ihu ihu, e nwere ebule nke mpi ya konyere n’osisi. Ebreham wee gaa kpụrụ ebule ahụ ma chụọ ya dị ka àjà nsure ọkụ n’ọnọdụ nwa ya nwoke.+ 14  Ebreham wee malite ịkpọ ebe ahụ Jehova-jaịre. Ọ bụ ya mere e ji ekwu taa, sị: “Jehova ga-enye ihe dị mkpa n’ugwu ya.”+ 15  Mmụọ ozi Jehova wee si n’eluigwe kpọọ Ebreham òkù nke ugboro abụọ 16  wee sị: “‘Eji m onwe m na-aṅụ iyi,’ ka Jehova kwuru,+ ‘na ebe ọ bụ na i mewo ihe a, ị jụghịkwa inye m nwa gị nwoke, bụ́ onye ị mụrụ naanị ya,+ 17  aghaghị m ịgọzi gị, aghaghịkwa m ime ka mkpụrụ gị mụbaa dị ka kpakpando nke eluigwe nakwa dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri;+ mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá ndị iro ya.+ 18  Ọ bụkwa site ná mkpụrụ gị+ ka mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha n’ihi na i gewo ntị n’olu m.’”+ 19  E mesịa, Ebreham lọghachikwutere ndị na-ejere ya ozi, ha wee bilie soro lawa Bia-shiba;+ Ebreham wee na-ebi na Bia-shiba. 20  O wee ruo mgbe ihe ndị a gasịrị na ozi ruru Ebreham ntị, sị: “Lee, Milka+ amụwokwara Nehọ+ nwanne gị ụmụ ndị ikom: 21  Ọz ọkpara ya na Bọz+ nwanne ya na Kemuel nna Eram, 22  nakwa Kised na Hezọ na Pildash na Jidlaf na Betuel.”+ 23  Betuel wee mụọ Ribeka.+ Mmadụ asatọ a ka Milka mụụrụ Nehọ nwanne Ebreham. 24  O nwekwara iko nwaanyị, nke aha ya bụ Ruma. Ka oge na-aga, ya onwe ya kwa mụrụ Tiba na Geham na Tehash na Meaka.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji