Jenesis 49:1-33
49 E mesịa, Jekọb kpọrọ ụmụ ya ndị ikom wee sị: “Zukọtanụ ka m gwa unu ihe gaje ime unu ná ngwụsị ụbọchị ndị a.*
2 Zukọtanụ gee ntị, unu ụmụ Jekọb, ee, geenụ Izrel nna unu ntị.+
3 “Ruben, ị bụ ọkpara m,+ ike m na mmalite ike ịmụ ọmụmụ m,+ onye kasị nwee ùgwù na onye kasị dị ike.
4 N’ihi ịbụ onye na-enweghị nchịkwa dị ka mmiri, akarịla ụmụnne gị, n’ihi na ị rịgooro n’ihe ndina nna gị.+ N’oge ahụ, i merụrụ ihe ndina m.+ Ọ rịgooro na ya!
5 “Simiọn na Livaị bụ ụmụnne.+ Ihe e ji eme ihe ike ka ngwá ọgụ ha ji gbuo ndị mmadụ bụ.+
6 Mkpụrụ obi m, abanyela n’òtù ha.+ Obi m, esonyela n’ọgbakọ ha,+ n’ihi na ha ji iwe gbuo ndị ikom,+ ha sekwara ehi akwara otú o si masị ha.
7 Ka iwe ha bụrụ ihe a bụrụ ọnụ,+ n’ihi na ọ jọgburu onwe ya,+ ka oké iwe ha bụrụkwa ihe a bụrụ ọnụ, n’ihi na ọ naghị eme ebere.+ Ka m kesaa ha na Jekọb, ka m meekwa ka ha gbasasịa n’Izrel.
8 “Ma gị onwe gị, Juda,+ ụmụnne gị ga-eto gị.+ Aka gị ga-ejide ndị iro gị n’ekwo.+ Ụmụnna gị ga na-adara gị n’ala.+
9 Juda bụ nwa ọdụm.+ Nwa m, ị ga-esi n’anụ oriri bilie. Ọ makpuuru n’ala, ọ gbatịrị onwe ya dị ka ọdụm, dịkwa ka ọdụm, ònye ga-anwa anwa kpọtee ya?+
10 Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ,+ mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara;+ ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.+
11 Ọ ga-eliwe ịnyịnya ibu ya tojuworo etoju n’osisi vaịn, liwekwa nwa nne ịnyịnya ibu ya n’ezi osisi vaịn wee jiri mmanya saa ákwà ya, jirikwa ọbara mkpụrụ vaịn saa uwe mwụda ya.+
12 Mmanya mere ka anya ya na-acha ọbara ọbara, mmiri ara ehi mekwara ka ezé ya na-acha ọcha.
13 “Zebulọn ga-ebi n’ụsọ oké osimiri,+ ọ ga-anọkwa n’ikpere mmiri n’ọdụ ụgbọ mmiri;+ ebe ime ime ya ga-adị n’ebe gawara Saịdọn.
14 “Ịsaka+ bụ ịnyịnya ibu ọkpụkpụ ya siri ike, nke makpu n’agbata akpa abụọ e kokwasịrị ya.
15 Ọ ga-ahụ na ebe izu ike ahụ dị mma nakwa na ala ahụ dị mma; ọ ga-ehulata ubu ya iburu ibu arọ, ọ ga-arụkwa ọrụ a na-amanye ndị ohu ịrụ.
16 “Dan ga-ekpe ndị ya ikpe dị ka otu n’ime ebo Izrel.+
17 Ka Dan bụrụ agwọ nọ n’akụkụ ụzọ, agwọ nwere mpi nke nọ n’akụkụ ụzọ, nke na-ata ịnyịnya arụ n’ikiri ụkwụ, onye na-agba ya ewee dalaa azụ.+
18 N’ezie, m ga-echere nzọpụta si n’aka gị, Jehova.+
19 “Ma Gad, ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga ga-awakpo ya, ma ọ ga-awakpo azụ azụ ha.
20 “N’Asha ka nri mara abụba ga-esi pụta,+ ọ ga-ewetakwa nri ụtọ nke onye eze.+
21 “Naftalaị+ bụ nne ele dị garagara. Ọ na-ekwu okwu ọma.+
22 “Alaka nke osisi na-amị mkpụrụ,+ Josef bụ alaka nke osisi na-amị mkpụrụ n’akụkụ isi mmiri, nke alaka ya wasara gafee mgbidi.
23 Ma ndị na-agba ụta nọ na-awakpo ya wee gbaa ya ụta ma na-eburu ya iwe n’obi.+
24 Ma ụta ya ga-adịgide adịgide,+ ike aka ya dịkwa nro.+ Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ, bụ́ Nkume Izrel,+ si n’aka Dike nke Jekọb,+ n’ebe ahụ ka o si.
25 O si n’ebe Chineke nke nna gị nọ,+ ọ ga-enyekwara gị aka;+ ya na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nọ,+ ọ ga-eji ngọzi nke eluigwe,+ jiri ngọzi nke ogbu mmiri nke dị n’okpuru ala,+ jirikwa ngọzi nke ara na nke akpa nwa,+ gọzie gị.
26 Ngọzi nke nna gị ga-akarị ngọzi nke ugwu ukwu nke na-adịru mgbe ebighị ebi, karịakwa ihe ịchọ mma nke ugwu nta nke na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Ha ga-adịgide n’isi Josef, ọbụna n’opu isi onye e si n’etiti ụmụnne ya kpọpụ iche.+
27 “Benjamin ga na-adọgbu anụ dị ka anụ ọhịa wolf.+ N’ụtụtụ ka ọ ga-eri anụ o jidere, n’anyasị ka ọ ga-eke ihe ọ kwatara akwata.”+
28 Ndị a niile bụ ebo iri na abụọ nke Izrel, ọ bụkwa ihe a ka nna ha gwara ha mgbe ọ nọ na-agọzi ha. Ọ gọziri onye ọ bụla n’ime ha dị ka ngọzi ya si dị.+
29 E mesịa, o nyere ha iwu wee sị ha: “A gaje ili m dị ka e liri ndị m.+ Lienụ m n’ebe e liri nna m hà n’ọgba dị n’ala Ifrọn onye Het,+
30 n’ọgba dị n’ala Mak-pila nke dị n’ihu Mamri n’ala Kenan, bụ́ ala Ebreham zụrụ Ifrọn onye Het ka ọ bụrụ ebe ọ ga na-eli ozu.+
31 Ọ bụ n’ebe ahụ ka e liri Ebreham na Sera nwunye ya.+ Ọ bụ n’ebe ahụ ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya,+ ọ bụkwa n’ebe ahụ ka m liri Lia.
32 Ọ bụ ụmụ Het ka a zụrụ ala ahụ na ọgba dị na ya.”+
33 Otú a ka Jekọb si nyesịa ụmụ ya ndị ikom iwu. O wee chịkọta ụkwụ ya chịgoro n’ihe ndina ya wee kubie ume, e wee lie ya dị ka e liri ndị ya.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ, “n’oge ikpeazụ.”