Jenesis 7:1-24

7  E mesịa, Jehova sịrị Noa: “Banye n’ụgbọ ahụ, gị na ezinụlọ gị dum,+ n’ihi na ọ bụ gị ka m hụrụ bụ onye ezi omume n’ihu m n’etiti ọgbọ a.+  Chịrị asaa asaa n’ime anụ ọ bụla dị ọcha, oké na nne;+ chịrịkwa naanị abụọ abụọ n’ime anụ ọhịa ọ bụla na-adịghị ọcha, oké na nne;  nakwa anụ ufe nke eluigwe, asaa asaa, oké na nne,+ iji chebe ụmụ ha ndụ n’elu ụwa dum.+  N’ihi na ọ fọrọ naanị ụbọchị asaa ka m mee ka mmiri zoo+ n’elu ụwa ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị;+ m ga-ekpochapụkwa ihe ọ bụla dị ndụ m kere n’elu ala.”+  Noa wee mee ihe niile Jehova nyere ya n’iwu.  Noa dị narị afọ isii mgbe e nwere iju mmiri ahụ n’elu ụwa.+  Noa na ụmụ ya na nwunye ya na ndị nwunye ụmụ ya wee banye n’ụgbọ ahụ tupu iju mmiri ahụ amalite.+  N’ime anụ ọ bụla dị ọcha na anụ ọ bụla na-adịghị ọcha na anụ ufe na ihe ọ bụla ọzọ na-agagharị agagharị n’ala,+  ụmụ anụmanụ gaara abụọ abụọ, oké na nne, bakwuru Noa n’ime ụgbọ ahụ dị nnọọ ka Chineke nyere Noa n’iwu. 10  Mgbe ụbọchị asaa gasịrị, mmiri nke iju mmiri ahụ zoro n’elu ụwa. 11  Na narị afọ nke isii ná ndụ Noa, n’ọnwa nke abụọ, n’abalị iri na asaa n’ọnwa ahụ, n’ụbọchị ahụ, a gbaghere isi iyi niile nke nnukwu ogbu mmiri, e meghekwara ọnụ ụzọ mmiri nke eluigwe.+ 12  Oké mmiri ozuzo wee zoo n’elu ụwa ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.+ 13  N’ụbọchị ahụ, Noa banyere n’ụgbọ ahụ,+ ya na Shem na Ham na Jefet, bụ́ ụmụ Noa,+ na nwunye Noa na ndị nwunye ụmụ ya atọ; 14  ha na anụ ọhịa ọ bụla n’ụdị ya dị iche iche,+ na anụ ụlọ ọ bụla n’ụdị ya dị iche iche, na anụ ọ bụla ọzọ na-agagharị agagharị n’elu ala n’ụdị dị iche iche,+ na anụ ufe ọ bụla n’ụdị dị iche iche,+ nnụnụ ọ bụla, ihe ọ bụla e kere eke nke nwere nku.+ 15  Ha wee na-agakwuru Noa n’ime ụgbọ ahụ, abụọ abụọ, n’ime ụdị anụ ahụ́ ọ bụla nke ike ndụ na-arụ ọrụ n’ime ya.+ 16  Ndị na-abanye abanye wee banye, oké na nne, n’ime ụdị anụ ahụ́ ọ bụla dị nnọọ ka Chineke nyere ya n’iwu. E mesịa, Jehova mechiri ụzọ mgbe ọ banyere.+ 17  Mmiri nke iju mmiri ahụ zogidere n’elu ụwa ruo ụbọchị iri anọ, mmiri ahụ nọkwa na-eto wee malite ibu ụgbọ ahụ, ọ nọkwa na-ese n’elu mmiri n’ụwa. 18  Mmiri ahụ wee dị ukwuu, na-etokwa n’elu ụwa, ma ụgbọ ahụ nọ na-ese n’elu mmiri ahụ.+ 19  Mmiri ahụ wee kpuchie ụwa nke na o tochiri ugwu niile dị elu bụ́ ndị dị n’okpuru eluigwe dum.+ 20  Mmiri ahụ ji kubit iri na ise kpuchie ha, o wee tochie ugwu niile.+ 21  Anụ ahụ́ niile nke na-agagharị n’elu ụwa wee kubie ume,+ ma anụ ufe ma anụ ụlọ ma anụ ọhịa ma ihe niile na-enupụta n’ìgwè bụ́ ndị na-enupụta n’elu ụwa, tinyere ihe niile a kpọrọ mmadụ.+ 22  Ihe ọ bụla ume nke ike ndụ dị n’oghere imi ya, ya bụ, ihe niile dị n’ala akọrọ, nwụrụ.+ 23  O wee si otú a kpochapụ ihe ọ bụla dị ndụ n’elu ala, malite na mmadụ ruo n’anụmanụ, ruo n’anụ na-agagharị agagharị, ruokwa n’anụ ufe nke eluigwe, e kpochapụrụ ha n’ụwa;+ ọ bụ naanị Noa na ndị ya na ha nọ n’ụgbọ lanahụrụ.+ 24  Mmiri ahụ wee kpuchie ụwa ruo otu narị ụbọchị na iri ise.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji