Jenesis 9:1-29
9 Chineke wee gọzie Noa na ụmụ ya wee sị ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa.+
2 Egwu unu na ụjọ unu ga-ejide ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ n’ụwa, tinyere anụ ufe ọ bụla nke eluigwe na ihe ọ bụla na-agagharị agagharị n’ala nakwa azụ̀ niile dị n’oké osimiri. A na-enyefe ha n’aka unu ugbu a.+
3 Anụ ọ bụla na-agagharị agagharị nke dị ndụ pụrụ ịbụrụ unu ihe oriri.+ Dị ka m nyere unu ahịhịa ndụ, m na-enye unu ha niile.+
4 Ma unu erikọtala+ anụ na mkpụrụ obi ya+—ọbara ya.+
5 M ga-ajụkwa ajụjụ ọbara unu bụ́ mkpụrụ obi unu. M ga-ajụta ya n’aka ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ; m ga-ajụtakwa mkpụrụ obi mmadụ+ n’aka mmadụ, n’aka onye ọ bụla nke bụ́ nwanne ya.
6 Onye ọ bụla nke na-awụfu ọbara mmadụ, mmadụ ga-awụfu ọbara ya,+ n’ihi na Chineke kere mmadụ n’oyiyi ya.
7 Ma unu onwe unu, mụọnụ ọmụmụ, baakwanụ ụba, jupụtanụ n’ụwa, baakwanụ ụba n’ime ya.”+
8 Chineke wee gaa n’ihu ịgwa Noa, ya na ụmụ ya, sị:
9 “Ma mụ onwe m, lee, m na-eme ka ọgbụgba ndụ m+ dịrị n’etiti mụ na unu na ụmụ unu ndị ga-anọchi unu,+
10 na mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ nke unu na ya nọ, n’ime anụ ufe, n’ime anụ ụlọ nakwa n’ime ihe niile e kere eke dị ndụ n’ụwa ndị unu na ha nọ, malite ná ndị niile si n’ụgbọ a na-apụta ruo n’ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ n’ụwa.+
11 Ee, m na-eme ka ọgbụgba ndụ m dịrị n’etiti mụ na unu: Iju mmiri agaghị egbu anụ ahụ́ niile ọzọ, a gaghịkwa enwe iju mmiri ọzọ ibibi ụwa.”+
12 Chineke sịkwara: “Nke a bụ ihe ịrịba ama+ nke ọgbụgba ndụ a m na-eme ka ọ dịrị n’etiti mụ na unu nakwa mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ nke unu na ya nọ, n’ọgbọ niile ruo mgbe ebighị ebi.
13 Eke na egwurugwu m+ ka m na-eme ka ọ dịrị n’ígwé ojii, ọ ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọgbụgba ndụ nke dị n’etiti mụ na ụwa.
14 Ọ ga-erukwa na mgbe m mere ka ígwé ojii gbachie ụwa, eke na egwurugwu ga-apụta n’ígwé ojii.
15 M ga-echetakwa ọgbụgba ndụ m+ nke dị n’etiti mụ na unu nakwa mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ n’ime anụ ahụ́ niile;+ mmiri agaghịkwa aghọ iju mmiri ọzọ ibibi anụ ahụ́ niile.+
16 Eke na egwurugwu ga-apụtakwa n’ígwé ojii,+ m ga-ahụkwa ya wee cheta ọgbụgba ndụ a nke ga-adịru mgbe ebighị ebi+ n’etiti Chineke na mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ n’ime anụ ahụ́ niile dị n’elu ụwa.”+
17 Chineke wee gwa Noa ọzọ, sị: “Nke a bụ ihe ịrịba ama nke ọgbụgba ndụ a m na-eme ka ọ dịrị n’etiti mụ na anụ ahụ́ niile nọ n’elu ụwa.”+
18 Ụmụ Noa+ bụ́ ndị si n’ụgbọ ahụ pụta bụ Shem na Ham na Jefet. E mesịa, Ham mụrụ Kenan.+
19 Mmadụ atọ a bụ ụmụ Noa, ọ bụkwa site na ha ka ndị bi n’ụwa si gbasaa ebe niile.+
20 Noa malitere ịrụ ọrụ ubi,+ o wee kọọ ubi vaịn.
21 O wee ṅụwa mmanya ya, o wee gbuwe ya egbu,+ ya mere, ọ gbara onwe ya ọtọ n’ime ụlọikwuu ya.
22 E mesịa, Ham+ nna Kenan hụrụ ọtọ+ nna ya wee gaa kọọrọ ya ụmụnne ya abụọ n’èzí.+
23 Shem na Jefet wee chịrị ákwà mgbokwasị+ wụkwasị ya n’ubu ha abụọ wee jiri azụ banye. Ha wee kpuchie ọtọ nna ha, ka ha chere ihu ha ebe ọzọ, ha ahụghịkwa ọtọ nna ha.+
24 N’ikpeazụ, Noa tetara n’ụra mmanya ya wee mata ihe ọdụdụ nwa ya mere ya.
25 O wee sị:
“Ka Kenan bụrụ onye a bụrụ ọnụ.+
Ka ọ bụụrụ ụmụnne ya ohu nke dị ala karịsịa.”
26 Ọ sịkwara:
“Ka Jehova, bụ́ Chineke Shem, bụrụ onye a gọziri agọzi,+
Ka Kenan bụrụkwa ohu ya.+
27 Ka Chineke nye Jefet ebe sara mbara,
Ka o birikwa n’ụlọikwuu Shem.+
Ka Kenan bụrụkwuo ohu ya.”
28 Noa wee dịrị ndụ ruo narị afọ atọ na iri ise mgbe iju mmiri gasịrị.+
29 Ụbọchị niile Noa dịrị ndụ wee bụrụ narị afọ itoolu na iri ise, o wee nwụọ.+