Job 13:1-28
13 “Lee! Anya m ahụwo ihe a dum,Ntị m anụwo ya ma na-atụle ya.
2 Mụ onwe m makwa nke ọma ihe unu ma;Unu akaghị m.+
3 Otú ọ dị, mụ onwe m ga-agwa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile okwu,+Ọ ga-atọkwa m ụtọ ka mụ na Chineke rụrịta ụka.
4 Ma unu na-aghagide m ụgha;+Unu bụcha ndị dibịa na-abaghị uru.+
5 A sị nnọọ na unu ga-agbachi nkịtị,Ka o wee bụrụ na unu nwere amamihe!+
6 Biko, nụrụnụ ihe m ga-aza,+Ṅaakwanụ ntị n’arịrịọ m ji egbugbere ọnụ m na-arịọ.
7 Ùnu ga-ekwu ihe na-ezighị ezi iji gbachitere Chineke,Ka ùnu ga-ekwu okwu aghụghọ+ iji kwuchitere ya?
8 Ùnu ga-asọ ya anya,+Ka ùnu ga-ekpechitere ezi Chineke ọnụ ya?
9 Ọ̀ ga-adịrị unu mma ma o nyochaa unu?+Ka ùnu ga-eji ya gwurie egwu dị ka mmadụ si eji mmadụ efu egwuri egwu?
10 Ọ ghaghị ịbara unu mba+Ma ọ bụrụ na unu asọọ ya anya na nzuzo;+
11 Ebube ya ọ́ gaghị eme ka unu tụwa ụjọ,Meekwa ka ụjọ ya jide unu?+
12 Okwu ilu unu enweghị isi na ọdụ;*Ọta unu bụ ọta ụrọ.+
13 Derenụ duu n’ihu m, ka m kwuo okwu.Ka ihe ọ bụla ga-adakwasị m dakwasịwa m!
14 Gịnị mere m ji tagide anụ ahụ́ m ezé,Tinyekwa mkpụrụ obi m n’ihe ize ndụ?+
15 Ọ bụrụgodị na ọ ga-egbu m egbu, ḿ gaghị echere?+Ọ bụ naanị na m ga-azara ọnụ m n’ihu ya banyere ụzọ m.
16 Ọ ga-abụkwa nzọpụta m,+N’ihi na ọ dịghị onye si n’ezi ofufe dapụ nke ga-abata n’ihu ya.+
17 Geenụ ntị nke ọma n’ihe m na-ekwu,+Ka ihe m na-ekwu baakwa unu ntị.
18 Lee! Biko, ewetawo m okwu ikpe;+Amaara m nke ọma na m bụ onye ziri ezi.
19 Ònye ga-agbagha ihe m na-ekwu?+N’ihi na ọ bụrụ na mụ agbachie nkịtị, m ga-ekubi ume!
20 Ọ dị ihe abụọ m na-arịọ ka ị ghara ime m;Mgbe ahụ, agaghị m ezo n’ihi gị;+
21 Wepụ aka gị n’ahụ́ m ma mee ka ọ dị anya n’ebe m nọ,Ụjọ gị—ya ejidekwala m.+
22 Kpọọ m ka m za;Ma ọ bụkwanụ ka m kwuo okwu ka ị zaa m.
23 Olee otú m si jehie ma mehie?Mee ka m mara nnupụisi m na mmehie m.
24 Gịnị mere i ji ewepụ ihu gị+Ma na-ewere m dị ka onye iro gị?+
25 Ị̀ ga-eme ka mkpá akwụkwọ nke ifufe na-ebugharị maa jijiji,Ka ị̀ ga na-achụso ahịhịa ọka kpọrọ nkụ?
26 N’ihi na ị nọ na-ede ihe ndị dị ilu megide m,+Ị na-emekwa ka m taa ahụhụ n’ihi ihe m metara n’oge okorobịa.+
27 Ị na-etinyekwa ụkwụ m n’ọtọsị,+Ị na-enyochakwa ụzọ m niile;Ị na-akpakwara ọbụ ụkwụ m ókè.
28 Adị m* dị ka ihe rere ure nke na-emebisị emebisị;+Dị ka uwe nke nla riri.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ ‘bụ ilu ntụ.’
^ Ma ọ bụ, ‘Nwoke a.’ N’asụsụ Hibru, ‘Ọ,’ ya bụ, Job.