Job 19:1-29

19  Job wee zaa, sị:   “Ruo ole mgbe ka unu ga na-akpasu mkpụrụ obi m iwe,+Jirikwa okwu na-egbu mmụọ m?+   Unu abaworo m mba ugboro iri ugbu a;Ihere adịghị eme unu na unu na-emeso m ihe n’obi ọjọọ otú a.+   Ọ bụrụgodị na m mehiere ihe,+Ọ bụ n’isi m ka ihe m mehiere ga-adị.   Ọ bụrụ n’ezie na unu na-ebuli onwe unu elu imegide m,+Na-egosikwa na nkọcha a na-akọcha m kwesịrị ekwesị,+   Marazienụ na ọ bụ Chineke duhiere m,O jiriwokwa ụgbụ ya gbaa m gburugburu.+   Lee! M na-eti, ‘Ihe ọjọọ!’ ma ọ dịghị onye na-aza m;+M na-eti mkpu enyemaka, ma ikpe ziri ezi adịghị.+   O jiriwo nkume rụchie mgbidi n’ụzọ m,+ enweghịkwa m ike ịgafe;Ọ na-emekwa ka ọchịchịrị gbaa n’okporo ụzọ m.+   Ọ napụwo m ebube m,+O kpupụwokwa okpueze m kpu n’isi. 10  Ọ na-adọda m n’akụkụ niile, m wee laa n’iyi;Ọ na-efopụkwa olileanya m dị ka osisi. 11  Ọ na-eweso m iwe dị ọkụ,+Ọ na-ewerekwa m ka onye iro ya. 12  Ndị agha ya agbakọwo aka bịa mee ka ụzọ ha dịrị elu imegide m,+Ha na-agbakwa ụlọikwuu m gburugburu. 13  O mewokwa ka ụmụnne m nọrọ m n’ebe dị anya,+Ndị maara m esiwo ọbụna n’ebe m nọ pụọ. 14  Ọ dịkwaghị ndị mụ na ha na-akpachi anya,+Ndị m maara echefuwokwa m, 15  Bụ́ ndị bi n’ụlọ m dị ka ndị ọbịa;+ ohu m ndị inyom na-ewerekwa m ka onye si esi bịa;Aghọwo m onye ala ọzọ n’anya ha. 16  M na-akpọ onye na-ejere m ozi òkù, ma ọ naghị aza m.Eji m ọnụ m na-arịọ ya ka o nweere m ọmịiko. 17  Ume m na-ekupụta aghọwo ihe nwunye m na-asọ oyi,+Aghọwokwara m ụmụ si n’afọ nne m ihe na-esi ísì ọjọọ. 18  Ụmụaka ajụwokwa m;+M bilie ọtọ, ha na-amalite ikwu okwu megide m. 19  Ndị niile mụ na ha na-akpachi anya na-asọ m oyi,+Ndị m hụrụ n’anya aghọwokwa ndị na-emegide m.+ 20  Abụzi m ọkpụkpụ ọkpụkpụ,+Ejisiri m ike* lanahụ. 21  Ndị enyi m, metụrụnụ m amara, metụrụnụ m amara,+N’ihi na aka Chineke emetụwo m.+ 22  Gịnị mere unu ji na-akpagbu m otú Chineke na-akpagbu m,+Ma ghara inwe afọ ojuju n’ahụ́ m? 23  A sị nnọọ na e dere okwu m ede!A sị nnọọ na e dere ya ede n’akwụkwọ! 24  A sị nnọọ na e ji mkpịsị ígwè+ na pensụl dee ya,Kanye ya n’oké nkume ruo mgbe ebighị ebi! 25  Amaara m nke ọma na onye mgbapụta+ m dị ndụ,Amakwa m na mgbe m nwụsịrị, ọ ga-ebili+ guzoro n’elu ala. 26  Mgbe ha gbasịrị m akpụkpọ, lezienụ otú m dị!N’agbanyeghị na anụ ahụ́ m alawo n’iyi, m ga-ahụ Chineke, 27  Bụ́ onye mụ onwe m ga-ahụ,+Onye anya mụ onwe m ga-ahụ, ọ bụghị onye ọzọ.Akụrụ m adawokwa mbà n’ime m. 28  N’ihi na unu na-asị, ‘Gịnị mere anyị ji na-akpagbu+ ya?’Mgbe ọ bụ mụ onwe m kpatara nsogbu ahụ. 29  Tụọnụ egwu n’ihi mma agha,+N’ihi na njehie na-eweta ọnụma mma agha,Ka unu wee mara na e nwere onyeikpe.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ ‘eji m akpụkpọ ezé m lanahụ.’